chris oyakhilome - read rhapsody of realities - pastor chris · chris oyakhilome rhapsody of...

82

Upload: vunga

Post on 27-Jul-2018

296 views

Category:

Documents


1 download

TRANSCRIPT

Page 1: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo
Page 2: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Chris Oyakhilome

Rhapsody of Realities

...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊN’asụsụ Igbo

Page 3: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

www.rhapsodyofrealities.orgemail: [email protected]

SOUTH AFRICA:303 Pretoria AvenueCnr. Harley and Braam Fischer, Randburg, Gauteng South Africa.Tel.:+27 11 326 0971 +27 62 068 2821Fax.:+27 113260972

USA:Christ Embassy Houston,8623 Hemlock Hill DriveHouston, Texas. 77083 Tel.: +1-281-759-5111; +1-281-759-6218

USA:Believers’ LoveWorld4237 Raleigh Street Charlotte, NC 28213 Tel: +1 980-219-5150

CANADA:Christ Embassy Int’l Office, 50 Weybright Court, Unit 43BToronto, ON MIS 5A8Tel.:+1 647-341-9091

CANADA:600 Clayson Road North York Toronto M9M 2H2 Canada.Tel/Fax:+1-416-746 5080

UNITED KINGDOM: Believers’ LoveWorldUnit C2, Thames View Business Centre, Barlow Way Rainham-Essex, RM13 8BT. Tel.: +44 (0)1708 556 604Fax.: +44(0)2081 816 290

NIGERIA:Christ Embassy Plot 97, Durumi District, Abuja, Nigeria.

LoveWorld Conference CenterKudirat Abiola Way, OregunP.O. Box 13563 Ikeja, LagosTel.: +234-703-000-0927, +234-812-340-6791 +234-812-340-6816, +234-01-462-5700

Rhapsody of Realities N’asusu Igbo …akwụkwọ ofufe nro kwa ụbọchịISSN 1596-6984Ọktoba 2017 editionCopyright © 2017 by LoveWorld Publishing

Okwu a họtara na Baibụl Nsọ sitere na ndenwo Baibụl dị ichiiche, ma a sụgharịrị ha n’asụsụ Igbo Eshiniile.

NKỌWA AHA MKPIRIKPI BAIBỤL E LERE ANYAKJV -King James VersionNKJV -New King James VersionUV - Union Version (Igbo Bible)TLB -The Living BibleGNB - Good News BibleNIV - New International VersionWNT - Weymont New TranslationRSV -Revised Standard VersionTEV -Today’s English VersionTNLT -The New Living TranslationWEB -The World English Bible

MAKA AJỤJỤ MỌỌBỤ ỊZỤTA IHE OZI:

Zerekwa iwu mba ụwa dum chebere nnwere okike. A pụghị isegharị ihe dị n’iru akwụkwọa

mọọbụ idegharị ihe dị nime ya n’ebe ọbụla na n’ụzọ ọbụla wezụga ma a natara nkwado e dere

ede n’aka ndị LoveWorld Publishing.

Page 4: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Okwu Nkọwa

Hurray! Ugbua, ọmarịcha akwụkwọ ofufe-nro gị, Rhapsody of Realities, a dịrịla n’asụsụ 862

dị ichiiche, makwa gụrụ na a gbago. Anyị nwere ntụkwasịobi na ndepụta akwụkwọ ofufe-nroa nke afọ 2017 ga a kwalite uto na mwulite nke ime mmụọ gị, doziekwa gị ọnọdụ maka ihe ịgaziri gị n’ụzọ pụrụ iche ogologo afọa niile. Echiche uche dị ichiiche na a gbanwo ndụ nke dị nime ndepụta nkea ga a tụtegharị gị, nwogharịa gị, kwadookwa gị maka ịhụta ndụ afọ-ojuju, ịmịta ogbe na irite ezigbo uru nime Okwu Chineke.

-ỤZỌ E SI E RITEKARỊCHA URU N’AKWỤKWỌA-

Gụa ihe e dere n’ụbọchị, wetuo obi tụgharịa uche nime ya. Ikpe ekpere kwa ụbọchị na ikwupụtara onwe gị Ihe Nkwupụta ka ntị nụ ha ga e me ka okwu Chineke i na e kwupụta mezue nime ndụ gị.

Gụchaa Baibụl Nsọ nime otu afọ mọọbụ afọ abụọ site n’usoro ọgụgụ nke dị nime akwụkwọa. Họrọ nke masịrị gị - nke otu afọ mọọbụ nke afọ abụọ.

I nwekwara ike ikewa ọgụgụ Baibụl n’ogeụbọchị abụọ - nke ụtụtụ na nke anyasị.

Nime ekpere, were akwụkwọa depụta ebunobi gị kwa ọnwa; tụọ ọganiru gị site n’ịtụ ihe ndị i mejupụtara site n’ọnwa rue n’ọnwa.

Anyị a kpọkue gị ka ị bịa soro ñụrịa, nime ịnọ nso dị ebube nke Chineke na nime mmeri ogologo afọa, mgbe i na a ñụ Okwu Ya dịka ọgwụ kwa ụbọchị. Anyị hụrụ ụnụ niile n’anya! Chukwu gozie ụnụ!

-Pastọ Chris Oyakhilome

Page 5: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Aha

Adres ebe obibi

Nọmba telefon ụlọ Nọmba telefon mkpanaka Adres e-mel Adres ebeọrụ/oziaka MBUNOBI NKE ỌNWAA

NKỌWA BANYERE ONWE GỊ

Page 6: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Rhapsody of Realities

www.rhapsodyofrealities.org

...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊN’asụsụ Igbo

Page 7: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

1Imita Ogbe Na Ọrụ Ọma Mgbe

Dum Mụ onwe m bụ m ezi vaịn ahụ, Nna m bụkwa

onyenlekọta ubi ahụ. Ọ (Nna) na e gbupụ (bepụ, wepụ) ngalaba ọbụla nime M nke a dịghị a mịta ogbe [nke kwụsịrị ịmịta ogbe]; Ọ na e hocha nakwa a kwazi

ngalaba ọbụla nke na a ga n’iru n’ịmịta ogbe, ka O mee ka ọ mịtakwuo ogbe bara ụba zukwara oke karịa

(Jọn 15:1-2 AMP).

Aizaya 32:15 si, “Ruo mgbe e si n’elu wụkwasị anyị Mmụọ ahụ, mgbe ala nke tọgbọrọ n’efu

ghọro ugbo na a mịta ogbe, mgbe a ga a gụnye ugbo na a mịta ogbe dịka okpokoro ọhịa.”E sila n’elu wukwasi anyi Mmụọ ahu. Ugbua o bi obi nime anyi. Ọ dighi mkpa gi ịme ndọli maka ịme nkeọma, ị miputa ogbe mọọbụ ị ruputa ihe. Ndu gi, ozi gi mọọbụ ụlọ gi nwere ike ịdi ka ala nke tọgbọrọ n’efu; o nwere ike ị jighi ego ma oli; ihe ịchọrọ bụ usoro echiche ọhụrụ. Bido na e che ọganihu. Na e che mmuba. Na e che ito eto, ịmiputa nkpuru na ị rụputa ọrụ di mma, nihina ọ bụ ọchichọ Chineke banyere gi.

Nwekwere ike si, “Ma ndu m juputara na mmiputa ogbe; o nweghi ihe ọbụla di m n’ukọ, ihe niile na a gara m nke ọma”; enwere ebubu nke ka nụ: Ugbo gi na a mita ogbe pụrụ ị bu okpokoro ọhia! pụrụ ịruputa kwu ọrụ nime mmụọ gi, na ihe onwunwe gi, ego gi na ọgụgụ akwụkwọ gi etc. pụrụ ịrute kwu ndi mmadu ma jiri oziọma rute ha.

Nkea bụ udiri ndu Chineke chọrọ ka ị bie, ebe ị na a bawanye mgbe niile nime ịba uru, ịmita ogbe na ịrụputa

sọnde

Page 8: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Efesọs 6:10-24

Aịzaya 31-32

Jọn 2:12-25

1 Ndị Ee 6

Ekpere Ezigbo Nna, A na m enwe obi añụri maka ọnụnọ nke mmụọ gi nime ndu m, na amara nke na eme ka ala tọgbọrọ n’efu ghọọ ala na a miputa ogbe, alaa na amiputa ogbe a ghookwa okpokoro ọhia. A na m a miputa ihe mgbe niile n’akuku ndu m ọbula: N’ọrụ m, nime ego m, nime agugu akwukwọ m na nime ozioma. A na m ejeghari na mbuli elu gi mgbe niile, na eme ihe n’enye gi obi utọ mgbe niile, na a miputa ogbe na orụ eziomume, na aha Jịzọs. Amịm

Luk 13:6-9; Jọn 15:16; Jọn 15:4-5

ọrụ ọma nime ihe niile, n’amubawanye n’ọmụma nke onyenwe Anyi (Ndi Kọlọsi 1:10). Jịzọs siri, “Nkea bụ ihe na e buli ebube nke Nna m elu, n’ụnụ na a mịta ogbe hiri nne; ya kwa ka ụnụ ga e ji bụrụ ndị nsonazụ m (Jọn 15:8). Ndu ịmiputa ogbe na ịruputa ihe na enye Chineke ebube. Ọ bụ ọtu nime ihe ngosi niile na Mmụọ Nsọ bi nime anyi. Ọ na ewebata amara nke na emetụta ndu gi ma mee ka ihe too eto, mubanye ma basaa kwa.

Page 9: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

2

Ọtụtụ mgbe, anyi na a si, “okwu ahu na a rụ ọru”; ee ọ na a rụ, ma nke bu eziokwu, okwu ahu na

a rụ ọrụ mgbe ị “rụrụ” ya. Ọ dighi a rụ ọrụ n’onwe ya. Chineke nyere anyi okwu ya ka anyi ji bie ndu. Nke bụ na ịnwere ike kwere n’okwu ahu, hụ okwu ahu n’anya, gụọ uri ma wulie elu, ma ruo mgbe ịtinyere ya n’ọrụ, ọ gaghi a diri gi ire. ga emeririla okwu; ebe ahu ka ngọzi di: “Kama bụrụ nụ ndị na e me okwu ahụ, ọbụghị kwa ndị na a nụ naanị n’ọnụnụ, na e duhie onwe ụnụ” (Jemis 1:25).

Kedu ka ị si eme mọọbu a rụ ọrụ okwu? Ndi Rom 10:10 n’enye anyi echiche usoroa; ọ si, “...Nihina obi ka mmadụ ji e kwere baa n’eziomume; ọnụ kwa ka e ji e me nkwupụta ruo na nzọpụta.” Okwua, “nkwuputa” a bụghi ị gwa mmadu ihe ndi a dighi mma ịmere. Okwua bụ “homologeo’ na Grik nke bụ ịkwu otu ihe ahu na nkwere, ị nakwere ihe Chineke kwuru.

N’ọmumaatu, Baibul si na Ndi Kọrint 11 5:17, “…ọbụrụna mmadụ ọbụla nọ nime Kraịst, ọ bụ ihe okike e kere ọhụrụ,” ị ga ekwuputa ya na nnakwete, “A bụ m okike e kere ọhụrụ.” Ọ bụrụ na ị si, “A maghi m ma a bụ m okike ekere ọhụrụ, ị ga eme ka eziokwu okwua hapu ịdi ire, ọ gaghi a rụ ọrụ na ndu gi. Ọ dighi mmetụta ị ga enwe na ị bụ okike e kere ọhụrụ; okwu Chineke kwụrụ

Na A Rụ Ọrụ Okwu

Nihina obi ka mmadụ ji e kwere baa n’eziomume; ọnụ kwa ka e ji e me nkwupụta ruo na nzọpụta

(Ndi Rom 10:10).

mọnde

Page 10: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Filipaị 1:1-30

Aịzaya 33-34

Jọn 3:1-81 Ndị Ee 7

Ekpere Ezigbo Nna, E kelere m gi maka ịnyere m okwu gi ị ji bie ndu na ị ji ya keputa ndu ebube, na nke mmeri! Enwere m ahuike, a gbasiri m ike, na eme nke ọma; ezinụụlọ m, ọrụ m na ozi m na a basa dika o kwesiri! Amara gi maka mbawanye na mmụba n’abawanye na ndu m kwa ubọchi. Mụ na Kraist na a chi achi na eweta ebube na nkwanyere ugwu nye Onyenwe Anyi, na Aha Jịzọs. Amịm.

2 Ndị Kọrịnt 3:18; Luk 6:46-48; Jemis 1:22-25

otua, nihi ya, kwere ma kwuputa ya. Mgbe ị jiri ọnụ gi kwuputa ya, ọ na e buba gi nime eziokwu nke ozi ya. Ya mere, n’eme nkwuputa dabere n’eziokwu nke Okwu.

Baibul si, “… Onye ahụ nọ nime ụnụ dị uku karịa onye nke nọ nime ụwa” (Jọn 1 4:4).Kwuputa otu ihe ahu, a tụla ujọ. Ndi Hibru 13:5-6 si, “…nihina o kwuola…ka anyi nwee ike kaa obi kwuo si…” Chineke e kwuola ka anyi nwee ike kaa obi kwuo ihe o kwuru. Nkea na a gwa anyi ihe banyere nkwuputa nke okwu. Nkwuputa nke okwu gi bụ oziza gi nye okwu. Nkea bụ uzọ esi a rụ ọrụ okwu ma mee ka ọ miputa ihe na ndu gi.

Page 11: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

3

N’agbanyeghi mkpagbu mọọbu ọnọdu ọbula ịnọ nime ya na ndu, ọ bụ ọchichọ Chineke ka ị

nwee obi ekele mgbe niile. Ọ si nime ihe niile, nye ekele, nihina ọ mara na ọ bụghi maka mmegide gi. Ihe niile na a rụkọta ọrụ maka ihi gi dika akwukwọ nsọ kwụrụ (Ndi Rom 8:28).

Ezigbo Kristianiti bụ ịbị ndu site n’okwukwe nke Okwu Chineke, ebe ịnwere obi ụtọ mgbe niile, na e nye chineke ebube, ọ bụghi banyere ihe ị na a tụ anya na ọ ga e mere gi, kama maka ihe nke o meworo. ga amara na o nweghi ihe ọ na e mebereghi gi. O nyena gi ihe niile ma mee ka ị diri ka ya. Nghọtaa ga e me gi ka ịbụlie ya elu n’ebube ubọchi niile, ebe niile na oge niile.

Mmadu nwere ike jụọ, “E kwesiri m inye ekele maka mmekpa ahu na nsogbu?” Akwụkwọ Nsọ a sighi nye ekele “maka” ọnọdu niile; ọ si nye ekele “nime” ihe niile. N’okwu ọzọ, nye ya ekele n’agbanyeghi ọnọdụ ọ bụ. Ihe ọbụla ọ sọrọ ya mee nime ndu gi mọọbụ gburu gburu, nye Chineke ekele, ebe ịmara na o nyena gi mmeri.

kwesiri ịmara na o kweghi omume na ị ghaghi e rita uru na ndu. Kraist nọ nime gi emeena gi onye mmeri mgbe niile na nine ọnọdu niile. Ya mere, mgbe ọ si gi nye ya ekele nime ihe niile; o kwuru ya n’owuweanya

N’enye Ekele Mgbe Niile

Na nụ e nye ekele nime ihe niile: nihina nkea bụ ọchịchọ Chineke nime Kraịst Jizọs banyere ụnụ

(Ndi Tesalonaika 1 5:18 NIV).

tuuzdee

Page 12: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Filipaị 2:1-18

Aịzaya 35-37

Jọn 3:9-211 Ndị Ee 8

Ekpere Ezigbo Nna, di nnuku amara na ebere. E nye m gi ekele maka ọnọnọ gi na ndu m, na aka uku ngọzi gi nọ n’elu m. A pụghi m ị bụ onye emeriri emeri nihina Kraist bi nime m putara na mmeri mgbe niile, na nime ọnọdu ọbụla. Chineke a gọziri agọzi!

ya. Baibul si, “Ihe ọbụla kwa nke ụnụ na e me mọọbụ n’okwu mọọbụ n’ihe omume, na nụ e me ha niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs, na e nye Chineke na Nna ekele site n’aka ya” (Ndi Kọlọsi 3:17). Usoro ndu nke ịnye ekele n’akpali ngọzi na amara nke Chineke na ndu gi.

Jemis 1:2 si, “Ndị ụmụnna m, gụnye nụ ha niile dịka ihe ọñụ mgbe ụnụ na a daba nime ụdị ọnwụnwa dị ichiiche.” Ọ sighi, “besara Chineke akwa ka ọ zọpụta gi n’aka ọnwunwa niile.” Nkea bụ maka o nweghi ihe ọbụla nọ nime uwaa pụrụ imerili gi. Ihe niile nke nọ, ma nke di ndu ma nke nwụrụ anwu, na a rụkọta ọrụ ọnụ na e merikọta maka mmeri gi. Nkea bụ ihe ị ga eji jụpụta n’ọñụ, n’enye Onywnwe Anyi ekele.

Ọlụ NdịOzi 8:35-39; AbụỌma 107:1; 1 Ndị Kọrịnt 10:13 GNT

Page 13: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

4

Na ndu, a tụkwala ụjọ banyere ndi mmegide mọọbụ ndi nkọcha ọnụ, nihina ha e soghi.

N’eleghi anya n’ọnọdụ ọbụla, nọgide na ị to eto, nọgide na ịnwe mmeri; nọgide na ịga n’ihu. Ihe ọbụla akwụsikwala gi. Ka ike ndi nkọcha n’ebu ibu, ka ike ebube nke ndu gi na a diwanye kwu. O nweghi onye ọbụla ga ele gi anya ma ya bụrụ na ịbụ onye ọdida

Mgbe ndi mmeghari anya mọọbụ ndi na emegide gi na a tụfu oge, ego mọọbụ mgbaghari ndi ọzọ, ịme ka ị lepu anya n’ihe ịna eme,a tụla ujọ. Ọ pụtara na ịna eme mmetụta. Ọ bụrụ na ị legide anya, ị ga na a ga n’ihu, ha na a sọ ngọngọ, nihina “o nweghi ngwa agha ọbụla pụrụ ịdi ire ebe ị nọ” (Aizaya 54:17). Jọn 1 4:4 si, “Ụnụ bụ ihe nke Chineke, ụnụ ụmụ ntakịrị, ụnụ e meriekwala ha: nihina onye ahụ nọ nime ụnụ dị uku karịa onye nke nọ nime ụwa.” Amaokwu mmepe anyi si, “...Ọbụrụna Chineke nọ n’akụkụ nke anyị, onye pụrụ imegide anyị?” (Ndi Rom 8:31).

Devid nwere mkpughe mara mma banyere nkea. ḷ ma na o nwere ọtụtụ ndi iro. Na Abuọma 27:1-2 ọ si, “Onyenwe Anyị bụ ihè m na nzọpụta m; onye ka m ga a tụ ụjọ? Onyenwe Anyị bụ ike nke ndụ m; onye ka m ga a sọrọ anya? Mgbe ndị obi ọjọọ, ọbụna ndị iro m na ndị na e megide m, dakpudoro m ka ha richapụ anụarụ

Nọgide Na Mmeri

Gịnịzi ka anyị ga e kwu n’ihe ndịa? Ọbụrụna Chineke nọ n’akụkụ nke anyị, onye pụrụ imegide anyị?

(Ndi Rom 8:31).

wenezdee

Page 14: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Filipaị 2:19-3:1-11

Aịzaya 38-39

Jọn 3:22-36

1 Ndị Ee 9

Ekpere Ezigbo Nna, ekele diri gi maka ebube gi na ndu m, ọnụnọ gi nime m nke na enye m nkwagide nke ime nkeọma na mmeri ubọchi niile! A na m a gunye ya n’ọñụ ọtụtụ ule na ọnwunwa chere m n’ihu, nihina ha bụ maka mbuli elu m; ha na a rụpụtara m ihe kariri ibu nke ebube ebighiebi, ọ bụla mgbe m na elekwasi gi anya na Aha Jịzọs. Amịm.

m, ha sọrọ ngọngọ ha dakwara.” Onye ọbụla nwere ebe nke ha nime Okwu; nke ndi iro gi bụ “ha sọrọ ngọngọ, ha dakwara.

E mekwana mgbali ọbụla ịmegwara ndi nkọcha gi mọọbụ ndi niile donwere onwe ha dika ndi iro gi; ha nọ na nsogbu Chineke. Ihe ị pụrụ ime bụ ihe Jịzọs kwuru – kpere ha ekpere ma gọzie ha: “Kama a sị m ụnụ, Hụ nụ ndị iro ụnụ n’anya, gọzie nụ ndị na a kpọ ụnụ iyi, na nụ e mere ndị kpọrọ ụnụ asị ihe ọma, nakwa e kpe ekpere maka ndị na e leda ụnụ anya, ndị nakwa a kpagbu ụnụ” (Matiu 5:44).

Na eme mmetụta maka Onyenwe Anyi. Nọgide nime mmeri, Enwena nleba anya na npụta nke nkọcha na ihe ọdachi ọbụla, nihina ha esoghi. Jịzọs siri, “A gwala m ụnụ ihe ndịa ka ụnụ nwee ike nwee udo nime m. Ụnụ ga e nwe nhụju anya dị uku nime ụwa: kama obi sie ụnụ ike; E meriela m ụwa” (Jọn 16:33). Chineke di ebube!

Aịzaya 54:17; Ọlụ NdịOzi 8:35-39

Page 15: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

5Mehepu Mmụọ Gi Nye

Ọmumaihe Ma, n’elu nkea, site n’ịgba mbọ niile, gbagwanye nụ ịdịmma n’okwukwe ụnụ; tụkwasịkwa nụ ọmụmaihe

n’elu ịdịmma (Pita 11 1:5).

Ọmụmaihe na mmepe amaokwu anyi bụ okwu Grik “gnosis,” nke bụ ọmụmaihe nke sayensi

mọọbụ nke ubụrụ isi. Chineke chọrọ ka ịnwee, ọ bụghi naani ọmụmaihe nkpughe, kama kwu ọmụma nke banyere ndu na ihe ndi nkiti nke ọrụ aka na sayenii. Ọ chọrọ ka ịnwee ọmụma nine ihe niile. Ọ chọrọ ka ịnwee ezi ọmuma.

Nkea a bụghi ịnwe mmasi maka akukọ uwa, kama ọ bụ ịme ka ịdikwuo mma, na enweta ezi ozizi nke ga ewuli mmadu ịbụ elu. Nke kachasi mkpa, ọ chọrọ ka ịwulie ọmụma gi banyere Okwu ya. Onye ọbụla nke leghara anya banyere ọmụma na e donwe onwe ya maka ndu ihe ịra ahu. Hosea 4:6 si, “a na a la ndi nke m niyi nihina ha e nweghi ọmụma…” (Hosea 4:6). Ọmuma nke Okwu Chineke bụ ihe n’edonwe gi n’elu na ndu. Tinye ihe inwere na ya.

Nwee Baibul di mma na nkuzi ndi ọzọ na ewuli okwukwe edere n’akwukwọ na nke ịga e ge na nti. Nye onwe gi ohere ịmuta ihe ọhụrụ kwa ubọchi – ihe ga akpali gi ịbu ọkachamma nke ọnwe. Ọbụladi ugbua, ka ị na eme ihe ọmụmụa, ọmụmaihe na a bia; mehepu obi gi ka ịnabata ozizi na ntụziaka nke si na mmụọ a bia.

Imehepu obi gi nye ọmụmaihe a bụghi na ịga a gu ihe

Tọọzdee

Page 16: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Filipaị 3:12-4:1-3

Aịzaya 40-41

Jọn 4:1-91 Ndị Ee 10-11

Nkwuputa Kraist bụ n’onwe ya amamihe na ọmụmaihe, o bikwa nime m. Nihi ya, e nweghi mgbochi ọbụla nye ọmụmaihe m. Site n’itụghariuche, a na m a banye nime ụmi nke mmụọ, na a kpali amamihe na ọmụmaihe nime m, maka ịchọpụta ihe ọhụrụ, na Aha Jịzọs. Amịm.

Ndị Kọlọsi 1:9; Ndị Kọlọsi 2:2-3; 2 Pita 1:2-3

ọbụla ịhuru n’enweghi usoro; mba! N’eziokwu, Baibul gwara anyi na Jịzọs Kraist na onwe ya bụ amamihe na ọmụmaihe (Ndi Kọlọsi 2:3). Ọ bụrụ na ịmehepu obi gi nye ya (Okwu) na ntụghari uche, ọ ga a tụ gi n’anya oke ọmụma ịga enweta. Ọzo, ebe ịnatarala Mmụọ Nsọ, enwere ọdọ ọmụmaihe na amamihe jụrụ nime mmụọ gi, ihe ị puru ime bụ ịkpalite ha site n’itụghari uche. Aleluya!

Page 17: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

6

Baibul siri na Pita 11 1:5-6, “N’elu ọmụmaihe kwa tụkwasị nụ imeru ihe n’oke; n’elu imeru

ihe n’oke kwa ntachịobi; n’elu ntachịobi ndụ iyi Chineke.” Imeru ihe n’oke n’akwukwọ nsọ di n’elu bụ okwu Grik “ekgrateia,” nke bụ ịjigide onwe gi nime. Ọ pụtakwara inwe ọchichi-nke-onwe; ikikere ijigide onwe gi ọbụladi mgbe ndi ọzọ na akpari gi.

Chegodi na ịna akwọ ugbọ gi mgbe onye ọzọ ji ugbọ ya suo nke gi. Kama ọ ga a rio mgbaghara, ya bido mkpari. Gini ka ị ga eme? ga e kwu ya ikwu? Ufọdu nwere ike ịsi na ugbọ ha lọtuo bido iku ọkpọ. Mba! Nkea a dighi mma maka onye Kristian. Ihe ọbụla ọ bụ, jikọlata onwe gi ikwu okwu iwe mọọbụ ilụ ọgụ. O gosighi na imaghi ihe, kama ịna ebi udidi ezi onye ị bụ - ọdidi-Kraist na ndu eze nọ nime gi.

Dika onye Kristian, ị gaghi ebi ndu aghara; ị ga ejikọlata onwe gi ime ihe ọbụla nke ga emebi agwa onye Kristian gi. Kpachapu anya zuo onwe gi nime ime ihe ọbụla n’okè.

Onye ọgba ọsọ na a chọ inweta akara ugo karia nke di bụ nụ, n’ọmụmaatụ, agaghi ebi ndu aghara tutu ya gbaa ọsọ ninina ọ ga emetu ihe omume ya. Onwere ihe ndi ọ

Chia Ọchichi N’elu Mmụọ Gi

Onye ahụ nke a dịghị a chị ọchịchị n’elu mmụọ onwe ya dịka obodo e tidara etida, nke e nweghi kwa mgbidi

ọgba (Ilu 25:28).

fraịdee

Page 18: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Filipaị 4:4-23

Aịzaya 42-43

Jọn 4:10-18

1 Ndị Ee 12

Ekpere Ezi Nna, ekelere m gi maka ọnụnọ nke mmụọ nso nime m. Enwere ọzụzụ ịjikọlata onwe m mgbe ọbụla ọdi mkpa. Enwere m ezi ọzuzu nime ihe niile. Dika onye ozi nke Kraist, a na m egosi ọkachamma na eziomume mgbe dum, na Aha Jịzọs.

ga e di ka ọnụrụ n’udi. Onwere ike onweghi mmasi n’ihe ndi ahu, ma ọga emeriri ha nihina anya ya nọ akara ugo ọ na enweta. Nkea bụ foto Okwu na ekeputara anyi n’igwa anyi ka anyi tụkwasi imeru ihe n’oke n’elu okwukwe anyi.

Ọdighi mma ime ihe ọbụla ịchọrọ ime, jigide onwe gi ike nime. Ọbụrụ ihe ịpụghi ime, Chineke a gaghi asi ka imee ya. jigide onwe gi nọ nime mmụọ gi, a na a kwalite ya mgbe ọbụla mkpa ya di. Onye n‘apughi ichi- onwe ya dika obodo etidara mgbidi ọgba ya, nke onye iro pụrụ imegide oge ọbụla. Adila otua. Gbagidesie onwe gi ike, ndu gi, mmụọ gi, n’aka ndi iro; otu uzọ ị si eme nkea bụ inwe ọchichi nye mmụọ gi: ọchichi-onwe.

Ndị Filipaị 4:5; Ndị Galeshịa 5:22

Page 19: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

7sọtadee

Anyi nwere ndi enyi, ndi umunne na ndi anyi huru n’anya – ndi mmadu anyi na ha na emerikọta,

kwukụọ okwu, kperita ekpere, ndi anyi na enwe ọñụ na mmerikọta anyi na ha. Ebe ọ bụ na ndi enyi anyi mọọbu ndi anyi hụrụ n’anya nwere ike imejọ anyi mọọbụ leghara anyi anya mgbe anyi nọ na mkpa, o nwere otu ONYE n’apụghi ịgbakete gi azu. Ọ naghi a da ada mọọbu gbakete ndi kwere nay a azu, Aha ya bụ Jịzọs! Ihe ịpụrụ ime bụ gi na ya ịnwe mmetụta - di omimi.

Ihe di mma na ya bụ na ịgaghi a cho ya achọ, O bi nime gi site na na Mmụọ Nsọ! Tutu Ya rigoro n’eluigwe, Ọ si “M gaghị a hapụ ụnụ dịka ndị e nweghi nkasiobi: M ga a bịakwute ụnụ” (Jọn 14:18). N’amaokwu 16 na 17 ndi na esota ya, Ọ si, “M gakwa e kpere Nna, ọ gakwa e nye ụnụ Onyenkasi ọzọ, ka o nwee ike binyere ụnụ ruo mgbe ebighebi; Ọbụna Mmụọ nke eziokwu; onye ụwa a pụghị ịnara, nihina ọ dịghị a hụ ya anya, ọ maghị kwa onye ọ bụ: kama ụnụ maara ya; nihina ọ na e binyere ụnụ, ọ gakwa a nọ nime ụnụ.” Nihi ya, taa, anyi na Jịzọs na enwe mmetụta site na inwe mmetụta nke Mmụọ Nsọ na nke Okwu.

Mmụọ Nsọ na ewere ọnọdu nke Jịzọs na a nọghi zi mee ka anyi na ya bụrụ otu. Gi na ya nwere ike ikparita uka, Ọ pụrụ ịgwa kwa gi okwu. Ọ pụrụ ịgwa gi okwu nime

Ọ Gaghi Emenye Gi Ihèrè

… E nwekwara enyị na a tapara nso karịa nwanne (Ilu 18:24).

Page 20: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Kọlọsi 1:1-23

Aịzaya 44-45

Jọn 4:19-29

1 Ndị Ee 13

Ekpere Onyenwe Anyi Jịzọs a gọziri agọzi, ị bụ ndu m, na ihe niile m; ikuku nke ahu m na e ku: onye m huru n’anya na enyi m. Ekele diri gi maka amamihe gi nke na a chi m na amara gi bara uba na m. Okwu gi enwoghariala m, na eme ka m na aga ebe di elu nime uwa. di itụnanya, onye nzọputa di oke ọnụ! Ekele diri gi maka ihunanya na ebere gi n’ebe m nụ. E ji m obi m niile hụ gi n’anya!

ọbụbụ gi, o nwekwara ike ịgwa gi okwu site n’ezi! Ya bụ ezigbo enyi kachasi enyi ịnwere ike inwe, o nwere ikikere na amamihe ị du gi n’uzọ mmeri ubọchi dum.

Ọ ga a ga ogo niile ịnyere gi aka. O gosila ya site n’ọnwu ya n’elu obe. Ọ naghi ama gi ikpe. Kama ọ na ewepu gi na nsogbu n’amaghi gi ikpe, n’agbanyeghi ihe butere ya. Ọ si, “…mụ na ụnụ nọ n’ụzọ niile, ọbụna ruo n’ọgwụgwụ nke ụwa” (Matiu 28:20). Anyi nwere oke enyi nime Ya! A hụrụ m Ya n’anya nke ukuu!

Jọn 14:16-18 AMPC

Page 21: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 22: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

Page 23: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

8

Ndu iyi Chineke na mmepe amaokwu anyi bụ nsọpụrụ nye Chineke. Chineke chọrọ ka anyi

nwee nsọpụrụ na ndu. Ọ chọrọ ka ịji Okwu Chineke wulie nkparama agwa gi. Onwere ufọdu ihe ikwesighi ime, ọ bụghi maka ha jọrọ njọ, kama na ha abụghi ọkachamma. Ọ chọrọ ka ịbụrụ onye eji ama atụ dika ezigbo onye Kristian site n’otu ịsi eme ihe gi dum.

N’agbanyeghi na Kristianiti abụghi maka ngosi a na a hụ anya, na mmepe amaokwu, Pita Onye ozi n’ekwu banyere ihe ndi a na a hụ anya – emume ndi yiri nke Chineke. Ekwesiri inwe ihe ndi di nwayọ nke mmụọ nime ndu gi. Emekwana aghara mọọbụ mee ihe n’echeghi ya eche, ọbụladi na nkparikọta uka mọọbụ nkparama agwa gi nihina mgbe niile, ịno n’ihu Chineke na ndi mmoozi. Ekwukwala okwu ure.

Kpachapu anya kwuo ma mee ihe ndi di mma ọbụladi mgbe o nweghi onye na a hu gi. Nwee nsọpụrụ, ọ bụghi naani mgbe ị biara chọọch. bụ onye nnọchite anya Kraist. Gosi ya nime ihe niile ịna eme na ndu gi.

Cheta na ịbụ ebube, izuoke, mma na eziomume nke Kraist. Nihi ya, donwe onwe gi na ndu gi ka okwesiri: “…bụrụ ihe ọmụmaatụ nke ndị ahụ kwere ekwe, nime okwu, nime ibi obi, nime ọrụ ịhụnanya, nime mmụọ,

Jiri NkwanyeUgwu Nke Chineke Mee EmumeGi Niile

N’elu ọmụmaihe kwa tụkwasị nụ imeru ihe n’oke; n’elu imeru ihe n’oke kwa ntachịobi; n’elu ntachịobi

ndụ iyi Chineke (Pita 11 1:6).

sọnde

Page 24: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Kọlọsi 1:24-2:1-5

Aịzaya 46-47

Jọn 4:30-42

1 Ndị Ee 14

Nkwuputa A bụ m ihe ngosi nke ebube, izuoke, mma na eziomume nke Kraist. A bụ m ihe ọmụmaatu nke onye kwere ekwe, na nkparamagwa, n’okwu, n’ihunanya, n’okwukwe na idi ọcha. A na m egosiputa ọru itụnanya, idimma na izuoke nke Kraist, na Aha Jịzọs. Amịm.

nime okwukwe, na nime ịdị ọcha” (Timoti 1 4:12).

Ọlụ NdịOzi 12:1-2; 1 Timọti 4:7-8; 1 Timọti 6:10-11

Page 25: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

9

Okwu Grik maka ebere nwanne bụ “Philadelphia,” nke pụtara mmekọrita ihunanya nwanne; ịmụta

inye aka - ịnyere nwanne gi nwanyi na nwanee gi nwoke nime Onyenwe anyi aka - ịnwe mmerikọta nke Chineke ebe nwanne gi nọ. Mgbe ịnwere “Philadelphia”, ọ pụtara na ịna ebuli elu, kwanye ugwu ma hụ ndi ọzọ n’anya nke ọma.

Nkea bụ ihe Chineke chọrọ, ọ bụ kwa ihe iga eme. Ọ si “Were nụ ịhụnanya nwanne na nwanne na e meso ibe ụnụ omume n’obi ebere; na e nye ohere ka e buru ụzọ kwanyere ibe ụnụ ugwu” (Ndi Rom 12:10). Mee emume ebere, mee emume ijeghari nime ihunanya. Mee emume ịkwanyere ndi ọzọ ugwu na ịbuli ha elu. Nkea bụ otu ihe di mkpa maka imiputa ogbe na ọrụ di mma na ndu. Pita 2 1:8 si, “ọbụrụna ihe ndịa a dịrị nime ụnụ, babigakwa oke, (otu nke bụ ebere nwanne) ha na e me ka ụnụ ghara ịbụ aga, mọọbụ ndị a dịghị a mịta ogbe nime ọmụma nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”

Akuku mmekọrita nwanne bụ ịkwu okwu ebere, ma nwee obi utọ ebe ụmụnne gi ndi nwoke na ndi nwanyi di. Chineke na a tụkwasi ihe di elu banyere mmekọrita nwanne na nwanne karia otu anyi n’eche. Ọ si na Ndi Galeshia 6:10 (TLB) “Mgbe ọbụla anyi nwere ike, na nụ e mere onye ọbụla ebere ma karịa nke uku nye ndị bụ

Mmekọrita Nke Nna

N’elu ndụ iyi Chineke ebere nwanne; n’elu ebere nwanne kwa ọlụ ịhụnanya (2 Pita 1:5-7).

mọnde

Page 26: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Kọlọsi 2:6-23

Aịzaya 48-49

Jọn 4:43-54

1 Ndị Ee 15

Nkwuputa Enwere m obi ebere na amara ọbụladi dika Nna m nke eluigwe si nwee obi ebere na amara. A na m ebuli ụmụnne m ndi nwoke na nwanyi nime Kraist elu, nihina ihunanya Chineke di nime m na akwali m ka m mee nkea. Obi ebere nke Mmụọ Chineke ka a na a hu nime ibi obi m, na nkparamagwa m. Nihi ya, ndu m na a miputa ogbe na ọrụ ọma na Aha Jịzọs. Amịm.

ụmụnne anyị nime Kraịst.” Nke bụ na ịga enye ụmụnne anyi ndi nwoke na ndi nwanyi ohere ma na ebuli ha elu.

Ndi Rom 12:10 (CEV) si, “Hụritanu onwe ụnụ n’anya dika ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyi, ma bulie ndi ọzọ elu karia onwe gi.” Onyenwe Anyi si gi bulie ndiọzọ elu karia onwe gi! Ekpela ndi ọzọ ikpe mọọbụ mee ka ịmekaria ha. Nwee mmekọrita gi na ha site n’ihunanya Kraist nọ nime obi gi. Nwee amara, ihunanya na obi ebere mgbe niile nye ha.

Ndị Efesọs 4:31-32; Ndị Hibru 13:1-2

Page 27: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

10tuuzdee

Dika otu Kraist siri bụrụ ndu gi (Ndi Kọlọsi 3:3), nakwa eziomume gi, idi nsọ gi, na (mgbapụta)

gi, Ọ bụ kwa amamihe gi. Ya ị bụ amamihe gi pụtara na ị bụ amamihe na ọmụmaihe niile, maka Baibul si na aku amamihe na ọmụmaihe zuruoke nime Ya (Ndi Kọlọsi 2:3), O bikwa nime gi.

Mgbe ịkwuru okwu mọọbụ mee emume, a na a hụta na a nụ kwa amamihe. nwere echiche obi di mma nihina Kraist ka emere ka ọ bụrụ amamihe gi. Nwee owuweanya nkea. Nakwete site n’ikwu, “Kraist bụ amamihe m; a di m mma, na eme ihe niile di mma.” O nwere onye ga a nụ ka ịkuru otua ma chee na ịtuge ọnụ, ma ọdighi; ị na ekwusi ike onye ị bụ na Kraist.

Mmụọ amamihe nke Pọl Onye ozi kwuru maka ya na Ndi Efesọs 1:17 nọ nime gi. Ọbụladi ugbua, kwuputa na a na a hụ na a nụ amamihe Chineke nime gi taa, na amamihe na a kwali gi ime ị rụ ọrụ nime ọchichọ Chineke zuru oke. Kwuputa na ike ahu nke na a chi, na eme ka ịnọrọ n’etiti ọchichọ Chineke, ma nwee nlekpu anya nime ihe ndi bụ eziokwu nke alaeze na a rụ ọrụ nime gi.

Chọpụta ma nakwete na ịjuputara nime amamihe Chineke. Ugbua, na oge niile, kwuputa n’amamihe

Ọ Bụ Kwa Amamihe Gi

Ka anụarụ ọbụla ghara inya isi n’iru ya. Kama site na ya ka ụnụ nọ nime Kraịst Jizọs, onye Chineke merela

ka ọ bụrụ amamihe, na eziomume na ido nsọ, na mgbapụta nye anyi (Ndi Kọrint 1 1:29-30).

Page 28: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Kọlọsi 3:1-4:1

Aịzaya 50-51

Jọn 5:1-9

1 Ndị Ee 16

Nkwuputa Enwere m mmụọ kacha mma, nihina Kraist bụ amamihe m! Echiche m di iche nihina Okwu Chineke enyena m usoro echiche ọhụrụ. Enwere m amamihe nke ndi ziriezi, nke na a kwali m ịrụ ọrụ nime ọchichọ Chineke zuruoke. A ma m eme nkeọma nime ihe niile banyere m, nime Aha Jịzọs. Amịm.

Chineke nọ nime obi gi na nime ọnụ gi bụ ihe a na a hụ anya, na a nụ kwa ya!

1 Ndị Kọrịnt 1:30 GNB; Ndị Kọlọsi 2:1-3

Page 29: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

11

Ozi nke Oziọma di nfe. Amaokwu mmepe anyi kọwara ya dika ozi ihunanya. Ihunanya a dighi

eleba anya nime ihe ndi adighi mma mọọbụ wesara onye mejọrọ ya iwe. Baibul si na Chineke a dighi agụkọ njehie mmdu megide ha. Nkea bụ ozi nke O zigara ya ikwusa gburu gburu uwa. Chineke mara na ha ga esi na njehie ha puta ma hu ya n’anya ma ha nụrụ ma nabata Oziọma nke ihunanya Ya.

Ihe mere uwa amaghi Chineke bụ maka ha amatabeghi oke ihunanya ọ nwere ebe ha nọ. Ihunanya na amuta ihunanya. Mgbe ha ghọtara ihunanya Chineke, ha ga azaghachi ka okwesiri. Nkea mere o ji si anyi gwa uwa banyere ihunanya. Gi onwe gi nabatara oziọma nke ezisara tutu ịnweta nzọpụta. Nihiya, ọ bụ oke n’ọrụ gi ịzisa ozi ihunanya Ya ahu gbanworo ndu gi ruo uwa niile.

Nkea bụ ọrụ anyi – nke gi na nke m - ịme ka uwa mara na ọ bụ ezie na njehie kewapụrụ anyi na Chineke, Onyenwe Anyi Jịzọs biara mee mkpezi n’etiti mmadu na Chineke site n’ichu aja nke ọbara ya. Site n’ichu aja ahu, o donwere mmadu niile nsọ, n’eneghi ntụpọ (Ndi Efesọs 1:3). Ọ napụtara mmadu niile site n’ike ọchichiri, ma taa, onye ọbụla nke nabatara ya, nabatara ndu ọhụrụ, ndu nke

Ozi Nke Ihunanya

Nke bụ na Chineke [ya onwe ya nọri] nime Kraịst, na e me ka ya na ụwa dịrịkwa na mma, n’a gụkọghị

njehie ha megide [mmadu] [kama ọ kagburu ha niile] o tinyekwala okwu ahụ nke iweghachị adịnamma

n’aka anyị (II. Ndị Kọrịnt 5:19 AMP).

wenezdee

Page 30: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ndị Kọlọsi 4:2-18

Aịzaya 52-53

Jọn 5:10-18

1 Ndị Ee 17-18

Nkwuputa Okwu Chineke, Oziọma nke ihunanya , dika ọkụ n’ere ere nke di nime ọkpụkpọ m, ngaghi emechi ọnụ m. A na m eji mmetuta niile busaa oziọma ahu, ebe m mara na ọ bụ ike Chineke ị ji kpọputa mmadu site n’ọchichiri baa nime ihè, site n’ike nke ekwensu baa n’ike nke Chineke. Taa, a na m egosi ọmụmaihe nke Kraist ebe ọbụla m jere, na Aha Jịzọs. Amịm.

eziomume. Nkea bụ oziọma nke Ọ si anyi na e zisa. Anyi bụ ndi nnọchite anya Chineke, ndi nke ezigara

n’uwa maka nkpezi adinamma. Uwa agaghi a nụ mọọbụ mara ihe ndi Chineke mere ma anyi ga ekwuputa oziọma site n’ohèrè ọbụla di nụ. Nkea bụ ihe iji a wụ onye ọkpa ike - maka oziọma, n’agbasa oziọma nke ihunanya Kraist nye uwa gi, na mba uwa niile.

Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9-10

Page 31: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

12

Dimma na mmepe amaokwu bụ usoro, omume di mma mọọbụ ọkachamma. Chineke chọrọ

ka ịtukwasi kwuo nkea n’okwukwe gi: “…dịka Chineke kenyerela ntụtụ ahụ nke okwukwe nime mmadụ ọbụla n’otu n’out (Ndi Rom 12:3). Kama dika a mara n’okwukwe di mkpa, onwere ihe ndi ọzọ Onyenwe Anyi chọrọ ka ịtụkwasi n’elu okwukwe gi ọ bụrụ na ịga enwe ndu nrụpụta ọrụ mgbe dum na mbawanye amara. Otu nime ha bụ omume kacha mma.

Chineke chọrọ ka ịbie ndu gi n’usoro nke Chineke, ị ga etinye igba mbọ nime ime ihe niile: “n’elu nkea, site n’ịgba mbọ niile, gbagwanye nụ ịdịmma n’okwukwe ụnụ…“ Nkea a bụghi ihe ịga eme otụ ọbụla ọmasiri gi, ọ bụ ihe ịga a kpachapu anya ị hụ na ndu gi jụpụtara n’omume nke si n’okwu Chineke.

N’ọmụmaatu, Baibul gwara anyi na Jịzọs jere n’ụlọ Chineke, sinagọg ahu dika usoro ya si di (Luk 4:16). Nkea ọ bụ kwa ogo nke gi? Ọ bụ usoro gi ịga chọọch mgbe ọ bụ oge chọọch? Mọọbụ ị na a ga mgbe ọ diri gi nfe? Ufọdu ndi mmadu na a ga chọọch naani mgbe ha chọrọ ịga, ha enweghi usoro. Ha enweghi ọmume kacha mma.

Kaosidi, n’ebe Jịzọs di, ọ bụ omenaala ya ị ga na Sinagọg. kwesikwara ịnwe udiri ọzuzua na ndu gi: mgbe ọ bụ oge ịga chọọch, gi gaa chọọch, nihina ọ bụ ihe ziriezi

Omume Kacha Mma

Ma, n’elu nkea, site n’ịgba mbọ niile, gbagwanye nụ ịdịmma n’okwukwe ụnụ… (Pita 11 1:5).

Tọọzdee

Page 32: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Ndị Tesalọnaịka 1-2:16

Aịzaya 54-56

Jọn 5:19-27

1 Ndị Ee 19

Ekpere Ezigbo Nna, ekelere m gi maka ịgosi m uru ọbara ịtụkwasi omume ịdimma mọọbu ọkachmma n’elu okwukwe m. Mmụọ nke ọkacha mma na a rụ ọrụ nime m n’ewebata ọzụzụ nime ndu m, n’eme ka m na a gba mbọ, na a mipụta ogbe na ọrụ ọma na Aha Jịzọs. Amịm.

ime, n’agbanyeghi ihe ọbụla nwere ike ịdaputa. N’elu nkea, nwee oge ekpere na ọmụmụ-ọkwu.

Emena ọmụmụ Baibul mọọbụ ikpe ekpere oge ọbụla ọmashiri gi. Kwee ka ihe ndia soro n’ihe ịna eme ubọchi niile. Nabata ọzuzu a, ọ bụ ihe di mkpa maka ndu di ire, ime nke ọma na ịruputa ọrụ di mma na ndu gi.

Ndị Efesọs 5:8-11; 2 Pita 1:5 AMPC

Page 33: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

13

Abuọma 91:3-8 na a kasi obi. Ọ na egosi ihe niile Chineke na eme n’ịchekwa anyi na ịlekọta

anyi anya - ọ bụladi nime mkpagbu niile di nime uwa! Ọ si, “N’ezie ọ ga a napụta gị n’ọnya ndị osi-ọnya, na n’aka nrịanrịa ọjọọ na e fe efe nke na a zụkpọ. Ọ ga e ji nku ya kpuchie gị, ị gakwa a tụkwasị obi n’okpuru nku ya: eziokwu ya ga a bụrụ gị ọta na ekike mkpuchi gburugburu. Ị gaghị a tụ ụjọ maka oke iyi egwu n’oge abalị; mọọbụ maka ụta na e fegharị n’oge ehihè, Mọọbụ maka nrịanrịa ọjọọ na e fe efe nke na a kpagharị nime ọchịchịrị; mọọbụ maka mbibi nke na a la ihe niyi n’ikete-ehihè. Puku ga a da n’akụkụ gị, puku iri kwa n’aka akanri gị; kama ọ gaghị e rute nso ebe ị nọ….”

Hu na ihe mere ịgaghi a damba mọọbụ tụọ ujọ n’ihe ndi n’eme gburu gburu gi? Tụkwasi obi na Chineke na okwu ya. Ekpuchitena gi site n’aka ihe ojoo na ekwensu nọ nime uwa taa: Ọ bụ n’abali, mọọbụ n’ehihe, onyenwe anyi na ekpuchite gi ma lekọta gi anya. nọ na nchekwa. Nzaghachi okwukwe gi nihi ya, kwesiri ịbụ “Kraist nọ nime m, ọ nọnyere m, ọ nọchitekwara m; nihi ya, a bụ m onye mmeri ebighiebi!

Ọ siri na Aizaya 43:2, “Mgbe ị na a gafe nime mmiri

Onye Mmeri Ebighiebi Nime Ya

Ugbua ekele dịrị Chineke, onye na e me mgbe dum ka anyị na a ñụrị ọñụ mmeri nime Kraịst, onye nakwa

e me ka ushi ụtọ nke ịmara ya na a pụta ihè ebe niile site n’aka anyị (II. Ndị Kọrịnt 2:14).

fraịdee

Page 34: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jọn 5:28-32

1 Ndị Ee 20

1 Ndị Tesalọnaịka 2:17-3:1-13

Aịzaya 57-58

Nkwuputa A nọ m nime Kraist, ebe m nwere nchekwa na e bi na mmeri ubọchi niile. Ya onye ya bụ ebe nzuzo m na ulọ uku ewusiri ike m, nime ya ka m tụkwasiri obi! Enweghi m ujọ ọbụla, nihina nime ya ka m bi ebi, ma nwee kwa ọbụbụ m. Ya onwe Ya bụ ike m na ulọ uku m siri ike, nime Ya ka m gbara nkpọrọgwụ, na a basa abasa n’akuku ndu m niile. Chineke ebube!

dị ichiiche, m ga a nọnyere gị; mgbe ị nakwa a gafe oshimiri dị ichiiche, ha a gaghị e rukpudo gị: mgbe ị na a gafe nime ọkụ, ọkụ a gaghị e re gị; ire-ọkụ kwa a gaghị e nwuru n’arụ gị.” Ogbe ebe obibi gi bụ ebe ihe ọbụla a pụghi ila gi niyi. Ogbe ahu bụ Kraist.

Nọ nime Kraist bụ ịnọ n’ebe nzuzo nke izuike na nchekwa Chineke. Abuọma 91:1-2 si, “Onye ahụ nke bi n’ebe nzuzo nke Onye kasị elu ga a nọgide n’okpuru ndo nke Onye kasị uku. M ga e kwu banyere ONYENWE Anyị sị, Ya onwe Ya bụ ebe mgbaba m na ụlọ uku e wusiri ike nke m; Chineke m; nime Ya ka m ga a tụkwasị obi.” Kraist bụ ebe mgbaba gi! Nime Ya, ịgaghi a tụ egwu ihe ọbụla, nihina ịnọ na nchekwa na akunụụba. Uwa nwere ike juputa na nsogbu nke ahia di ọnụ mọọbụ nke akunụụba na a da ada, ma na ngọzi na akunụụba gi nime Kraist bụ ihe emezuworola.

Ndị Kọlọsi 1:27; 1 Jọn 4:4; II. Ndị Kọrịnt

Page 35: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

14

Onwere ihe di iche n’etiti ọmụma nke okwukwe site n’uche obi na ọmuma nke okwukwe site na

mmụọ. Ọmuma nke okwukwe site n’uche bu okwukwe nke ịnwetara site n’akọnụụche gi; ya bụ nne nke ihe nchọpụta ọlọrọ ọhụrụ niile. Ọtụtụ ụlọ akwukwọ anyi nwere taa bụ nrụpụta nke ọmụmaihe okwukwe site n’uche. Nke bụ eziokwu, oge niile ịnọrọ n’ụlọ akwukwọ bụ ịwuli okwukwe gi n’ọmụmihe nke uche obi.

Ọmumaihe okwukwe nke uche obi na a dabere na ihe ndi anyi na a hụ anya, na ihe ndi anyi nwere ike metuta site n’ushi, ịhụ ụzọ, ụtọ nrị n’ọnụ na ịnụ nti. Nkea mere ị na a nụ ka a si “M nwee ike hụ ha, m ga ekwere” Ma mụ a hụghị ya, m gaghi ekwere” Ọ bụ maka ha e wuliela okwukwe ha n’uche obi ha. Udiri okwukwe a dabere n’anu arụ gi. Uche obi gi nọ na ahu gi.

Kaosidi, ịbụghi mmadu anuarụ, ị bụ mmadu mmụọ. Echiche obi gi a gaghi emetụta Chineke. ịnaghi eji obi gi ekwere, ịna eji ya e che uche. Mmepe amaokwu anyi si na mmadu n’eji obi ekwere, ọbụghi echiche uche. Obi bụ mmụọ gi.

Na ịmụghari gi ọzọ, Chineke a dighi atụ anya na ị ga eji ọmụmaihe nke uche okwukwe e bi ndu gi. Ndi Kọrint 11 5:7 si, “Nihina anyị na e jegharị site n’okwukwe,

Ọmụmaihe Ọkwukwe Nke Anụaru Na Ọmụmaihe Okwukwe Nke Mmụọ

Nihina obi ka mmadụ ji e kwere baa n’eziomume; ọnụ kwa ka e ji e me nkwupụta ruo na nzọpụta

(Ndị Rom 10:10).

sọtadee

Page 36: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Ndị Tesalọnaịka 4:1-18

Aịzaya 59-60

Jọn 5:33-47

1 Ndị Ee 21

Ekpere Ekele diri Nna maka amamihe na nkpughe nke m na enweta n’okwu gi. Okwukwe m di ire, na enwe mmeri, nihina ọ dabere n’ọmụmaihe nke mmụọ. A na m enwe ọganiru, na a basa abasa n’akuku niile ọbụla ka m na e to eto n’amara na ọmụma nke okwu na Aha Jịzọs. Amịm.

ọbụghị site n’ihe anya na a hụ.” Ihe anya na a hụ bụ ihe banyere anụ arụ! Ndi Rom 8:13 n’agwa anyi si, “…ọbụrụna ụnụ na e bi site n’ọchịchị nke anụarụ, ụnụ ga a nwụ: kama ọbụrụna ụnụ e site n’aka Mmụọ Nsọ mee ka ọrụ niile nke anụarụ nwụọ, ụnụ ga a dị ndụ.” Anụarụ n’arutu aka echiche obi anyi; ma anyi kwesiri ịbi site n’okwukwe n’Okwu Chineke.

Okwukwe nke Chineke, okwukwe nke mmụọ na a bia site na ị nụ okwu Chineke. Ndi Rom 10:17 si, “Nihi ya, okwukwe na a bia site n’ọnụnụ, ọnụnụ nke okwu Chineke.” Mgbe Okwu Chineke biakure gi, okwukwe na e so ya. Okwu Chineke na etinye okwukwe nime mmụọ gi. Otua ka ọ di, n’ọmamaatụ, ịjiri nwee ike kwere na Jịzọs bụ Ọkpara Chineke n’enweghi ihengosi nke sayence ọbụla.Ọ bụghi n’ịnwere mmetụta na ọ bụ mọọbụ ịmara site n’ahumahu nke ọbịbia moozi. Okwu kwuru sin a Ọ bụ, ị nụrụ ya, ọmụmaihe nke mmụọ tinyere okwukwe nime mmụọ gi.

Jọn 20:29; Ọlụ NdịOzi 8:1; Ndị Hibru 11:1

Page 37: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 38: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

Page 39: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

15

Ndi Rom 3:23 si, “Nihina mmadụ niile e mehiela, ha e rughi kwa ogo ebube nke

Chineke”. Mmadu niile mehiere nime Adam ma nọrọ n’ọchichi nke ekwensu site n’iwu. Olee otu nkea siri mee? Ndi Rom 6:16 si, “Ọ bụ ụnụ a maghị, n’onye ụnụ nyere onwe ụnụ n’aka ya dịka ndị odibo ka ụnụ na e rubere ya isi, ụnụ bụ odibo nye onye ahụ nke ụnụ na e rubere isi; mọọbụ nke mmehie baa n’ọnwụ, mọọbụ nke irube isi baa n’eziomume?” Adam rubere satan isi ma bụrụ odibo ya; onyere setan ikikere ya. Nkea bụ ikikere setan jị e mekpa ndi mmadu ahu ma donwe ha n’agbu.

Maka mmadu ịnwere onwe ya n’ọchichi setan, a ga a mụghari ya ọzọ, ka ọ bụrụ okike ọhụrụ. Okike ọhụrụ ka e mere ka ọdi site na mbilite n’ọnwụ nke Jịzọs Kraist. Baibul n’akpọ Ya onye mbụ a mụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ (Nkpughe 1:5). Ya bu onye mbu si n’ọnwu mmụọ bulie, ndi niile a mụghariri ọzọ bụ ndi a mụrụ site n’ọnwụ mmụọ.

Nkea bụ ihe anyi ji e zisa oziọma, ka ndi mmadu mara na ha a nọghi kwa n’ọgbu nke setan ọzọ. E kwesighi ka e si na ndu Chineke wezuga ha. Tulee nkọwa nke ndi a na a mụgharibe ọzọ na Ndi Efesọs 2:12; ha bụ “ndi e soghi bụrụ ndị obodo uku ahụ nke Izrael, ụnụ bụkwa ndị ọbịa site n’ọgbụgba ndụ dị ichiiche nke nkwa ahụ, ndị

Ọmụmụ Ọhụrụ: Ihe Kwesiri Omume Maka Mmadu Ọbụla

Ya e rina gị ọnụ na m gwara gị sị, A garịrị a mụ ụnụ ọzọ (Jọn 3:7).

sọnde

Page 40: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-28

Aịzaya 61-63

Jọn 6:1-14

1 Ndị Ee 22

Nkwuputa Ekwenyere m na Chineke mereka Jịzọs si n’ọnwụ bulite. A na m aka anya n’ekwuputa na Jịzọs bụ onye nwe ndu m. Nihi ya, a bụ m onye nketa oke nke ọdidi ya, a na m ebi ndu ebube, eziomume, ọganihu, ahuike, akunụụba, na mmeri nime Kraist. Aleluya!

Jọn 3:3-7; Ndị Efesọs 2:19; Ọlụ ndị ozi 4:12

e nweghi olileanya, e nweghi kwa Chineke nime ụwa.”Kedu ka onye ọbụla si ebi ndu n’enweghi Chineke?

Kedu ka mmadu si ebi nime oke ọchichiri na isi? Onweghi ihe ka nkea njọ, enweghi olileanya! Ọ bụ ihe mere Jịzọs si, “Ya e rina gị ọnụ na m gwara gị sị…a ga a mụghariri gi ọzọ” (Jọn 3:7). Mgbe a mụghariri gi ọzọ, a na esite n’ogbe ọchichiri bufee gi n’alaeze nke ọkpara Chineke ọ hụrụ n’anya. Ọzogbo, ekewapu gi site n’ọnwu baa na ndu, ịgaghi alakwa niyi ọzọ (Jọn 3:7).

Ọdida, ọria, ịmeri gi, ubiam na ihe niile ọbụla bụ nke ọchichiri agaghi abụ akuku ndi gi ọzọ ebe amụghariwo gi ọzọ: “Nihi ya ọbụrụna mmadụ ọbụla nọ nime Kraịst, ọ bụ ihe okike e kere ọhụrụ: ihe ochie niile a gabigala; lee, ihe niile a dịrịla ọhụrụ” (Ndi Kọrint 11 5:17).

Page 41: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

Amaokwu anyi jiri mere isi okwu bu eziokwu. Akwukwọ nsọ di otua na eme ka mmadu

nwee ngbagwoju anya ebe ufọdu ndi mmadu nọ, ndi n’agbanyeghi na ha bụ ndi a mughariworo ọzọ, ha ka na a cho mgbaputa. Okwu Chineke siri, na Chineke agbaputala anyi n’aka ike nke ochiciri, ma bufekwa anyi n’ime alaeze nke Ọkpara ya Ọ huru n’anya. O mezuwo nkea. Inweghi mkpa mgbaputa ọzọ. Ọ gbaputara ọbụna ndi na a bụghi ndi Kristians, nihina ọnwụ Jizọs Kraist wetara anyi nwere onwe na nzọpụta nye mmadu ọbụla, ọbughi naani ndi Kristian.

Ghọta onye bu onye Kristian; Ọ bu onye e kere ọhụrụ, mmadu ọhụrụ; Ọ bụghi onye agbaputara site na nmehie mọọbụ n’aka ekwensu, n’ihi na onweghi mgbe ọ bụ odibo nye mmehie na ekwensu. Akwukwo Ndi Kọrint 11 5:17 siri, Nihi ya ọburuna mmadu ọbụla nọ nime Kraist, ọ bụ ihe okike e kere ọhụrụ, na a dighi na mbu nọrọ, Ihe ọbụla gbasara ndu gi, site na oge ịnabatara Kraist, bu ihe ọhuru. Inwere ndu ọhụrụ nke na a dighi n’okpuru ekwensu, mmehie na ihe niile ọ na a rụpụta.

Ọ bụghi ihe kwesiri ekwesi ị che na Chineke ga a mu onye ekere ọhụrụ, mee ya ka ọnọrọ n’okpuru ekwensu! Jemis 1:18 siri, “N’ọchichọ nke onwe ya ka O jiri mụọ

16Onye Ahu Ekere Ọhụrụ A Chọghi

Mgbapụta Onye gbaputarala anyi n’aka ike nke ochichiri, onye bufekwarala anyi nime alaeze nke okpara ya O huru

n’anya’ (Ndi Kọlọsi 1:13)

mọnde

Page 42: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

2 Ndị Tesalọnaịka 1:1-12

Aịzaya 64-66

Jọn 6:15-21

2 Ndị Ee 1-2

EkpereEzigbo Nna, A na m ekele gi maka idu m n’uzọ nke mmeri! A na m a chi ma na emeri ike nile nke uwa site na iga ije n’okwu gi, na egosiputa ike nke mmụọ nsọ! Mu na Kraist na a nọdu n’ogo nke eluigwe, n’ebe di elu karia ike mmụọ ọjọọ nile. A na m ekele gi maka ebube gi nime ndu m, na aha Jizos. Amịn.

anyi site n’okwu nke eziokwu, ka anyi wee nọrọ dika ogbe nke izizi n’etiti ihe niile O kere.’’ A ga a si na ọ bu Chineke muru anyi, anyi bụ ụmụ ya nke iwu kwadoro, nwere ike na ikikere ichupu ajọ mmụọ niile. Anyi na Chineke bụ otu; anyi nwere udi ndu Ya, Ma nọrọkwa na ogo udidi ya! Nkea bu udi mmadu onye Kristian bụ! Ya na Kraist bilitere n’ọnwụ ma nọrọ kwa n’ebe di elu karia ichi-isi na ike niile.

Na oge ọbụla, Ekwensu mọọbụ ndi mmụọ ọjọọ ya biara nso ebe ịnọ, chupu ya. Inwere ike nke di na aha Jizọs ime nke ahu. Agbanyeghi udi ihe ndi igabigaworo, mọọbụ ihe ndi ina agabiga ugbua mọọbụ ịna eche, okwu Chineke bu eziokwu: Ikariri ekwensu; donwe Ekwensu n’ọnọdụ ya, n’okpuru-ukwu gi!

Jọn 8:36; 1 Jọn 4:4; Luk 10:19

Page 43: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

17

Ama okwu anyi jiri bido, n’agbanyeghi na ọ bu amaokwu amara amara nime Baibul, a bụghi

ihe ọtụtụ ghọtara ma nwee obi utọ banyere ya. Ọ siri onye ọbụla nke kwere na Jizọs a gaghi a la niyi, kama ọga enwe ndu ebighiebi. Nkea bu iwu nke Mmụọ. Ọ bụrụ na ikwere na Jizọs, n’otu ntabi anya ibuworo onye ekewapuru site na ndi ga a la niyi; ị soghi n’ọnu ọgụgụ ha. Uru ọzọ bụ nkaa, ịnwetara otu ihe: ndu ebighebi; ndu na ọdidi nke Chineke.

Ndi Kọrint 11 5:17 siri, “Nihi ya ọ bụrụna mmadu ọbụla nọ nime Kraist, ọ bụ ihe okike e kere ọhụrụ: ihe ochie niile a gabigala; lee, ihe niile a dirila ọhụrụ.” Mgbe ị biara na Kraist, ịnatara nzọpụta, emekwara gi baptizm nime Ya. Ya bụrụ ebe obibi gi, nime Ya, ị bụ okike e kere ọhụrụ, onye ọhụrụ na a dighi nọrọ na mbu, ihe ochie niile a gabigala, ihe niile a dirila ọhụrụ.

Bughizi udi mmadu ibu na mbu; ibụ mmadu ọhụrụ, onye e kere ọhụrụ nime Kraist Jịzọs! Ndu nke anuaru gi bụzi ihe eji udi ndu nke Chineke bụ ndu ebigheebi gbanye. Ọbụbụ ndu ọhụrụ nọzi nime gi; ndua di nime ime gi mere ka ibụrụ mmadu a na a pụghi ị la niyi, kama inwere ndu nke Chineke, bụ ndu nke kariri anu arụ. Jọn ghotara eziokwua mgbe ọ siri, ‘’Nkea kwa bụ ihe ahu e dedara, na Chineke

Ọmụmụ Ọhụrụ Na Ndu Ebighiebi

Nihina Chineke huru uwa n’anya nke uku otua, n’o rara naani otu Okpara ya nke O muru n’onwe ya nye, ka onye obula kwere na ya a lana niyi, kama ya nwee

ndu ebighiebi (Jon 3:16).

tuuzdee

Page 44: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-17

Jeremaya 1-2

Jọn 6:22-29

2 Ndị Ee 3

Ekpere Nna nke Eluigwe, a na m ekele gi maka izite Jịzọs ka ọ nwụọ ọnwụ maka mu, ka m wee nwe ndu ebighiebi! A na m ekwuputa na ndua na a rụ ọrụ nime arụ m niile, na a chupu ọria, nrirnria, adighike, ọnwụ, ogbenye na ihe ndi ọzọ niile na ekwenyeghi na udi ndu nke Chineke, O nyeworo m, na aha Jịzọs. Amin.

1 Jọn 5:11-12; 1 Pita 1:23; Ọlụ NdịOzi 6:4

e nyela anyi ndu ebighebi, ndua dikwa nime Ọkpara ya (Jọn 1 5:11).

Ọmụmụ ọhụrụ na ndu ebighiebi bụ ihe nweta nke okwu Chineke na enye anyi ugbua. Ọbụrụ na a mụghariala gi ọzọ inwere ndu ebighiebi. Ọbụghi nkwa; ọ bụ ndu inwere nime gi ugbua. Ma ọ bụrụ na ịmaghi maka ya, inweghi ike itinye ya n’ọrụ; I ga na e bi ndu efu nke mmadu efu na agbanyeghi na inwere udi ndu nke Chineke. Nwe owuwe anya na inwere udi ndu nke Chineke nime gi, na ekpori ndu na ihe nweta di nime ya. Jọn 1 5:13, “Ihe ndia ka m derela n’akwukwo nye unu niile ndi kwere n’aha Okpara Chineke; ka unu wee mara n’unu nwere ndu ebighiebi, ka unu wee kwere n’aha Okpara Chineke.’’

Page 45: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

18

Nrigoro elu nke Jịzọs bụ otu isi okwu nke ndi Chọọch akọwabeghi na owuwe anya gburugburu

uwa. Anyi ekwuola ebe ọbara uba gbasara mbilite na ọnwụ ya n’ihina nkea di ezi mkpa; mbilite n’ọnwu Ya bụ ọmụmụ nke kristaniti. Ma nrigoro ya n’elu bụ ihe iribaama kacha puta ihè ma ewepu ọnwụ ya. Nkea bu mbu ihe di otua ime kemgbe uwa bidoro, mmadu irigoro n’ọbụbụ ya baa n’iru Chineke, mee ka anyi mata na enwere ebe ọzọ ndu di nke kariri ndu nke uwaa.

O pụghi n’otu ntabi anya. Ọ rigoro n’anụahu ya ebugoliri n’ebube. Tupu rue mgbe ahu, ụmụ nne Ya ekwenyeghi na Ya. Ha na a nụ oziọma ya na a hu kwa ihe iribaama Ọ na eme, ma otu ihe ha a pughi inabata bu na ọ siri, “Mu onwe m si n’elu” (Jọn 8:23). Kedu ka osiri bụrụ eziokwu, ebe bụ na anyi na ya bi ebea, nime otu ulọ, n’ọtụtụ afọ ndia? Ha ga na eche na obi ha.

Ma nrigoro Ya baa n’eluigwe gbanwere ihe niile! O nyeghi ohere itụghari uche banyere ebe ọnọ. Ndi na eso uzọ ya, Nne ya na ụmụnne ya nọ ebe ahu n’ele ya ka ọ hapụrụ uwa a. Na ihu anya ha, Jịzọs gafekwara irupke. Mgbe ahu ka odoro ha anya na nwoke a ha na ya soro tolite bụ ọkpara nke Chineke n’ezie. Aleluya!

Ọlu Ndi ozi 1:10-11, siri “Ma mgbe ha na e legide anya n’elu ka ọ na a rịgo, lee, ndị ikom abụọ guzoro n’akụkụ ha ndị yi uwe mwụda na e nwu ọcha; Ndị kwukwara sị, Ụnụ ndị ikom Galili, nihi gịnị ka ụnụ

Nrigoro Ya Ahu Na Nkwa Nke Nlaghachi Ya

Ma mgbe O kwusirila ihe ndia, ka ha na e le anya, e weliri ya elu; otu urukpe narakwara ya puo n’anya ha

(Ọlụ Ndi-ozi 1:9).

wenezdee

Page 46: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

2 Ndị Tesalọnaịka 3:1-18

Jeremaya 3-4

Jọn 6:30-40

2 Ndị Ee 4

EkpereOnye nwe m Jịzọs di oke ọnụ ahia, Ihapuru anyi ma kwe anyi nkwa na ị na a biaghachi ọzọ ịkporo anyi ba ebighiebi. Ọ ga a bụ ubo’ọchi oke ọnụ! Ekele diri gi maka udi olileanya di otua na nkasiobi; Obi anụri na ejuputa m obi dika mu na a tụghari uche na oke ọñụ ga a bu nke m, mgbe m ga ahu gi ihu na ihu. Amin.

2 Timọti 4:8; Jọn 14:3; Ọlụ ndị ozi 1:10-11 AMPC

guzoro na e leba anya nime eluigwe? Otu Jizọs nkea, nke e siri n’etiti ụnụ welie gaa n’eluigwe, ga e sikwa otua bịa n’ụzọ ahụ nke ụnụ hụrụla nke o si a la nime eluigwe.” Ee, n’ezie, otu ubọchi n’oge na a dighi anya, nzukọ ikpeazu nke Chọọch ga a bụ ihe emerela eme, ma ihe niile anyi na eme taa izisa oziọma ga a bia n’isi njedebe. “Nihina Onyenwe anyị n’onwe ya ga e ji olu iti mkpu, jiri olu nke onyeisi ndị mmụọ-ozi, jirikwa opi-ike nke Chineke si n’eluigwe rịdata: ndị ahụ kwa nke nwụrụ anwụ nime Kraịst ga e bu ụzọ bilite: A gakwa e jide ha nime urukpe dị ichiiche jidekwa anyị onwe anyị ndị dị ndụ ndị nakwa a dịgide, ka anyị zute Onyenwe anyị nime ikuku: otua kwa ka anyị na Onyenwe anyị ga a nọgide mgbe ebighebi (Ndi Tesalonaika 1 4:16-17).

Nkea bu olileanya onye nke Kristian ọbula: Ndu anyi na Ya bu si n’ebighiebi ruo na ebighiebi. Baibul siri, “Onye ọbụla kwa nke nwere olileanya nkea nime ya na e do onwe ya ọcha ọbuna dika ya onwe ya kwa di ọcha” (Jọn 1 3:3).

Page 47: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

19

A kọwaala eziomume dika ezi nguzo n’okpuru Chineke. Ma enwekwara nkọwa ọzọ; nkea

bụ eziomume nke Chineke na a rụ ọrụ na mmadu-ndu Chineke iputa ihè nime mmadu. Itinye ya n‘ebe ọka doo anya, eziomume bu ndu nke Chineke na ihunanya ya na a rụ ọrụ nime gi.

Ozioma anyi mere ka o doo anya na Nna anyi enye wo anyi eziomume ya; ugbua anyi nwere ike iguzo n’ihu ya na enweghi ọmụma ikpe, mọọbu iche na anyi etozughi oke iguzo n’ihu ya. Onyewo anyi eziomume ya, Ikike ya ịme ezi ihe, ka anyi na ya nwee ike biri na idi n’otu. Anyi a gaghi adọgbu onwe anyi ime ihe ga a di ya mma; Ugbua ọ bu ndu anyi na ọdidi anyi ibi n’ihu ya n’eziomume na ezi idi nsọ (Ndi Efesọs 4:24).

Ndi Rom 5:1 siri, “Nihi ya, ebe ọ bụ site n’okwukwe ka a na e me ka anyị bụrụ ndị eziomume, anyị nwere udo n’ebe Chineke nọ site n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst:” Ugbua, anyi na e che echiche, na e kwu okwu, na e me omume otu uzọ ahu. Baibụl siri, “...ndi ahu nke na a nara mbagide nke amara na nke onyinye nke eziomume ga a chi ọchichi na ndu karia site n’aka otu onye, Jịzọs Kraist” (Ndi Rom 5:17). Iziezi nke anyi na Chineke nyere ị chi a chi dika eze nime uwaa nkea. Anyi na a chi achi

Eziomume: Udidi Chineke Pụtara Ihè Na Mmadu

Kama ugbua, a na e me ka eziomume nke Chineke nke a bughi site n’iwu ahu puta ihe, nke iwu ahu na ndi amuma gbarala ama maka ya; (Ndi Rom 3:21).

tọọzdee

Page 48: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 1:1-20

Jọn 6:41-51

2 Ndị Ee 5

1 Pita 2:9 AMPC; Ọlụ NdịOzi 8:30; Ọlụ NdịOzi 5:1 AMPC

Jeremaya 5-6

Nkwuputa Otuto diri Chineke rue mgbe ebighiebi! A bụ m mkpughepu nke eziomume nke Nna, ngosiputa na nrụpụta ọrụ nke eziomume ya. Amamihe na ikpe ziri ezi ka a na a nụ ma na a hu kwa nime m; a bu m ngosiputa nke ebube Ya. A na m a chi achi site na eziomume gi nke di nime mmụọ mu, na Aha Jịzọs. Amin

n’elu mmụọ ọjọọ niile na n’elu uwa nkea na usoro ya niile. Nke ọzọ bụ na, ọ bụghi naani na Chineke mere anyi

ndi eziomume, O mere ihe ọzọ di oke ike na itunanya. Ndi Kọrint 11 5:21 siri, ‘’Nihina o meela ka onye a maghi mmehie ghọọ mmehie n’ihi anyi; ka e nwee ike mee anyi eziomume nke Chineke nime ya.’’ Jịzọs were ọnọdu nke mmehie anyi ma mee anyi ka anyi bụrụ eziomume ya. Nkea putara na anyi bu eziomume Chineke nime Kraist Jịzọs. Ọ bụ ihe itụnaanya!

Nkea putara na anyi bu mkpuhepu nke eziomume nke Nna; ngosiputa na aka ọrụ nke eziomume ya. Mgbe ị batara nime okwu ọbụla, inọghi ebe ahu ikpebi onye mere ihe ọma mọọbụ nke ọjọọ, kama, ina eweta omuma ikpe nke Chineke. bụ eziomume ya pụtara ihè, na mkpuhe nke ebube ya. Ngọzi diri Chineke!

Page 49: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

20

Onyenwe anyi Jịzọs Kraist nwere ike ọchichi ‘ihe niile, ma ụmụ mmadu, ndi mmoo ozi, na

mmụọ ọjọọ; ihe ndi di na eluigwe, eluuwa na okpuru uwa nọ n’okpuru ya, ha aghaghi irubere olu ya isi. Dika ndi nnochi anya ya na eluuwa, O nyewo anyi ike n’ebe ihe niile di. Ọ na egosiputa ike ochichi ya taa site na anyi – Chọọch Ya, nke bụ ahu Ya.

Ndi Efesos 1:21, na ekwu maka Kraist nke biliri n’onwu, gwara anyi na ọ nọdụrụ ọdu n’ogo nke eluigwe, “Dị elu karịa ịchị ọchịchị niile na ikikere na ike na ike ọchịchị na aha niile a na a kpọ akpọ [dị elu karịa ugo niile a pụrụ itunye etunye], ọbụghị naanị n’oge mgbe nke ugbua na nime ụwa nkea, kama n’oge mgbe nke na a bịa abịa na n’ụwa ndị na a bịa abịa” (AMP). Ebea, okwua “ọchichi” pụtara ihe abụọ: nke mbu, ọ bụ ike na a chi ọchici, nke abụọ bụ iwu nke ha ji a chi ọchichi. Ọ pụtara ọchichi na usoro iwu ọchichi. Ya mere, o nweghi ihe o mere bụ iwu ọbụla nke enyerena. Jịzọs di elu karia iwu niile. Hụta na ọ nọghi naani n’elu, ọ bụghi n’elu di ntakiri kama ebe di oke elu karia ọchichi niile. Aleluya!

Ma Ndi Filipai 2:9-11 siri, “Nihi ya kwa Chineke e buliela ya elu nke uku, nyekwa ya aha nke dị elu karịa aha ọzọ niile: N’ihe niile ga na e gbu ikpere n’ala

Jizos biakwara gwa ha okwu, na e kwu si, E nyefeela ike niile n’aka m nime eluigwe na nime eluuwa

(Matiu 28:18).

Ichi-isi Nke Kraist

fraịdee

Page 50: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 2:1-15

Jeremaya 7-8

Jọn 6:52-60

2 Ndị Ee 6

Ekpere Onyenwe m Jịzọs di oke ọnụ ahia, e kelere m gi maka inye m ike iwu kwadoro ime ihe n’ọnọdụ gi. Eji m ohere oma nke inyere m na a kwusi ọlu ochichiri ọbụla na eme na akuku m, na ekwuputa ma nọgidesie ike na mkpebi m ihu na ọ bụ naani okwu gi na emezu na ndu m na ihe niile gbasara ndu m. Amin.

nye Aha Jizọs, bụ ihe ndị dị n’eluigwe, na ihe ndị dị n’eluụwa, na ihe ndị dị n’okpuru eluụwa; Nakwa n’ire niile ga na e kwupụta sị Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, si otua na e buli ebube Chineke Nna.” Chọọch e jibeghi aha Jịzọs mee ihe dika o kwesiri. Aha ahu na emepe uzọ niile. Nime aha Ya, ịnwere ike ịchupu mmụọ ọjọọ, zụọ ike nke ọdidi mmadu, ma tinye ndi mmoozi n’ọru ije ozi ha banyere gi.

Kraist a kpọbatawo anyi na ndu nke mmeri pụrụ iche. Anyi a bụghi ndi a na e meri emeri kama ndi mmeri nime uwa a. Baibul si, “...nihina otu Ya onwe Ya di, otu ahu ka anyi onwe anyi di nime uwa nkea’’ (Jọn 1 4:17). Anyi na a nọchite anya ya. O nyere anyi ike, ike nke iwu kwadoro ime ihe n’ọnọdụ Ya! Ihe ọbụla ina ekwuputa na Aha ya, Ọ na eme ya ka ọpụta ihè. Kwusi ibe akwa ma na ị rio Chineke ka mee ihe gbasara ọnọdụ gi. Were Aha Jịzọs! Tinye ike onyere gi n’ọru n’ihe ọbụla gbasara ndu gi n’ubọchi taa, ma bụrụ onye mmeri n’oge niile.

Luk 10:19; Mark 16:17

Page 51: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

21

Otu onye ozi nke alaeze otu mgbe juru m ajụjụ, ‘’Gini mere ufọdu ndi ozi Chineke gbasachaa

oziọma ọtụtụ afọ ma nwee ihe ọjọọ ga a biara n’ikpoazu, kedu otu anyi ga e si gbachaa ọsọ a n’uzọ di ebube n’abụghi ọdida? Ọziza m bụ ịrụtụrụ ya aka n’okwu Jịzọs na amaokwu anyi jiri mere isiokwu. Ọ bụrụ na anyi etinye uche anyi n’okwu ya, anyi ga a bụ ndi mmeri oge dum. Ọ gwara anyi ka anyi na a nụ ma na e bi site n’Okwu Ya.

Igbasa Okwu Chineke na ibi site n’Okwu Chineke a bụghi otu ihe. Na ị na a gbasa Okwu Chineke aputaghi na ọ na a rụ ọrụ nime ndu gi; ị ga ebiriri Okwu ahu. Okwu Chineke bu aziza nye ajuju niile ma bụ kwara ọsisa nwe nsogbu niile. Ọ bụ ya mere anyi ji ekwusa ma na akuzi okwu Chineke, inyere ndi nke Chineke aka ighota okwu Chineke ma na ebikwa ndu nime okwu Chineke.

Pọl onye ozi mere nke ọma dika onye mgbasa nke oziọma. Na ọgwụgwụ ọrụ ya, Ọ siri, “A lụọla m ọgụ dị mma, a gbazuola m ọsọ nke m, e dobekwala m okwukwe ahụ…” (Timoti 11 4:7) Ọ nwalere okwu Chineke ma

Nọgide N’Okwu Ahu

Onye ọbụla nke na a bịakwute m, nke nakwa a nụ okwu m dị ichiiche, nakwa e me ha, m ga e gosị ụnụ onye o yiri: O yiri nwoke onye wuru ụlọ, onye gwuru

ala miri emi, tọọ ntọala ụlọ ahụ n’elu nkume: ma mgbe idehi mmiri bidoro, mmiri pịasiri ike n’ụlọ ahụ, ma ọ pụghị inugharị ya: nihina a tọrọ ntọala ya n’elu

nkume (Luke 6:47-48).

sọtadee

Page 52: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 3:1-16

Jeremaya 9-10

Jọn 6:61-71

2 Ndị Ee 7-8

AbụỌma 119:105; Jemis 1:21-25

Nkwuputa Ndu m na enwoghari ma na a di ọhụrụ dika m na a tụghari uche nime okwu Chineke. Ihè na e juputa n’okporo uzọ m, a na m a ga ije n’eziomume, akuụụba, ahuike, ọganiru na mmeri n’oge niile. Oke nke m n’ezie na a da n’ebe dimma enwere m ihe nketa di ezimma. Otuto diri Chineke!

bie ndu nime ya. Na Ọlu Ndiozi 20:32 o kwenyere ma kwuputa ikike nke di n’Okwu Chineke n’okwu nke ikpoazu ya nye umunna ndi nọ na Chọọch di na Efesọs. Ọ siri ‘’Ma ugbua, ụmụnna m, a na m a rara ụnụ tinye n’aka Chineke, a n’aka okwu nke amara ya, nke nwere ike maka iwulite ụnụ elu, nyekwa ụnụ ihe nketa n’etiti ndi niile e doro nsọ.” Ọ bụ maka inọgide n’Okwu Chineke.

Chineke enyena gi ihe niile inwere ike ichọ nime ndu gi. O nyewo gi eziomume, ahuike, ọganirụ, udo, akunụụba, ọñụ, mmeri, na ihe niile di nime Kraist Jizọs. Were ha ma mee ka ha bụrụ nke gi. Agbalikwala ka inweta “ihe ọbụla” n’ebe Chineke nọ; inweena ihe niile gbasara ndu na ndu iyi Chineke (Pita 11 1:3).

Ya mere, n’oge ọbụla, kwuputa, “A bu m eziomume nke Chineke nime Kraist. E nwere m ndu nke Chineke nime m, E nwere m ọganiru, E nwere ahuike, akunụụba, udo, na ọñụ!” Nkwuputa gi nke Okwu na egosiputa eziokwu. Nọrọ n’Okwu ka ọganiru gi na ndu na ozi gi ga a bu ihe nke akwadorola n’oge niile. Aleluyah!

Page 53: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 54: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

Page 55: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

22Iwu Chineke

Chineke nke udo gakwa e chirụ Satan arụ n’okpuru ọba-ụkwụ ụnụ mgbe a dịghị anya. Amara nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọnyere ụnụ. Amịm

(Ndi Rom 16:20).

Ụfọdụ ndi mmadu ajụọla, “gini mere Chineke alaghi ekwensu n’iyi, kama ihapu ya ka ọ na

a makasi-anya ebe niile? Ọdimma, Ekwensu na a rụ ọrụ n’ogo iwu kwadoro, Chineke kwa na a sopuru iwu; Ọ bụ onye n’edobe ọgbụgba ndu na onye maara iwu, ọ bụ nkea bụ ihe mere O ji jiri iwu na e so n’ekwensu.

Tupu Chineke e kee mmadu, Lucifer nọ kwarii, Cherub ahu e tere mmanu, onye mechara bụrụ ekwensu site na nnupu-isi ya megide Chineke. Ọ tụfụrụ ọnọdụ ya dika onyendu n’esota Chineke, otite mmaụ ya wee bụrụ ihe e meruru emeru. Mgbe Chineke mechara kee nwaoke n’oyiyi Ya na ụdidi Ya, Satan wee weta atumatu ọga eji emebi atumatu Chineke. Adam họrọ irubere Satan isi n’ogige Eden, ma nye ohere imegide Chineke, ma site otua tuba ikikere ya n’aka Satan.

Satan wee site otua nweta ikikere nke Adam, idi ire nke ike ahu ka na a ga n’ihu. Adam wee bụrụ onye nọ n’okpuru Satan, site n’iwu, nihina Baibul siri na ị bụ oru nye onye ina erubere-isi; nkea bu iwu ime mmụọ (Ndi Rom 6:16). Satan, site n’iwu wee bụrụ ọga nke Adam. Cheta, Chineke nyere Adam ikikere nke elu ụwa niile, n’ihe niile di n’ụwa (Jenesis 1:26). Ikikere nke Adam

sọnde

Page 56: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 4:1-16

Jeremaya 11-12

Jọn 7:1-102 Ndị Ee 9

Ditọrọnọmi 32:4; AbụỌma 92:15

Ekpere A na m efe gi ofufe Nna a gọziri agọzi, Onyenwe nke eluigwe na elu-ụwa, maka idi ukwu gi, ike, ebere, amara na ihunanya. Ọdighi onye dika gi; Ọ bụ naani gi bụ Chineke n’ezia na nke amamuihe. Ọrụ gi zuruoke, ụzọ gi kwa ziri ezi! meela maka inwebata m n’ime nwere onwe nke ụmụ Chineke di nsọ; itụọla ntụala m n’ime Zion, dika osisi nke eziomume, imipụta mkpụrụ ọrụ nke eziomume. Amin.

ahu, bụ ihe Satan ka ji a rụ ọrụ ruo taa, Chineke na kwa a sopuru nkea.

Adam nke abụọ maka onye ekere ọhụrụ a bụrụ ihe di mkpa. Mmadu na a chọ mmụghari n’okpuru Adam a; Jizọs Kraist. Baibul kpọrọ Jizọs Kraist Adam nke abụọ na nke ikpeazu. Ọ biara ka omeee ka ọ diri mfe imụghari mmadu ọzọ ma wepu ichi-isi nke ọchichiri; n’okpuru ike Satan. Baibul siri, Chineke bụ “…Onye gbapụtarala anyị n’aka ike nke ọchịchịrị, onye bufekwarala anyị nime alaeze nke Ọkpara ya Ọ hụrụ n’anya:” (Ndi Kọlọsi 1:13). Ebe ibụ onye amụrụ ọzọ, ebupula gi site n’iwu, nwepula gi site n’ichi-isi nke Satan, nime alaeze nke Ọkpara ya Ọ hụrụ n’anya. Ugbua, ibụ nwa Chineke, ma bụrụ ezi onye obodo nke Alaeze Chineke.

Page 57: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

23Okwukwe Na Awụli-elu Na Okwu

AhuUgbua okwukwe bụ njizu n’aka nke ihe ndị a na e le anya maka ha, ihe ngosi nke ihe ndị anya a hụbeghi

(Hibru 11:1).

Abraharm gbara afọ iri-asaa na ise mgbe Chineke siri ya, “Si n’ala gi, sikwa n’ụmụ, sikwa n’ụlọ

nna gi, je gi ruo n’ala ahu nke m ga eme ka ihu ya anya (Jenesis 12:1). N’irubere Chineke isi, obidoro njem, nke n’oge ahu yiri ihe ana enweghi ebe ọbụ, nkea n’egosi anyi ihe ndu nke okwukwe bụ. Hibru 11:8 Gwara anyi, “Site n’okwukwe Abraham, mgbe a kpọrọ ya ka ọ pụọ gaa ebe a ga e mesịa nye ya dịka ihe nketa, o rubere isi; pụọkwa, n’a maghị ebe ọ na a ga.”

Okwukwe chọrọ ka ịna a rụ ọrụ site na ndabere naani n’Okwu Chineke. Mgbe ọgwara gi ka imee ihe, gaa n’ihu mee ya n’ajughi Ya, “kedu ka esi eme ya”? N’ụzọ a ka Abraham jiri tozuo ị bụ onye nwe ụwa ma nweta ahaa: “Nna nke Okwukwe” Chineke nyere ya ụwa niile, nihina onwere ezi echiche nke okwukwe. Ọ ga abụriri na ocheela n’ụwa niile bụ nke Chineke; o nweghi ihe omere ebe Chineke si ya gaa, Ọ (Chineke) ga a nụriri ebe ahi ịgọzi ya.

Okwukwe na awụli elu site n’Okwu. Akụkọ nwaoke ngwọrọ n’ Lystra, edere na Ọlụ Ndiozi 14:8-10 bụ ihe imatu ọzọ doroanya: “Otu nwoke na a nọdụ ala na Listra, onye e nweghi ike n’ụkwụ ya abụọ, ebe ọ dara ngwụrọ site n’afọ nne ya, ọ gatụbeghị kwa ije: Onye ahụ nụrụ

mọnde

Page 58: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 5:1-25

Jeremaya 13-14

Jọn 7:11-19

2 Ndị Ee 10

Ndị Hibru 11:6; Jemis 2:17-18; Ọlụ NdịOzi 4:19-22

EkpereImeela Nna maka Okwu gi n’ume ya ime ihe ndi okwuru n’ime ndu m! Ana eme ka okwukwe m di tukwu elu ma gba ya ume dika mu n’atughara uche n’Okwu gi. Ana akpali amamuihe gi n’ime m ime Okwu gi ma n’ahuta amara na mbanye-ụba, site n’ebube roo n’ebube, n’Aha Jizọs. Amin.

okwu Pọl na e kwu: onye mgbe o lekwasịrị ya anya, hụkwa n’o nwere okwukwe ka a gwọọ ya, O jiri olu siri ike kwuo sị, Guzo ọtọ n’ụkwụ gị abụọ. Ọ wụlitekwara gawakwa ije.”

Naani tulee ụdi nzaghachi okwukwe nke nwaoke a; n’agbanyeghi n’ọgabeghi ije site n’afọ, ọ wụlikwara n’ukwu ya abụọ mgbe Pọl siri, “guzoro n’ukwu gi abụọ!” Ọ jụghi, “kedu ka iji chọọ mu ịme nkea n’ukwu ngwọrọ m abụọ?” Mba! O mere, na otu mgbe ahụ, Okwu ahu.

Ikwesiri isaghachi n’otu ụzọ ahu mgbe ọbụla inatara Okwu Chineke. Dika mkpụrụ Abraham, okwukwe bụ ụzọ obibi ndu gi. Na mkpacharanya mgbe niile mee ihe Okwu ahu siri n’agbanyeghi ihe ndi n’eche gi aka mgba, iga abụ mmeri n’oge niile.

Page 59: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

24tuuzdee

Onyenwe anyi Jizọs, mgbe ọna akọwa ilu nke onye ọkụ-mkpụrụ nye ndi nso-azu Ya, tụnyere

ala ahu nke a na kụ mkpụrụ na ya dika obi mmadu: “…Onye ọgha-mkpụrụ na a gha okwu ahụ. Ndịa bụkwa ndị ahụ nọ n’akụkụ ụzọ, ebe a ghara okwu ahụ: kama mgbe ha nụrụla, Satan na a bịa ozugbo, wepụ okwu ahụ nke a ghara nime obi ha” (Mak 4:14-15). Ya mere, obi mmadu ma ọbụ mmụọ ya ka eji tunyere “ụwa” na akwụkwọ nsọ anyi jiri mehie.

Nkea pụtara n’ọbụ mmụọ mmadu na eweputa ma mee ka ọmaa mma ihe ọbụla onwetara n’Okwu ahu. bụ onye amuru-ọzọ, ikwesiri idozi obi ka ọbụrụ ala na ami mkpuru maka Okwu ahu, ka onwere ike “ike nweputa ma me ka ọdinma, ka onwere ike nye onye n’akụ mkpụrụ,na achicha nye onye oriri.” Elekwala anya ka achicha na mkpụrụ si ebe ọzọ puta. Ha ga esi n’ime gi puta. N’ime gi ka ume imiputa mkpụrụ maka ọkụkụ di, na achicha maka nri.

Nkea putara na mmeri ahu nye ihe n’eche gi aka-mgba, ogbugbo nye nsogbu ahu, ahuike maka ọria-ihe niile-dicha n’ime gi! Chineke emeghi onye ahu ekere

Ozuzu-oke Nke Gi Ahu

N’ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n’elu-igwe ezo, ma ọ bughi n’ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;

11otú a ka okwum di nke nēsi n’ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n’efu, ma ọ buru na o bughi uzọ

mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n’ihe M’zigara ya (Aisaia 55:10-11).

Page 60: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

1 Timọti 6:1-21

Jeremaya 15-16

Jọn 7:20-31

2 Ndị Ee 11-12

Ilu 4:23; 2 Pita 1:3; 1 Jọn 4:4; Joshua 1:8

EkpereEzigbo Nna, Imela maka mbata nke Okwu gi nke nwetere ihé n’nghọta. Site na nkea akwajuputala m na ndu nke n’enweghi nsọtụ n’ihe iganihu site n’ike nke Mmụọ Nsọ nke na a rụ ọrụ n’imem, n’Aha Jizọs. Amin.

ọhụrụ ka ọdabere na ihe ọbụla mọọbụ onye ọbụla, ọbụghi di Ya. Nkea, kaosiladi, apụtaghi “na ịchọghi” Chineke, kama, nkea mere ka Ọ pụta ihe n’omere gi ka izuoke n’onwe gi, na a chọghi enyemaka ma ọbụ inyeaka si n’akụkụ ime gi ka ibi e ndu ezi-ọganihu n’ụwa.

Ndi Kọrint 11 9:8 (AMP) kwara anyi ihe n’emetu n’ahu banyere nye nke a: “Ma Chineke pụrụ ime ka amara niile (nkwụnyere aka dum na ngọzi nke eluụwa) bịakwute gị n’ụba, ka mee niile na n’ọnọdụ niile na n’ụdị mkpa ọbụla i wee nwee ihe ga e zuru gị [nweruo n’ị gaghị a chọ inyeaka mọọbụ onye ndakwasị, bụrụ onye e ji mbabiga oke chọọ mma maka ọrụ ọma niile na onyinye amara].”

Ihe niile nke ichọrọ maka ndu zuru-oke nke ezi ihe iga nke ọma bụ Okwu Chineke. Okwu Chineke bụ ihe n’ekpuchi na enye “ụwa” ike (obi gi) ka ọmiputa mkpụrụ maka ọkụkụ achicha maka nri. Mgbe ọbụla inabatara Okwu Chineke n’obi gi, tughari-uche ma nwere ya mee ihe, ọga amiputa mkpụrụ n’ndu gi.

Page 61: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

25

Akụkụ di mkpa maka ije-ozi anyi nke ndi-nchuaja dika ndi Kristian bụ ikpere ndi ọzọ ekpere:

irọchi arirọ n’akụkụ ha megide ike ọchichiri. Nkea di ezi mkpa maka anyi ime, karicha maka ndi ahu nọ na gburugburu anyi ndi n’adighi ike, n’amaghi ihe, na ndi enweghi ike iguzo maka onwe ha.

Kaosiladi, ọdi mkpa ka iburu n’obi, n’mgbe anyi n’ekpechita ekpere, ọbụghi Chineke na ejichi ihe ọbụla. Ọ bụghi ya n’enweta nsogbu; ya mere, ka anyi ghara ikpe ekpere ka aga a si na anyi na a manye Ya ananye maka mgbanwe.

N’ọmumaatu, ọbụrụ na ina e kpe ekpere maka onye ọria, ọbụghi Chineke mere ya ọria. Ya mere, ọga abụ amaghi ihe ina a riọ na ekpekwa ka Chineke gwọ ya ọria. Kama, ikwesiri iguzoro n’ikikere di n’ime Aha jizọs Kraist megide ọria. Ikwesiri ịnọgide n’ekpere mgbe niile, wusa ọkụ na elu onye-iro n’ihi onye ahu nke na a ria ọria, inyere ya aka ka onwete ahuike.

Enwere ike ịnọrọna na ekpere nkpechita ogologo oge maka nzọpụta nke mmadu, ọdi ka agasi n’ọdighi ezigbo ihe n’esi na ya apụta. Onwere ike ibụ maka ị na e kpe ekpere dika ọbụ Chineke ji onye ahu inabata nzọpụta; ina anọgide Chineke ka “ọzọpụta” ya. Mba! Amara Chineke

Ikpere Ndi Ọzọ Ekpere

Kama ọbụrụna e zoro oziọma anyị ezo, e zoro ya n’anya ndị ahụ furu efu: Ndị chineke nke ụwa

nkea merela ka uche ndị ahụ e kweghi ekwe kpuo ishi nime ha, ka ihè nke oziọma ebube nke Kraịst,

onye bụ onyinyo nke Chineke, ghara inwusa ruo ha (Ndi Kọrint 4:3-4).

wenezdee

Page 62: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jeremaya 17-18

2 Timọti 1:1-18

Jọn 7:32-44

2 Ndị Ee 13-14

1 Timọti 2:1-4; Luk 22:31-32

EkpereE kelee m gi Nna maka inyem ikikere iji tijie njide na mmetuta nke nke ekwensu na ndu ndi mmadu ka ha nwere ike nata nzọpụta. Ana m ekwuputa nzọpụta, nnapụta, ọgwụgwọ na ahuike nyere mmadu niile n’ụwa taa, onye ikwadorola ka onweta nkea! Ana m ekwuputa na ozi nke ozioma anyi na e to eto na emeri na gburu gburu ụwa, na enwebata oke owuwe ihe ubi nke obi ndi mmadu n’ime Alaeze, na Aha Jizọs Amin.

nke n’enweta nzọpụta ka emerela ka ọpụta ihe nye mmadu niile (Titus 2:11). Nzọputa ka emeputarala mmadu niile, n’ime Kraist; o so n’otu ihe jizọs biara imezu.

Ya mere, ikpechitara ndi furu efu ekpere, iga agakwu onye mpụ ahu: Satan! Ya bu chi nke ụwaa; onye merela ka obi ndi mmadu kpoo isi ka ha hara inabata ozi nke oziọma. Ọ bụ ya kpatara ihe mere ndi mmadu ji eme ihe ọbụla ka ha ghara inụ ozi nke ozioma. Ma ngọzi diri Chineke! Dika ndi kristians, anyi were ikikere itiji ike Satan n’obi ndi mmadu, ka ihè ebube nke oziọma nke Kraist nwee ike ka mukee roo ha maka nzọpụta.

Ọbụrụ n’onwere onye ị na e kpere ekpere ka ọ nata nzọputa, nke ahu bụ ihe ikwesiri ime! Detoo ahu onye ahu, ma kwuputa, “Na Aha Onyenwe anyi Jizọs, Ana m etiji ike onye-iro na elu “onye na onye” di otua, ma nara nnwere onwe na nzọpụta” Ọga eju gi anya n’aganyeghi ka ekperea si di nfe, iga enweta ọsisa ịlere anya ya.

Page 63: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

26Ijuputa Na Chineke

Nihina onye ahụ Chineke zitere na e kwu okwu dị ichiiche nke Chineke: nihina Chineke e nyeghi ya

Mmụọ ahụ na ntụtụ (Jọn 3:34).

Ndi Kọlọsi 2:9 kwara anyi na n’ime Jizọs “…njupụta niile nke ọbụbụ Chineke bi n’ọdịdị

nke anụarụ.” Mgbe jizọs jere ije n’ụwa, ojuputere naChineke, n’eme ka anyi mara n’anya nwere ike ijuputa na Chineke. Ọ bụ okwu ahu nke emere anụ arụ. akpọrọ Ya nwa Chineke, nihina Ọ bụ Chineke n’anụ arụ. Ndi Juu mara ihe “Nwa Chineke” pụtara, nke bụ ihe kpatara, mgbe Jizọs siri, “A bụ m Nwa Chineke” okweghi ya odidi.

Jizọs juputara na Chineke. Nkea bụ ihe ọpụtara ibụ onye juputara na Chineke. Ugbua, ọbụrụ na nkea bụ ezi a banyere Jizọs (eziokwu ka ọbụ), kedu maka anyi, ndi anyi na Ya n’ekerita ihe? Ọbụrụ na Jizọs juputara na Chineke ma e tee ya otite mmanụ nke enweghi ntuntu, ebe Chineke zitere ya, nkea puta kwuru na e teela anyi mmanụ n’enweghi ntuntu, nihina Jizọs siri, “…Mgbe ahụ ka Jizọs gwara ha ọzọ sị, Udo dịrị ụnụ: dịka Nna m zigarala m, ọbụna otua, e ziga m ụnụ.” (Jọn 20:21).

Asikwa m, ihe mere Ndi Kọlọsi 2:10 siri, “Ụnụ zukwara oke nime ya, onye bụ onyeisi nke ịbụ isi niile na ike niile.” Okwu ahu bụ “izuoke” bụ mmejuputa, ibụ onye emejuputara! Anyi bụ ndi emejuputara na Chineke, n’otu ụzọ emejuputara Jizọs na Chineke. Edemede nke Amplified mere ka odokwuru anya: “ụnụ ka emere ka

Tọọzdee

Page 64: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jeremaya 19-22

2 Timọti 2:1-26

Jọn 7:45-53

2 Ndị Ee 15-16

1 Jọn 4:4; Jọn 1:16

NkwuputaMmụọ nke Chineke bi n’ime mu otekwalam otite mmanụ n’atughi ya atu! E juputaram n’Chineke! Apughi imeri m mọọbụ daba n’ihe ọghọm. Eteela m otite nmanụ ije ije, n’ime imi puta ọrụ nke eziomume; ikwupute nwere-onwe nye ndi nọ n’agbụ n’ihụ ụzọ nye ndi isii; igwọ ndi obi ha gbariri agbari na nwere onwe nye ndi enwedara n’ala na ndi a na a kpgbu akpagbu, na itughari obi ndi obi-ọjọ na ndi nnupuisi nye amamuihe nke onye ziri ezi! Hallelujah!

ozuoke n’ime ya ebe ụnụ barala n’ozuzu oke ndu n’ime Krist gi onwe gi juputara n’ibụisi nke Chineke-Nna, Nwa na Mmụọ Nsọ…” Nkea pụtara ibụisi nke Chineke ugbua bi ebi n’ahu mmadu anyi dika o bi na Jizọs.

Nkea bụ ihe mere ojiri si, “Eziokwu, eziokwu, ka m na a gwa ụnụ, Onye ahụ nke kwere na mụ, ọrụ dị ichiiche nke m na a rụ ka ọ gakwa a rụ; ọ gakwa a rụ ọrụ dị uku karịa ndịa; nihina m na e jekwuru Nna m” (Jọn 14:12). Anyi nwere ike ime ihe di ukwu karia nihina etere anyi otite mmanụ n’enweghi ntuntu, njuputa nke Chineke bi n’ime anyi. Chineke a gọziri agọzi!

Page 65: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

27

Onyenwe anyi Jizọs mere ka ozuoke ma dookwa-anya maka ebe O si bia na ebumnobi maka

ọbibia Ya. Ọ siri, “Nihina e siri m n’eluigwe rịdata, ọbụghị maka ime ọchịchọ nke onwe m, kama ọchịcho nke onye ahụ zigara m.” Na Jọn 6:35, Ọ siri, “…A bụ m achịcha ahụ nke ndụ: onye ahụ nke na a bịakwute m, agụrụ a gaghị kwa a gụ ya; onye ahụ kwa nke kwere na mụ, akpịrị a gaghị a kpọ ya nkụ ọzọ.” O nwere owuwe-anya maka onye Ọ bụ, ebe-ositere, na ihe ọbiara ime. Ọ mara n’ezitere Ya ma marakwa onye zitere Ya, ma werekwa nkamanya kwuputa ya.

Ihe nsogbu diri ọtụtụ ndi Kristian bụ na ha amaghi ndi ha bụ, igakwa amata nkea site n’ụzọ ha ji ekwu okwu. Tulegodi onye Kristian onye siri, “ Enwerem ọbara mgbali-elu, ma ọbụ enwere m ọria-shuga,” ọ na ekwuputa nkea ka agasi n’ọbụ ihe kwesiri mọọbụ ihe ndi kwesiri ime. Kaosiladi, Baibul siri, “Enweghi otu onye na Zion ga a si, “A na m a ria ọria” (Aizaya 33:24 MSG). Ọ bụ maka ụzọ ha si eche echiche; ụdi ndia akaghi wulite owuweanya-Kraist.

Mgbe a mughariri gi ọzọ, amubara gi n’ime ahuike; ndu Chineke nọchiri ndu mmadu gi nke nọ n’ihe meberede nke ọria n’ nrianria; ị bụghi mmadu nkiti igaghikwa ekwu

Owuwe-anya Nke Onye bụ

Nihina e siri m n’eluigwe rịdata, ọbụghị maka ime ọchịchọ nke onwe m, kama ọchịcho nke onye ahụ

zigara m (Jọn 6:38).

fraịdee

Page 66: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jeremaya 23-25

2 Timọti 3:1-17

Jọn 8:1-11

2 Ndị Ee 17-18

Ndị Galeshịa 4:6-7; Faịlemọn 1:6; Ọlụ NdịOzi 8:17

Ekpere Ezigbo Nna, E kelee m gi maka nkpughe nke Okwu gi nye mmụọ m taa. Mbata nke Okwu gi n’ime mmụọ m n’enye ihè, anakwa m ebi n’ime, nakwa site n’ihè ahu! Site n’ihè ahu, Ana m ahụ nakwa ejidesike ndu ebube m n’ime Kraist, na Aha Jizọs. Amin.

okwu dika mmadu nkiti. Ndu gi sitere n’ime Mmụọ, nke Okwu Chineke na e jide, ọbụghi kwa ọbara nke n’agba n’akwara gi. Ibụghi “onye-nwere ọria.” Onye Kristian abụghi “onye na a nara ọria”; nkea bụ ihe Jizọs kwuru. Ọ siri, “…ọbụrụkwa na ha ñụọ ihe ọbụla na e gbu egbu, ọ gaghị e merụ ha arụ” (Mak 16:18).

Ma ruokwa mgbe, mọọbụ oge, nkea bụrụ owuwe-anya gi, e nwere ike igaghi ejeghari nime eziokwu nkea. Mara, ma nwere owuwe-anya nke onye ibụ nime Kraist. Okwu Chineke n’enye gi ezi nziru-ozi nke onye ibụ dika onye Kristian. Ya mere, na eme ihe ọmụmụ na itụghari uche n’Okwu ahu mgbe niile; ọga enye gi ezi akọnuuche: echieche uche nke onye mmeri.

Page 67: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

28sọtadee

Okwu Chineke n’eji ike nke ga emezu ozioma ahu okwuru banyere ya abia. Okwu ya adighi

agba aka abia; kaosiladi, iga anabatariri ya n’okwukwe ma zaghachi ka okwesiri. Nkea bụ ihe Mary mere mgbe mmụọ nke Onyenwe anyi ahu wetere ya ozi nke sitere na Chineke na ọ ga a mu onye nzọpụta, Jizọs. Ya a si, “…Lee oru nwayị nke Onyenwe anyị; ya dịrị m otu i siri kwuo...” (Luk 1:38).

Ọ na batara ozi, okwenyere ya ma zaghachi na nkwenyere, ya wee rụpụtara ya ọrụ. Nkea bụ ụzọ iga eji azaghachi Chineke. Babul siri, “O kwula…ka anyị wee kaa obi kwuo sị…” (Hibru 13:6). Chineke enyeghi anyi okwu Ya naani ka anyi kwere na ya, nke kacha ezi mkpa bụ ka anyi zaghachi ya; ya mere inwere ike ime nkwuputa nke okwukwe na ndabere nke Okwu Ya. Ọ bụ nkwenyere bụ ihe n’amiputa mkpuru.

N’ọmụmaatụ, Okwu ahu siri, Kraist nọ nime gi, olileanya nke ebube” (Ndi Kọlọsi 1:27). Ya mere, nzaghachi nke okwukwe gi kwesiri ị bụ, “Kraist nọ nime m, ya mere nime ije ozi m, n’ahuike m, nime akunụụba m, n’ezinụụlọ m, ọrụ, azumahia, igụ-akwụkwọ m, n’ihe niile nke gbasara m, ebube Chineke na a pụta ihè! A na m eje ije n’ezi-idimma na ebube nke Kraist; enweghi ihe ihere nọ nime ndu m.”

Nzaghachi Nke Okwukwe Gi Nya Okwu Ahu

Nihina ọdighi okwu nke sitere na Chineke nke n’enweghi ike (Luk 1:37 ASV).

Page 68: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jeremaya 26-282 Timọti 4:1-22

Jọn 8:12-21

2 Ndị Ee 19-20

Aịzaya 54:17; Ọlụ NdịOzi 8:35-37; Mak 11:23

EkpereEzigbo Nna, E kelee m gi maka nkzuzi nke Okwu gi, n’ike nke di n’ime ya. meela maka Mmụọ Nsọ, onye na a kụziri m ka mu nwe ezi nzaghachi nye Okwu ahu. A na m e je ije n’eziomume, ahu-isike, njuputa n’okwu akunụụba, mmeri, na ebube gi taa na Aha Jizọs. Amin.

Abuọma 23:4 siri, “Ee, a sịgodụ na m na a gafe na ndagwurugwu nke onyinyo ọnwụ, m gaghị a tụ ụjọ ihe ọjọọ ọbụla: nihina gị onwe gị na a nọnyere m…” Nzaghachi nke okwukwe gi kwesiri ibụ, na agbanyeghi ihe ọjọọ ọbụla mọọbụ ihe n’echere gi akamgba, A na m enwe mmeri n’elu ha, nihina Onye ahu nọ n’ime m kariri onye nọ n’ime ụwa.” Aleluyah!

Mee ka okwu a diri ire ike n’ime ndu gi, site na nzaghachi nke okwukwe gi.

Page 69: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 70: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

Page 71: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

29sọnde

Ụfọdụ ndi madu nwere echiche n’ezighi ezi n’mgbe ọbụla ha nyere onyinye na Chọọch, ha

na a tu ụtụ iji nyere Chọọch aka. Mba, onyinye gi abụghi ụtụ kama ofufe. Ọbụ akparama agwa nke ofufe. Ọbụ ọgbụgba ama nke okwukwe gi n’ime Chineke di ndu. Mgbe inyere onyinye gi, ina agbama site n’ime mmụọ gi nye Chineke, nye mmụọ gi, nyekwa ndi mmụọ ọjọọ na ekwensu nke ọchichiri, maka okwukwe n’ebe Chineke di ndu nọ; enwere njikọ nke ime mmụọ.

N’eziokwu enwere itụ ụtụ nke inwere ike inye maka inyere Chọọch aka nakwa ọrụ ya, enwekwara ike ịkpọ maka onyinye itụ ụta a. Ma enwere ihe di iche n’etiti onyinye gi, otu ụzọ na ụzọ iri, mkpuru nke Okwukwe na itụ ụtụ. Itụ ụtụ nwere ngọzi ya. Ihe ọbụla inyere n’Aha Onyenwe anyi bụ ihe Chineke gọziri agọzi.

N’ọmụmaatu, Baibul siri, “Onye na e nwe obi ebere n’arụ ndị ogbenye na e binye Onyenwe anyị ihe; Ọ gakwa a kwụghachị ya ihe ahụ nke o nyerela” (Ilu 19:17). Ya mere, mgbe ina enye ogbenye ihe, Onyenwe anyi n’ahuwa ya ama, nihina, ina agbazinye Ya, Ọga akwughachi gi, nihina onye a n’enweghi agaghi akwụghachili gi. Ya mere, Ọ na agọzi gi maka ya.

Nwere Onyinye Gi Fee Onyenwe anyi Ofufe

Nyenu ONYENWE Anyi ebube nke kwesiri aha Ya: Butenu onyinye, bata nu n’ihu Ya: Kpọnu isi ala nye

ONYENWE Anyi n’ima mma nke idi-nsọ (Ihe Emere 16:29).

Page 72: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Jeremaya 29-30

Taịtọs1-2

Jọn 8:22-32

2 Ndị Ee 21-22

EkpereEzigbo Nna eluigwe, A na m ebuli idi ukwu gi elu, ma fee gi ofufe n’obi m niile. Naani gi tozuru oke maka otuto m na nnyechasi onwe nke ana etinyeghi ihe. Na ọụ di n’ime obi m, Anam enye gi otuto na ofufe site n’onyinye m di nsọ, Chineke nke eluigwe na ụwa. Ngọzi diri aha gi ebighiebi!

AbụỌma 96:8; AbụỌma 50:23; Ndị Hibru 13:15

Nke kariri nkea, kaosiladi, onyinye gi nye Chineke di nsọ. Nkea bụ ihe atụrụ anya ka ịmee nihina Ọ bụ Chineke. Ọzọkwa ọdighi onye na agaghi e nyeli Chineke onyinye, nihina ilee anya na gburu gburu gi, iga ahu ihe Chineke jiri gọzie gi. Omela ọtụtụ ihe n’ime ndu, nke okwesiri inara otuto niile, ofufe, na nsopuru. Inye onyinye gi bụ otu ụzọ iga esi e fe Ya ofufe na ọjija-mma maka ihe niile O mere nime ndu gi.

Page 73: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

Mgbe ụfọdụ, na iduru ndi mmehie bia n’ime Kraist, ụfọdụ ndi mmadu, na a maghi ama na

si ka ha kwupute mmehie ha niile. Mgbe onye mmehie bidoro n’ekwupute mmehie ya, Chineke agaghi ahuli ha, nihina onweghi ndekọ nke onye mmehie ahu. Ihe bụ mkpa Ya bụ nsachapu- nwepu mọọbụ ihichapu mmehie nọ na mmụọ nke onye mmehie ahu. Ngwangwa mmehie puru na mmụọ ya, otozula ịbụ onye ekere ọhụrụ.

Dika onye Kristian, ibụ onye ekere ọhụrụ, onye amuru n’enweghi ihe ndi gara aga. Ndu gi bidoro mgbe a muru gi ọzọ (Ndi Kọrọrint 11 5:17). Ya buru, kaosiladi, n’oge ọbụla n’ogo nke ije okwukwe gi, gi jeghee mọọbụ mee ihe n’adighi mma, Baibul siri n’inwere mgbaghara mmehie n’ime Kraist. Ụmụaka ntakịrị m, a na m e dere ụnụ ihe ndịa, sị ụnụ e mena mmehie. Ọbụrụkwa na mmadụ ọbụla e mehie, anyị nwere onye na e kpechite ọnụ anyị n’iru Nna, Jizọs Kraịst onye eziomume: “Ya kwa bụ aja imeda obi maka mmehie anyị dị ichiiche: ma ọbụghị maka nke naanị anyị, kama maka mmehie dị ichiiche nke ụwa niile” (Jọn 1 2:1-2).

Ọ bụ nke mere amaokwu mmehie anyi jiri gwa anyi ka anyi nata ebere mọọbụ mgbaghara mmehie. Chọpụta n’ọsighi, “riọ maka mgbaghara mmehie.” Che echiche maka nkea: dika onye Kristian, ina ariọ Chineke maka

Nata Mgbaghara Mmehie

Ya mere, ka anyị were nụ obiike bịa nso ocheeze ahụ nke amara, ka anyị wee nata ebere, chọtakwa amara

maka inyeaka n’oge mkpa (Hiburu 4:16).

30mọnde

Page 74: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

EkpereEzigbo Nna, Imeela maka ngwugwu zuruoke nke nzọpụta nke m nwetara n’ime Kraist. A na m eje ije n’obi-ike, ebe mu mara na e ziri m ezi, enweghi m ụta na ntụpọ n’ihu gi. Enwere m onwunwe-anya ụdidi eziomume m, anakwam eje ije n’ihè nkea, na Aha Jizọs. Amin.

mgbaghara mmehie, kedu oge Ọ ga a si gi, “ọdila mma; A gbagharala m gi?” Inwere ike iga n’ihu na a riọ maka mgbaghara mmehie, ma na igaghi ama ma agbagharala gi mọọbụ agbagharabeghi gi.

Ma Baibul siri, “Bụrụ ndị amara ya mere ka ha zie ezie n’efu site na mgbapụta nke dị nime Kraịst Jizọs” (Ndi Rom 3:23). bụ onye ziri ezi pụtara ị bụ onye ekwuputara n’ikpe amaghi ya. E meela anyi ndi ziri ezi dika akwụkwọ nsọ kwuru; nke putara na Chineke akpọla anyi ndi ikpe mmehie n’amaghi; Ọ kwuru ụgwọ mmehie anyi n’ozuzu oke site na Jizọs Kraist.

Ya mere, ekwela ka inwee “echiche uche mmehie”; kama, nwee “echiche uche eziomume” Ọ bụrụ na ị na eme ihe n’adighimma, were obi ike nara mkgbaghara mmehie. Si, “Nna, A na m anata mgbaghara mmehie maka ihe ahu mu mere n’adighi mma, na Aha Jizọs,” ma jegharia ije nime inwere onwe. Aleluyah!

Ọlụ ndị ozi 26:16-18; Ndị Efesọs 1:7-8; Ndị Kọlọsi 1:13-14

Jeremaya 31-32

Taịtọs 3:1-15

Jọn 8:33-432 Ndị Ee 23

Page 75: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

Chineke bụ Nna gi! Onyenwe anyi Jizọs mere ka nkea puta ihè na Jọn 20:17, mgbe Ọ siri Mary,

“…Jizọs a sị ya, E metụna m aka; nihina a rịgobeghi m jekwuru Nna m: kama gakwuru ndị ụmụnna m, gwakwa ha sị, a na m a rịgokwuru Nna m, na Nna ụnụ; rịgokwurukwa Chineke m, na Chineke ụnụ.” Jizọs mara Chineke dika Nna Ya; ugba, Ọ na a kpọ Ya Nna ihunanya anyi bi n’eluigwe. Ya ka Ọ bụ n’ezia; anyi bụ mkpụrụ Ya.

Jọn 1 3:1 siri, “Legodụ ụdị ịhụnanya nke Nna bokwasịrịla anyị, ka a na a kpọ anyị ụmụ ndị ikom nke Chineke: ya mere ụwa a maghị onye anyị bụ, nihina ọ maghi onye Ọ bụ.” O, ike na idi mkpa nke amaokwu a! Ọ n wụsara ihunanya Ya n’elu anyi, ka anyi nwere ike ibụ “ụmụ” Chineke! ma ihe nke ahu pụtara? Ọ pụtara n’anyi bụ ụmụ Ya n’otu ụzọ ahu Jizọs siri buru Nwa nke Chineke.

Ọ bụrụ n’iga echeta, nkea bụ otu ihe mere ndi Juu jiri chọrọ ka Ọ ọnwụọ; ha nụrụ ka okwuru, “A bụ m Nwa nke Chineke!” Ha si, kedu ka gi; mmadu nkiti, ka eji eme ka gi na Chineke hara?” “Nihi ya ka ndị Juu ji chọsikwuo ike ka e gbuo ya, ọ bụghị naanị nihina o mebiri sabat, kama o kwukwara na Chineke bụ Nna ya, na e me ka

Ọbụ Nna Anyi Nke Eluigwe

Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị na a hụ nụ ibe anyị n’anya: nihina ịhụnanya bụ ihe sitere na Chineke; onye ọbụla na a hụ ibe ya n’anya bụ onye Chineke mụrụ, onye marakwara Chineke. Onye a dịghị a hụ ibe ya n’anya a maghị Chineke; nihina Chineke bụ

ịhụnanya (Jọn 1 4:7-8).

31tuuzdee

Page 76: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

Ihe Mmụta:

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ

NSỌ N’OTU AFỌ

ATỤMATỤ ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ NSỌ

N’AFỌ ABỤỌ

Leave comments on today’s devotional at www.rhapsodyofrealities.org

EkpereEzigbo Nna, E kelee m gi maka ihunanya di ukwu nke ijiri hụụ m n’anya, nke gosiri site n’izite Jizọs ka ọnwụọ n’ọnọdụ m maka iwete udo nihi mmehie m. Ugbua enwere m ike ikpọ gi Nna ihunanya m. A dighi m a ga ije n’ụjọ, kama n’obi ike, ebe m mara n’ihụru mu n’anya ebighiebi! Imeela maka iwebata m n’ime ụdi idi-n’otu ebubea nke mu na gi, na Aha Jizọs.

ya na Chineke ra otu” (Jọn 5:18).Akụkụ nke ọzọ nke Jọn 1 3:1 nke anyi gụrụ siri, “…

ya mere ụwa a maghị onye anyị bụ, nihina ọ maghi onye Ọ bụ” ụwa amaghi Chineke dika Nna anyi, nakwa anyi onwe anyi dika ụmụ Ya nke iwu kwadoro na nke ezi a, n’ekerikọ ndu n’ụdidi Ya, nihina ha a mataghi otu ahu mgbe O jere ije n’ụwa. N’agbanyeghi nkea, “ugbua ka anyị bụ ụmụ ndị ikom nke Chineke,” (1 Jọn 3:2).

Ugba amuru gi ọzọ, e meela ka idi ndu ma tete n’idi ndu nke ibụ Nna nke Chineke. E tinyela ndu-ebighiebi n’ime mmụọ, enwekwara mmerikọta, idi n’otu nke Nna bụ ezia. “Ma nihina ụnụ bụ ụmụ ndị ikom, Chineke e zibatala Mmụọ nke Ọkpara ya nime obi ụnụ, na e ti mkpu sị, Abba, Nna.” (Ndi Galeshia 4:6).

1 Jọn 4:16-19; Jemis 1:18; Ndị Hibru 2:10

Jeremaya 33

Faịlemọn 1:1-25

Jọn 8:44-592 Ndị Ee 24-25

Page 77: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

igbo

EKPERE NKE NZỌPỤTA

Anyi ma na akwụkwọ ofufe nroa a gọziela gi.Anyi na a kpọ gi ka ị mee Jịzọs Kraist onye nwe

ndu gi site n’ikpe ekpere a:“Onyenwe m Chineke, E ji m obi m niile kwere

na Jịzọs Kraist, ọkpara nke Chineke di ndu. E kwere m na ọ nwụrụ nihi m, ma Chineke mekwara ka o si n’ọnwu bulie. E kwere m na Ọ di ndu taa. E ji m ọnụ m e kwuputa na Jịzọs Kraist bụ onyenwe ndu m site n’ụbọchi taata. Site n’ime ya na nime aha ya, e nwere m ndu ebighiebi; a mụghariwo m ọzọ. Ekele diri gi onyenwe m maka ị zọpụtala mkpụrụ obi m! A bụrụlam nwa Chineke ugbua. Aleluya!”

Kọngratulashọns! Ugbua ị bụrụla nwa Chineke. Maka natakwu nkọwa otu ị ga e si too eto dika Krịsten, biko

kpọtụrụ anyi site n’ụzọ ndia:

united kingdom: +44 (0)1708 556 604

south africa: +27 11 326 0971+27 62 068 2821

nigeria:+234 812 340 6547+234 812 340 6791

canada:+1-647-341-9091+1-416-746 5080

usa:+1 (0) 980-219-5150+1-281-759-5111+1-281-759-6218

Page 78: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Rev. Chris Oyakhilome, Onyeisi Ọchịchị nke Belivers’ LoveWorld Inc. bụ onyeozi nke wepụtara onwe ya maka Okwu Chineke, nke ozi ya webatarala ịbụ ezie nke ndụ eluigwe nime obi ọtụtụ.

“Atmosphere For Miracles,” nke bụ ihe ozizi ya na televishọn e metụla ọtụtụ nde ndị mmadụ n’arụ, otua kwa, ụzọ mgbasaozi ya dị ichiiche, krused, magazine, ọtụtụ akwụkwọ na vidio na CD ya dị ichiiche nke ji ịbụ eziokwu, ịdị mfe na ike e wepụta ịbụ ezie nke Okwu Chineke.

BANYERE ONYE DERE AKWỤKWỌA

Mụtakwuo ihe banyere

Christ Embassy nke a na a kpọkwa

Believers’ LoveWorld Inc. nawww.rhapsodyofrealities.org

www.christembassy.org

Page 79: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 80: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

Page 81: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo

Notes

Note

s

igbo

Page 82: Chris Oyakhilome - Read Rhapsody of Realities - Pastor Chris · Chris Oyakhilome Rhapsody of Realities...AKWỤKWỌ OFUFE NRO KWA ỤBỌCHỊ N’asụsụ Igbo