igbo catholic community (icc) of new york, at angela

5
IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN: 7 TH SUNDAY OF EASTER (YEAR B) SUNDAY, MAY 13, 2018 HYMNS: ENTRANCE: LEE M DINWENU OFFERTORY: IN THANKSGIVING►ONYINYE OMA► CHINEKE ONYEOMA CONSECRATION: AJA DI NSO COMMUNION: ANYI N’EKELE GI, NNE OMA POST COMMUNION: O SACRAMENT MOST HOLY DISMISSAL: MARY NNE OMA

Upload: others

Post on 02-Nov-2021

0 views

Category:

Documents


0 download

TRANSCRIPT

IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC)

OF NEW YORK,

AT ANGELA MERICI PARISH,

BRONX, NEW YORK.

SUNDAY BULLETIN: 7TH SUNDAY OF

EASTER (YEAR B)

SUNDAY, MAY 13, 2018 HYMNS:

ENTRANCE: LEE M DINWENU

OFFERTORY: IN THANKSGIVING►ONYINYE OMA►

CHINEKE ONYEOMA

CONSECRATION: AJA DI NSO

COMMUNION: ANYI N’EKELE GI, NNE OMA

POST COMMUNION: O SACRAMENT MOST HOLY

DISMISSAL: MARY NNE OMA

UKWE MBATA

Dinwenụ nụrụ olu m mgbe m kpọkulu Gị. Mkpụrụobi m n’ agwa m ka m chọba ihu Gị; Ihu

Gị ka m na-achọ; Ezolarịla m ihu Gị, aleluya.

EKPERE MMEGHE

Nna, biko nụrụ arịrọ anyị ma nyere anyị aka icheta n’ime obi anyị na Kristi onye nzọpụta

anyị binyere Gị n’otito, kwere anyi nkwa na ọ ga anọnyere anyị ruo na ejedebe nke ụwa.

Site na Kristi Dịnwenu anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ:(ỌRỤ NDỊ OZI 1:15-17.20-26)

Ihe ọgụgụ e wetara n’ Ọrụ Ndị Ozi.

Isi Okwu: Anyị ga-họpụta n’ime ndị a otu onye ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite

n’ọnwụ ya.

15Otu ụbọchị Pita kwụụrụ ọtọ n’etiti ụmụnna ihe ha ka otu narị mmadụ na iri abụọ

zukọtaranu wee si,

16 “Ụmụnna m n’ime Kristi, ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ aghaghị imezu, nke Mmụọ Nsọ siri

n’ọnụ Devid kwuo n’oge gara aga, banyere Judas Iskarịọt, onye mechara bụrụ onyendu

nke ndị jidere Jesu.

17Unu maara nke ọma na ọ bụ onye otuanyị, na mbụ o nweburu òkè n’ije ozi anyị.”

20E dere ya n’Akwụkwọ Abụọma si, “Ka onye ọzọ were ọnọdụ ya.”

21Ya bụ, otu onye n’ime ndị anyị na ha nọ oge niile Jesu nọ n’etiti anyị,

22bido n’oge Jọn na-eme mmirichukwu ruo n’ụbọchị Jesu si n’etiti anyị rịgoro n’eluigwe-

otuonye n’ime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite n’ọnwụ ya.

23“Ha họpụtara mmadụ abụọ Josef onye a na-akpọ Basabas, (nke aha nna ya bụ Jọstus),

na Matiyas.

24Ha ekpee ekpere sị, “Onyenweanyị, Gị onye maara echiche mmadụ niile, gosi anyị onye

Ị họpụtara n’ ime mmadụ abụọ ndị a

25ịnọchi ọnọdụ ije ozi nke a, na ịbụ onye ozi, nke Judas Iskarịọt hapụrụ gaba ebe ọnọdụ

kwesịrị ya.”

26Ha feere mmadụ abụọ ndị a nza. Nza ahụ mara Matịyas. Ọ banye n’otu ndị ozi iri na otu

ahụ imezu ọnụọgụgụ ha.

V. Okwu nke Osebruwa

R. Ekene diri Chukwu

ABỤỌMANA AZIZA(ABỤ: 102:1-2.11-12.19-20.AZ19)

Azịza: Onyenweanyị edotela ocheeze ya n’eluigwe.

1. Gọzie Onyenweanyị mkpụrụobi m, gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m,

echezọkwala ngọzi ya niile.(A)

2. Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị, otuahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu n’ebe

ndị na-atụrụ ya egwu nọ. Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ karịa otu

ọwụwaanyanwụ si dị anya n’ọdịda ya.(A)

3. Onyenweanyị edotela ocheeze ya n’eluigwe, Ọ na-achị ihe niile. Gọzienu

Onyewneanyị, ndị mmụọọma ya niile, unu ndị dị ike ịhụ na e dobere okwu ya.(A)

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ(1JỌN 4:11-16)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Akwụkwọ ozi Mbụ Jọn dere:

Isi Okwu: Onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-

anọgịdekwa n’ime ya.

11Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta

onwe anyị n’anya.

12O nwebighị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-

anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị.

13Otua ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihina o

nyela anyị Mmụọ ya.

14 Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela Nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke

ụwa.

15Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ Nwa Chineke, Chiineke na-ebi n’ime ya, ya onwe

ya na-ebikwa n’ime Chineke.

16Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, Chineke bụ

ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-

anọgịdekwa n’ime ya.

V. Okwu nke Osebruwa

R. Ekene diri Chukwu

MBEKU: (JỌN 14:18)

Aleluya, aleluya. Agaghị m ahapụ unu ka ndị na-enweghị nne na nna, kama, aga m

abịakwute unu, mkpụrụobi unu ga-ejuputa n’ańụrị. Aleluya.

OZIỌMA (JỌN 17:11-19)

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Isi Okwu: Ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.

11Jesu leliri anya n’eluigwe wee si,“Nna di nsọ, dokwaa ha nke ọma site n’ike nke aha gị,

ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.

12Mgbe mụ na ha nọ, edobere m ha nke ọma site n’ike nke aha gị, bụ nke ḷ nyere m.

Echekwabara m ha, ọ dịghịkwa onye ọbụla n’ime ha lara n’iyi ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyi

ahụ. Ma nke a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.

13Ugbu a, ana m alaghachikwute gị. Ana m ekwu ihe ndị a otu a m ka nọ n’ime ụwa, kaha

wee nwee ọṅụ m n’uju n’ime ha.

14Agwara m ha okwu gị, ụwa wee kpọọ ha asị, n’ihina ha abụghị ndị nke ụwa dịka mụ

onwe m na-abụghị onye nke ụwa.

15Ekpere m abụghị ka ḷ wepụ ha n’ụwa, kama ka ḷ chekwaba ha ka ha ghara ibanye na

njọ.

16Ha abụghị ndị nke ụwa, dịka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa.

17Were eziokwu gị doo ha nsọ, n’ihina okwu gị bụ eziokwu.

18Ezigala m ha n’ụwa dịka ḷ si ziga m n’ụwa.

19N’ihi ha, edoola m onwe m nsọ, ka e wee doo ha nsọ n’eziokwu”.

V. Oziọma nke Osebrụwa

R. Otito diri Gi, Kristi

EKPERE NHUNYE

O Dịnwenu, nara arịrịọ na onyinye anyị ji okwukwe e enye. Mee ka mmeme nke a dufe

anyị n’otito nke eligwe. Site na Kristi Dinwenu anyị.

UKWE ORIRI NSỌ

Nna, ana M ekpe ekpere: ka ha bụrụ otu, dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu, aleluya.

EKPERE A NATACHA ORIRI

Nụrụ olu anyị, O Chineke onye nzọputa anyị, ma nye anyị nchekwube tọrọ atọ, ka site na

ihe omimi nke a kacha nsọ ka e mee ka ụka gị zuo oke dika I mere Kristi onye bụ ịsị ụka

gị. Site na Kristi Dinwenu anyị.

7TH SUNDAY OF EASTER_MOTHERS DAY REFLECTION

That they may be One prayed by the Lord is reflective of a good mother's wishes and

prayers for her children. The lord knew that the church is growing and it is made up of

people of various personalities, languages, cultures, lifestyles, characters, orientations

and there are bound to be competitions and disagreements but variety is the spice of life.

The various personalities and gifts can be harmoniously utilized to favor the entirety of the

group. It is rooted in the philosophical concept of One and Many, Unity in Diversity. The

Mother church has always continued to pray and gather her children so that there might

be one flock and one shepherd except for the recalcitrant and unrepentant ones who

chose to be completely lost. Through her sacramental services, teachings and works, the

church strives to maintain the unity of her members, to have One Faith, One Lord.

Mothers’ homes are always miniature churches where children are born, nurtured and

groomed. "All I am and all I hope to be, I owe to my angel mother"- Abraham Lincoln. In

appreciation of his mother's work Henri de Toulouse-Lautrec says "My dear Mama, you

are definitely the hen who hatched a famous duck " May God help our mothers in the

great job they do in our homes, churches, society and the world at large and may we

appreciate them and give them back love. Happy Mothers’ Day. God Bless All Our

Mothers.

Produced by the ICC Choir.

APPRECIATION: iChristus.org-for the readings