igbo project ugwu, agatha chinelo agatha chinelo.pdf · mmet Ụta olund Ị nkan Ụ na mkp...
TRANSCRIPT
MMET ỤTA OLUND Ị NKANỤ NA MKPỌPỤTA
FỌNỊM IGBO IZUGBE N’OGO SEK ỌNDỊRỊ NTA NA ZOON MM ỤTA AGBAN Ị NA STEETI
ENUGU
SI N’AKA
UGWU, AGATHA CHINELO PG/M.Ed/10/52671
AMỤMA NCHỌCHA M.Ed. NGALABA NKA EDUKESHỌN ASỤSỤ MAHADUM
NAỊJIRỊA, NSỤKA.
ONYENLEK ỌTA: ỌKAMM ỤTA, UJU UMO
JUNE, 2014.
i
Ihu Akw ụkwọ Isiokwu
MMET ỤTA OLUND Ị NKANỤ NA MKPỌPỤTA FỌNỊM IGBO IZUGBE N’OGO SEK ỌNDỊRỊ NTA NA ZOON
MM ỤTA AGBAN Ị NA STEETI ENUGWU
ỌRỤ NCHỌCHA E DERE IJI MEJUP ỤTA ỌNỌDỤ INWETA NZERE DIGRII NKE MASTA N’AS ỤSỤ IGBO
N’EDUKESHỌN
SI N’AKA
UGWU, AGATHA CHINELO PG/M.Ed/10/52671
AMỤMA NCHỌCHA M.Ed. NGALABA NKA EDUKESH ỌN ASỤSỤ, FAKỌLTI K’EDUKESH ỌN MAHADUM NA ỊJIR ỊA,
NSỤKA.
ONYENLEK ỌTA: ỌKAMM ỤTA, UJU UMO
JUNE, 2014.
ii
NNABATA
Ndị nabatara nchọcha a n’aha Ngalaba Nka Edukeshọn Asụsụ,
Mahadum Naịjir ịa bụ:
_________________________ ____________________ ỌKAMM ỤTA, UJU UMO ỌKAMM ỤTA, UJU UMO ONYENLEK ỌTA ONYEISI NGALABA
_________________________ ____________________
DỌKT, M. OMEJE
ONYE NTỤCHA SI EBE ỌZỌ ONYE NTỤCHA NỌ EBE A (N’ỤLỌAKW ỤKWỌ A)
_________________________________ ỌKAMM ỤTA, I.K. IFELUNNI
DIIN FAK ỌLTI K’EDUKESH ỌN
iii
NTỤZIAKA
Nke a bụ iji gosipụta na UGWU, AGATHA CHINELO nwere akara
ndebanye PG/Med/10/52671 emejupụtala ọnọdụ niile kwesiri maka inweta
nzere nke digrii nke M.Ed. na Ngalaba Nka Edukeshọn Asụsụ, Mahadum
Naịjir ịa. O mejupụtara ọrụ nchọcha ya ma weta ya n’otu ogbe akwụkwọ nke
gosiri na o wetaghi ya na mpekiri na mpekiri. Ọ dighi ebe ọzọ e bipụtaworo
ọrụ a maọbụ mpaghara ụfọdụ ya maka inweta nzere diplọma maọbụ digrii
ndị ọzọ dị elu.
___________________________ _____________________ UGWU, AGATHA CHINELO ỌKAMM ỤTA, UJU UMO NWAAKW ỤKWỌ ONYENLEKỌTA
v
OZI EKELE
Ana m ekele Chukwu Okike, onye ọ bụ site n’enyemaka ya ka ihe
niile e mere na nchọcha a ji bịa n’isi njedebe n’enweghị nsogbu ọbụla. Otito
dịrị ya n’elu kasị elu.
Ana m ekele n’ụzọ pụrụ iche Ọkammụta UJU ỤMỌ maka agbamume
ya niile n’ebe m nọ, ịgụ na ịhazị ọrụ nchọcha a n’agbanyeghị ọrụ niile chere
ya n’ihu dịka onyeisi ngalaba, ka Chineke biko kwaara gị ụzọ gị niile. Ekele
m na-agara Dọkịta, M. Omeje, Dọkita, V.N. Nwachukwu, Ọkammụta, S.A.
Ezeudu na Maazị Udenwa maka mbọ ha gbara n’inyocha ngwa nchọcha a,
bịakwa gụọ ma hazie ọrụ nchọcha a mgbe e mere amụma nchọcha a. Ka
Chineke gọziere m unu n’otu n’otu. Agaghị m echefu ndị nkụzi kuziere m
maka inweta nzere M.Ed. ndị bụ Dọkịta J.U. Akabọgụ, E.N. Oluikpe, P.N.
Uzoegwu, Ọkammụta Uju Ụmọ, Ọkammụta I.U. Nwadike na Ọkammụta
C.N. Okebalama. Ka Chukwu chekwaba unu.
Ekele m na-agakwara Diin Fakọlti K’Edukeshọn Mahadum Naịjir ịa
Nsụka bụ ọkammụta I.K. Ifelunni.
Agaghị m echefukwa iburu ụkpa ekele n’ụzọ pụrụ iche bugara ọtụtụ
ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjir ịa bụ ndị nyeere m aka n’ịgbazi
na n’ịhazi ọrụ nchọcha a n’ụdị ọ ga-abụ sọ mma, ndị dịka Maazi Fabude,
Oriakụ Millicent, Oriakụ Chineke, Dọkịta Ogboji, Oriakụ Ọnwụka, Maazị
Ọnụzulike, Nwaada Obiezu, Oriakụ Nwodo, Oriakụ Okeke, Oriakụ Mba,
Amarachi na ọtụtụ ndị ọzọ. Ekpere m bụ ka Chukwu gọzie mbọ unu niile.
vi
Ekele m na-agakwara ndị ọrụ PPSMB zoon mmụta Agbanị maka inyere m
aka nye m ọnụọgụ ụmụakwụkwọ na ụlọakwụkwọ e ji mee nchọcha a. Ana m
ekelekwa ndị nkụzi ụlọakwụkwọ ndị e jiri mee nchọcha a bụ ndị nyeere m
aka kee ma nakọtakwa ngwa ọrụ nchọcha a. Ka Chineke kwụghachi unu
niile mmaji kwuru mmaji.
Ana m ekelekwa Dọkịta Ibenegbu bụ onye nyeere m aka nweta ụsa
nnwale ntụkwasịobi ngwa nchọcha a ma bụrụkwa onye nyere aka gbakọọ
rịzọlt ngwa nchọcha a. Chukwu gọzie gị. Agaghị m ahapụ ikele ndị kụrụ ọrụ
a n’igwe kọmpụta ndị bụ Emmanuella na Chinasaokwu na mbọ ha gbara
niihi na ịkụ asụsụ Igbo n’igwe kọmpụta abụghị obere ọrụ. Chukwu gọzie
unu.
Na njedebe, ụkpa ekele m na-agara ezigbo di m na ụmụaka bụ Injinịa
S.A. Ugwu bụ onye m ga-ekwupụta sị na ọ bụrụ na ahụ m niile bụrụ ọnụ
ọnụ, ọ pụghị inyecha ya ekele na nkwado ya na agbamume ya niile n’ebe m
nọ n’ụdị ọbụla iji hụ na ọrụ agụmakwụkwọ mụ a bịara n’ezi njedebe.
Chineke biko, chekwabara m ya n’ọpụpụ na mbata ya niile. Ụmụaka m bụ
Chi-baby, Kene-Chukwu, Glo-baby, Ella-nwa na Izu-baaba (Angelo), ya
dịkwara unu niile mma tinyekwara ndị enyi na ndị ikwunaibe ndị na-
enyekwa m ezi nkwado n’ụdị dị iche iche. Ka Chineke gọzie ma kwụghachi
unu niile.
Ugwu, Agatha Chinelo
vii
NDEPỤTA TEBUL
1. Tebul Nke Mbụ: Miin na Standad divieshọn na-egosi ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. - - - - - - - 44
2. Tebul Nke Abụọ: Miin na standad divieshọn na-egosi myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. - - - - - - - 46
3. Tebul Nke Atọ: Miin na standad divieshọn na-egosi etu olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe. - - - - - - - - 47
4. Tebul Nke Anọ: Miin na standad divieshọn na-egosi etu mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe. - - - - - - 48
5. Tebul Nke Ise: Miin na standad divieshọn na-egosi etu jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe .- 49
6. Tebul Nke Isii: Ndịmiche n’akara miin agbammbọ ụmuakwụkwọ dị ka o si metụta ebe ụlọakwụkwọ dị. - 50
7. Tebul Nke Asaa: Akara miin agbammbọ nnwale ụmaokwu etu jenda si emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe. - - - - - - - - 51
viii
NDỊNA
Ihuakwụkwụ bu isiokwu ......................................................................... i Nnabata…..………………………………………………………………………ii Ntụziaka…………………………………………………………………………..iii Nhunyere………………………………………………………………………….iv Ozi ekele………………………………………………………………………...…v Ndepụta tebul…………………………………………………………………….vii Ndịna …………………………………………………………………………….viii Ụmị Ederede……………………………………………………………………….x ISI NKE MB Ụ: MKPỌLITE ............................................................................1 Ntọala Nchọcha. ......................................................................................... 1 Nsogbu Nchọcha ............................................................................................10 Mbunuuche Nchọcha. ....................................................................................10 Uru Nchọcha. .................................................................................................11 Oke Nchọcha .................................................................................................13 Ajụjụ Nchọcha ...............................................................................................14 Ụma Okwu .....................................................................................................14 ISI NKE AB ỤỌ:NTỤLEGHAR Ị AGỤMAGỤ ...........................................15 Atụtụ Nkọwa ................................................................................................15
• Nkọwa Asụsụ .......................................................................................15 • Nkọwa Igbo Izugbe ..............................................................................17 • Nkọwa Olundị ......................................................................................18 • Nkọwa Fọnịm ......................................................................................20 • Nkọwa Mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị .................................................25 • Nkọwa Jenda ........................................................................................27
Atụtụ Mmụgharị ..........................................................................................28 • Atụtụ Mmekọrịta mmadụ na ibe ya , (Albert Bandura) ........................28 • Atụtụ Akparamagwa (B.F. Skinner) ....................................................30
Nchọcha a Hụrụ Anya .................................................................................31 Nchịkọta Ntụlegharị Agụmagụ ...................................................................36 ISI NKE AT Ọ:USORO NCHỌCHA ..........................................................38 Ụdị Nchọcha ..................................................................................................38 Ebe Nchọcha ..................................................................................................39 Ndị A ga-e ji Mee nchọcha ............................................................................39 Nsere na Usoro Nsere .....................................................................................39 Ngwa Nchọcha ...............................................................................................40 Nnyocha Ngwa Nchọcha ................................................................................41 Nnwale Ntụkwasịobi Ngwa Nchọcha .............................................................41
ix
Usoro Nnweta Data .........................................................................................42 Usoro Nhazi Data ...........................................................................................42 ISI NKE ANỌ: RIZỌLT - - - - - - - 44 Ajụjụ Nchọcha nke Mbụ - - - - - - - 44 Ajụjụ Nchọcha Nke Abụọ - - - - - - - 45 Ajụjụ Nchọcha Nke Atọ - - - - - - - 47 Ajụjụ Nchọcha nke Anọ - - - - - - - 48 Ajụjụ Nchọcha Nke Ise - - - - - - - 49 Nnwale Ụmaokwu Nke Mbụ (HO1) site n’iji T-test - - - 50 Nnwale Ụmaokwu nke Abụọ - - - - - - - 51 Nchịkọta Ihe A Chọpụtara - - - - - - - 52 ISI NKE ISE: NKATA, MMECHI, IHE ND Ị NWERE IKE ỊDAPỤTA NA MMỤTA N’ỌDỊNIHU, AT ỤMAT Ụ/NTỤNYEUCHE, NSOGBU E ZUTERE NA NCHỌCHA, EBE NDỊ ỌZỌ KWESIRI IMEKWU NCH ỌCHA, NCHỊKỌTA Nkata Maka Rizọlt - - - - - - - - 53 Ihe Ndị Nwere Ike Ịdapụta na Mmụta N’ọdịnihu - - - - 58 Nsogbu E Zutere Na Nchọcha - - - - - - - 59 Ntụnyeuche/Atụmatụ - - - - - - - - 60 Ebe Ndị Kwesiri Imekwu Nchọcha - - - - - - 61 Nchịkọta - - - - - - - - - - 61 Nrụtụaka .......................................................................................................63
Apendiiks nke mbụ: Ajụjụ Mkpọpụta na Ndepụta ……………………...67
Ngwa Nchọcha ...............................................................................................
Apendiiks nke abụọ: Nnyocha Ngwa Nchọcha ........................................
Apendiiks nke atọ: Nnwale Ntụkwasịobi Ngwa Nchọcha ........................
x
ỤMỊ EDEREDE
Isiokwu nchọcha a bụ mmetụta olundị Nkanụ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta na zoon mmụta Agbanị na steeti Enugwu. Asụsụ bụ ihe bara uru nke ukwu na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ ọdịnaala atọ Gọvụmentị ala Naịjir ịa kwadoro ka a na-akụzi n’ụlọakwụkwọ dị iche iche na Naịjir ịa. Asụsụ ndị ahụ bụ; Hausa, Igbo na Yoruba. Ụtọasụsụ so n’alaka ihe ọmụmụ asụsụ Igbo. N’otu aka ahụ fọnịm bụkwa alaka ụtọasụsụ. Ihe gbasara fọnịm (mkpụrụụdaasụsụ) bụụrụ ụmụakwụkwọ nsogbu (onyeisi ule WAEC 2007, 2008, 2009). Ọ bụ nke a mere onye nchọcha ji bagide ime nchọcha a iji chọpụta etu olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe. Onye nchọcha guzobere ajụjụ nchọcha ise nke dabeere na mbunuche nchọcha a tinyere ụmaokwu abụọ. Ụdị nka nchọcha e ji mee nchọcha a bụ nke ‘Expost-Facto’. Ọnụọgụ e ji mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ dị puku anọ, nari ise na iri isii (4, 560), ụmụakwụkwọ dị nari anọ, iri ise na isii (456) site n’ọnụọgụ nchọcha a. Ngwa e ji mee nchọcha a bụ Nnwale Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta na Odide Fọnịm Igbo Izugbe (NMONMOFII) nke onye nchọcha ji aka ya mepụta n’ajụjụ ederede njụmaza. Onye nchọcha nwetara ngwa ọrụ ya site n’inye ụmụakwụkwọ okwu ndị ha kpọpụtara tinyere ajụjụ ederede njụmaza. Ọ bụ akara miin 2.5 bụ ọnọdụ mkpebi miin ndị dabara na nchọcha a nke pụtara na ọ bụ miin na Standad Divieshọn ka e ji tụcha/hazie data. Nchọpụta nchọcha a gosiri na olundị Nkanụ na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe; jenda na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta na odide Igbo Izugbe. Site na nchọpụta nchọcha a, onye nchọcha na-atụnye uche na ndị nkụzi ga-agba mbọ were naanị fọnịm Igbo Izugbe na-akụzị ihe; o kwesiri ka gọvụmentị hụ na ọ bụ naanị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma n’ọmụmụ asụsụ Igbo na-akụzi ya n’ụlọakwụkwọ, tinyere na o kwesiri ka gọvụmentị na-enye ndị nkụzi nọ n’ime obodo emepeghi emepe ihe onyinye agbamume.
1
ISI NKE MB Ụ
MKPỌLITE
Ntọala Nchọcha
Asụsụ bụ ihe bara uru nke ukwu na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Asụsụ bụ iji mkpụrụokwu nwegasịrị nghọta ndị e nwere ike ịsụ asụ, dee ede
maọbụ gụọ agụọ mee ka a mata ebumnobi mmadụ.
Ọ bụ naanị mmadụ nwere ike ịsụ asụsụ n’ụdị doro anya nke e nwere
ike iji okwu ọnụ sụọ, dee ede ma gụọkwa agụọ. Ọ bụ eziokwu na ụmụ
anụmanụ dị iche iche nwere ụzọ dị iche iche ha si ezirita onwe ha ozi, mana
nke ahụ niile abụghị asụsụ. Ọ bụ naanị mmadụ ka a maara dị ka ihe na-asụ
asụsụ n’ụwa. N’otu aka ahụ kwa, Farinde (2005) kwadoro na asụsụ bụ
nnukwu ihe bara oke uru mmadụ jiri dị elu karịa anụ ọzọ dị iche iche.
Ọ bụ niihi uru dị iche iche ndị a asụsụ bara ka Gọvụmenti Naịjir ịa ji
kwado amụmamụ asụsụ nke ukwuu. Asụsụ Igbo bụ otu n’ime asụsụ a ma
ama na Naịjir ịa nke mere gọvụmenti etiti ala Naịjir ịa ji gụnye ya n’ime
asụsụ ọdịnaala Naịjir ịa ndị gụnyere: asụsụ Igbo, asụsụ Awụsa na asụsụ
Yoruba nke nwata ọbụla ga-amụrịrị otu n’ime ha tinyere asụsụ aranne maka
ọdịmma na ịdịko n’otu ala Naịjir ịa. Nke a pụtara ihe ma doo anya
n’akwụkwọ National Policy on Education N.P.E (2004) n’olu Bekee.
O nweghị asụsụ na-apụta kwụụrụ onwe ya ma o nweghị mkpụrụụda dị
iche iche e jikoro ọnụ wee mebe ya. Ọ bụ mkpụrụụda ndị a na-emebe ihe
niile dị n’asụsụ. Mkpụrụụda ndị mebere asụsụ nke na-eweta nghọta pụrụ
1
2
iche n’asụsụ a na-anụ ka a na-akpọ Fonịm. Ọ bụ fọnịm na-eweta ndịiche
n’ebe oluasụsụ dị iche iche nọ.
N’ebe asụsụ dị, fọnịm bụ nnukwu ihe dị mkpa niihi na ọ bụ ha ka e ji
emebe mkpụrụokwu dị na asụsụ ahụ. Nke a mere o ji dị mkpa na onye ọbụla
na-amụ asụsụ ga-amatarịrị fọnịm maọbụ mkpụrụụdaasụsụ dị n’asụsụ ahụ
nke ọma, marakwa ka nke ọbụla si ada, otu e si e ji ha emepụta mkpụrụokwu
na iwu a na-agbaso maka ime nke a. Dika Ngoesi (2000) si kwuo, fọnịm dị
ka azịza, ha pere mpe, ma a ga-achọrịrị ha mgbe a chọrọ imebe okwu dị iche
iche dịka e si achọ azịza kwa ụtụtụ. Ebe ọ bụ na e nwekebeghị ndị gbadoro
ụkwụ n’ọmụmụ fọnịm, ọ dị mkpa na e mere nchọcha tọrọatọ iji chọpụta ma
e nwere ndịiche dị na ka fọnịm olundị Nkanụ si emetụta mkpọpụta fọnịm
nke Igbo Izugbe n’ebe ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na ndị
nọ n’obodo emepeghị emepe nọ.
Anozie (1999) kọwara fọnịm dịka ụdaasụsụ ahụ nke na-ebute nghọta
dị iche iche na mkpụrụokwu abụọ maọbụ karịa bụ ndị yiri onwe ha ma e
wezuga otu mkpụrụụda ndị ahụ. Anagbogu, Mba na Eme (2001) nyere
ọmụmaatụ ndị a ka nkọwa fọnịm doo anya nke ọma.
⁄ áká ⁄ ‘hand’
⁄ átá ⁄ ‘weed’
Ha kwuru na ⁄ k ⁄ na ⁄ t ⁄ bụcha fọnịm ebe ọ bụ na ha butere ndịiche
n’okwu ndị a.
3
Fọnọlọjị bụ ngalaba lingwistiiks na-amụ maka fọnịm. Ọ bụghị naanị
maka fọnịm ka ọ na-amụ, ọ na-amụkwa ndịiche n’ụdaolu, ogoolu na ọtụtụ
ihe ndị ọzọ gbasara ụda dị n’asụsụ, mana ebe onye nchọcha hụtakarịrị dịka
ihe na-emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo nke ukwu bụ n’ihe gbasara fọnịm. Ọ ka
na-agbogwoju onye nchọcha anya ihe mere na anaghị anabata olundị
n’ọmụmụ asụsụ Igbo nke na-ebute nnukwu ọgbatauhie na ya bụ ngalaba.
Ka o sila dị, asụsụ Igbo nwere olu dị iche iche e ji asụ ya nke a kpọrọ
olundị. Olundị n’asụsụ Igbo bụ olu dị iche iche, obodo dị iche iche n’ ala
Igbo ji asụ asụsụ Igbo. Iji maa atụ, asụsụ Igbo nwere olu Ọnịcha, Owere,
Ịka, Anịocha, Ụkwuanị, Nsụka, Udi, Nkanụ, Abakeleke, Ibeku wee dịrị
gaba. Nke a na-egosi na a na-enwetakwa ọtụtụ olundị n’ime otu steeti. Iji
maa atụ, Ikekọnwụ (1986) chọpụtara na e nwere ogbe olundị isii na
mpaghara Igbo ndị dị n’Ugwu nke gụnyere Nsụka, Enugwu, Udi, Ọgwụ,
Achị na Izii. E lee anya n’olundị ndị a, a ga-aghọta na olundị Nsụka, Udi,
Ọgwụ na Achị bụ na steeti Enugwu ka ha si pụta. Dịka Ngoesi (2000) si
kwuo, olundi ndị a dị iche iche mere ka ọ na-esiri ndị si n’otu mpaghara ala
Igbo ike ịghọtagbado ihe ndị si na mpaghara ọzọ na-asụ.
Olundi ndị a mekwara ka asụsụ Igbo na-agbagwoju anya na-
ahịakwara onye abụghị onye Igbo ahụ ịghọta, mana e sila n’olundi ndị a
wepụta olu jikọrọ Igbo dum ọnụ nke a kpọrọ Igbo Izugbe, iji belata nsogbu
a. Ọ bụ Igbo Izugbe ka e ji ede akwụkwọ Igbo dị iche iche ugbu a, were ya
na-akụzi ihe ma na-agbasa ozi. Igbo Izugbe bụ asụsụ e sitere n’olundị dị iche
4
iche wee wepụta nke a tụrụ anya na onye Igbo ọbụla ga na-aghọta (SPILC,
1977). A na-enweta okwu dị iche iche n’Igbo Izugbe site n’ịgbanwe ọtụtụ
mkpụrụụda na mkpụrụokwu dị iche iche sitere n’olundị. Ngoesi (2000)
kọwara na a chọọ ịgbanwe olundi ka ọ bụrụ Igbo Izugbe, ebe ụfọdụ a ga-
agbanwe bụ ebe ndị a:
A ga-agbanwe /l/ ka ọ bụrụ /r/ dịka :
Olundi Igbo Izugbe
mmili mmiri
ọ bụlụ ọ bụrụ
A ga-agbanwe /n/ ka ọ bụrụ /l/ dịka:
Olundi Igbo Izugbe
enu elu
ana ala
A ga-agbanwe /f/ ka ọ bụrụ /h/ dịka:
Olundi Igbo Izugbe
afịa ahịa
afịfịa ahịhịa
Ọtụtụ mkpụrụụda ka o depụtara dịka ihe a ga-agbanwe iji nweta Igbo
Izugbe. Ọ bụ mgbanwe ndị a na-ebute ndịiche n’olundị na Igbo Izugbe. Ụdị
nsogbu dị etu a ka a na-akpọ nsogbu fọnọlọji. Ọ bụghị naani ụdị nsogbu
olundị a ka a na-enwe n’ọmụmụ asụsụ. E nwekwara nsogbu ndị ọzọ dịka
nsogbu mọfọlọji, nsogbu sintaks, mana nke kacha kpalie mmụọ onye
nchọcha bụ nsogbu nke fọnọlọji mere onye nchọcha jiri họrọ ya site n’iwere
olundị Nkanụ wee chọpụta ka olundị a si emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo ma
5
werekwa fọnịm mere ebe mgbado ụkwụ. O teela e bidoro nwebe ụdị nsogbu
a n’ọmụmụ asụsụ Igbo.
N’oge gara aga, ọtụtụ ụmụ Afr ịka a maara dị ka ndị ụbụrụ ha na-anụ
ọkụ enweela ndọrọndọrọ pụtara ihe gbasara ihe ga-abụ asụsụ a ga-e ji na-ede
agụmagụ n’Igbo. Dị ka e si mara, ọ bụ Igbo Izugbe ka e ji akụzi asụsụ
n’Igbo n’ogo ụlọakwụkwọ dị iche iche. Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ jiri
kọwaa asụsụ Izugbe dị ka asụsụ ndị gụrụ Igbo. N’agbanyeghị nke a,
mbunuuche ọtụtụ ndị mmadụ bụ na olundị anaghị enwecha ndịiche ọ na-
enweta na nghọta Igbo Izugbe n’ebe ndị gụrụ Igbo nọ.
N’ ịga n’ihu, oge ụfọdụ ka ọ na-abụ ụmụakwụkwọ na-ekwu okwu na
klaasị tụmadụ na-ede ederede dị iche iche, ha a na-ewebata olundị na ya
niihi na Igbo Izugbe amaghị ha ahụ. Nke a na-apụtakarị ihe ọ kachasị n’ebe
ụmụaka na-aga akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ dị iche iche a rụnyere n’ime obodo
nọ.
Mgbe ụmụakwụkwọ dị etu a na-ewebata olundị a n’ọmụmụ asụsụ
Igbo Izugbe, ọtụtụ ndị nkuzi na- agbarụrụ ha ihu nke na-ebutere ha ọdịda
ọtụtụ oge. Iji gbaa akaebe maka nke a, ọtụtụ mgbe ka ndị isi ule dị iche iche
na-arụtụ aka n’ọdịda ụmụakwụkwọ site n’iji olundị wee na-enye ọsịsa ajụjụ
e nyere ha hapụ iji Igbo Izugbe. Akaebe ọzọ ha na-agba bụ na ụmụakwụkwọ
anaghị emeta nke ọma n’ihe gbasara fonịm bụ nke a na-amụ n’ihe ọmụmụ
ọdịdịụdaasụsụ. N’afọ 1999, onyeisi ule WAEC kwuru na ụmụakwụkwọ
emetaghị nke ọma n’ule niihi na ha jiri olundị ha nye ọsịsa ajụjụ e nyere ha
6
kama iji Igbo Izugbe. N’afọ 2000, onyeisi ule WAEC kwukwara na otu ihe
mere ụmụakwụkwọ jiri mee nke qma n’ule bụ na ihe karịrị pasenti iri asatọ
(80%) jiri Igbo Izugbe dee ọsịsa ajụjụ a jụrụ ha n’ ewebataghị olundị. Nke a
na-egosi na ọ bụru na ha webatara olundị n’asịsa ha, ha akaghị imeta nke
ọma n’ule ahụ ebe ọ bụ na iwebata olundị so na ntụ e ji akagbu ihe
ụmụakwụkwọ dere. N’ebe a, ihe na-agbagwoju onye nchọcha anya abụghị
na echiche adịghị n’ihe ha dere kama na ha gwakọrọ olundị na Igbo Izugbe.
A bịa n’ihe gbasara imeta nke ọma n’ọdịdịụdaasụsụ, ọtụtụ mgbe ka
onyeisi ule a na-arụtụ aka n’ihe butere ọdịda ụmụakwụkwọ site n’emeghị
nke ọma n’ihe ọmụmụ ọdịdị ụdaasụsụ. Onyeisi ule WAEC (2002) gbara
akaebe na ụmụakwụkwọ emeghị nke ọma n’ajụjụ nke atọ e nyere ha n’ule.
O kwuru na a tụrụ anya ka ụmụakwụkwọ gosipụta ebe mkpọpụta fọnịm
maọbụ mkpụrụụdaasụsụ ndị a: /m/, /p/, /b /, /f/, /n/, ma ndị zara ajụjụ a
ebughị ibu niihi na isiokwu a eteela o bidoro bụụrụ ụmụakwụkwọ nnukwu
nsogbu.
N’ otu aka ahụ kwa, Ude (2012), ziputara otu ihe a site n’ikwu si:
Onyeisi ule WAEC (2003) kọwapụtara na ọtụtụ ụmụakwụkwo agharala ụzọ tinye isi n’ọhịa, na ha dere ihe enweghị isi n’ajụjụ metụtara sistem ụda\ ụdaasụsụ nke gosiri na ha aghọtaghị titimbọrịmbọ maọbụ ihe a chọrọ ka ha mee n’ajụjụ ahụ. Ihe nke a na-egosi bụ na ụmụakwụkwọ amaghị ihe ụdaasụsụ na fọnọlọji Igbo Izugbe bụ. O nwere ike bụrụ amaghị ụdaasụsụ Igbo Izugbe mere na ụmụakwụkwọ anaghị eme nke ọma n’ule Igbo dị iche iche ọ kachasị n’ihe gbasara fọnọlọji. (p.5).
7
N’ịga n’ihu, akaebe ọzọ sitere n’aka onyeisi ule WAEC (2007)
zipụtara na ọtụtụ ụmụakwụkwọ azaghị ajụjụ nke abụọ metụtara ụdaasụsụ
niihi na ọ dị ka a ga-asị na ha aghọtaghị ihe gbasara ụdaasụsụ. Ọzọ kwa,
onyeisi ule WAEC (2008) gosikwara na ọtụtụ ụmụakwụkwọ gosiri na ha
amaghị ihe bụ ụdaasụsụ ma ncha. Onyeisi ule WAEC (2009) n’otu aka ahụ
kwa, ziputara na ụmụakwụkwọ emeghị nke ọma etu o kwesiri maka na ha
enweghi ike ịkọwa ihe a jụrụ ha na mkpụrụụdaasụsụ /m/ na /n/. N’uche onye
nchọcha, o nwere ike bụrụ na ihe na-ebutere ụmụakwụkwọ ihe mgbagwoju
anya n’ihe ọmụmụ ọdịdiụdaasụsụ bụ mmetụta olundị ha n’ihe ọmụmụ asụsụ
Igbo Izugbe niihi na a na-enwetakarị ndịiche n’odide n’ebe olundị na Igbo
Izugbe nọ. Ọmụmaatụ ndị a zipụtara nke a nke ọma:
Olundị Nkanụ Igbo Izugbe Woke /woke/ Nwoke /ŋwoke/ Waayị /wayị/ nwaanyị /ŋwaaлị / Oye /oye/ onye /oлe/ Iye /iye/ ihe /ihe/ Ewhọ /ewh כ / afọ /af כ / Eka /eka/ aka /àka/ Eya /eya/ anya / aлa/ Onye nchọcha ga-eme nchọcha chọpụta etu jenda nakwa mpaghara
ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ nwere ike isi metụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ
asụsụ Igbo Izugbe. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị emeela nchọcha banyere jenda
na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ mana e nwegbeghi mkpebi iji kwuo
maọbụ ndị nwoke ka ọ bụ ndị ka emeta nke ọma n’ọmụmụ Igbo Izugbe
8
maọbụ ụmụakwụkwọ ndị n’obodo mepere emepe ka ọ bụ ndị nọ n’obodo
emepeghị emepe ka emeta nke ọma n’ọmụmụ Igbo Izugbe. Ntumi (1983)
gara n‘ihu kwuo na ndịiche dị na mpaghara ebe ụlọ akwụkwo na-apụta ihe
na nka mmụta asụsụ ha. Ọbasị (2011) kọwara na ọ bụrụla ihe a maara ama
na ụlọakwụkwọ ndị nọ n‘obodo mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa
ndị nọ n’obodo emepeghị emepe niihi na, a na-enwe ndị nkuzi a zụrụ nke
ọma na ngwa nkuzi ndị ọzọ n’obodo mepere emepe karịa n’obodo emepeghị
emepe. Ọ bụkwa otu ihe a ka Umo (2001) na-akwado mgbe o kwuru na
ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa ndị
nọ n’obodo emepeghị emepe n’ọmụmụ asụsụ Igbo.
Jenda bụ ọnọdụ ịbụ oke maọbụ nwaanyị dị ka o si gbasata mmadụ.
Onye nchọcha ga-eleba anya chọpụta ka ọ bụ ndị nwoke ka ọ bụ ndị nwanyị
ka eme nke ọma n’ọmụmụ asụsụ. Nkọwa niile ndị a na-egosi na jenda na-
emetuta ihe ọmụmụ dị iche iche. Ka o sila dị, o nwebeghị nchọcha rụtụrụ
aka n’ihe ọmụmụ gbasara jenda na fọnịm olundị Nkanụ. Nke a mere o ji dị
mkpa ime nchọcha a iji mata ma fọnịm olundị Nkanụ ọ ka emetụta
ụmụakwụkwọ ndị nwoke ka ọ bụ ndị nwaanyị na mkpọpụta fọnịm Igbo
Izugbe. Wale (1999) n’aka nke ya chọpụtara na ụmụ nwaanyị na-enwe
mmasị n’asụsụ mba ọzọ ma a bịa n’ihe gbasara asụsụ karịa ndị nwoke. Umo
(2001) hụtakwara na a bịa n’ihe gbasara aghọtaazaa na nkọwa n’asụsụ
ọbụla, nkwenye ndị mmadụ na-egosi na ụmụnwaanyị na-enwekarị mmụọ
ịmụ asụsụ karịa ụmụ nwoke. Akabogu (2002) gosiri na ụmụakwụkwọ ndị
9
nwaanyị na-amụtakarị asụsụ ọsọọsọ karịa ndị nwoke mgbe o kwuru sị na
ndịiche na jenda bụ otu ụzọ pụtakarịrị ihe e si egosipụta na ndị nwaanyị ka
eme nke ọma n’ịmụ asụsụ dị iche iche karịa ndị nwoke n’ụlọakwụkwọ.
Mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na-elegara anya n’ụlọakwụkwọ
ndị a rụnyere n’ime obodo nakwa ndị a rụnyere n’obodo ndị mepere emepe.
Onye nchọcha chọrọ iji mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị mee nchọcha iji wee
chọpụta ka ọ bụ ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ime obodo ka emeta nke ọma
n’ọmụmụ asụsụ ka ọ bụ ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na
zoon mmụta Agbanị na Steet Enugu.
Ọzọ bụ na ọ bụghị naanị ụmụakwụkwọ ka ihe gbasara fọnịm na-enye
nsogbu. Ọ na-ahịakwara ọtụtụ ndị na-akuzi Igbo ahụ ịghọta na ikuzi ya. Ebe
ọ bụ na ụfọdụ ndị nkuzi amaghị ụdaasụsụ nke ọma, keduzi ka ụmụakwụkwọ
ga-esi mụta ihe akuzighị ha. Onyeisi ule WAEC (2004) mere ka a mata nke
a site n’ikwu na ụmụakwụkwọ emetaghị nke ọma ma ọlị n’ajụjụ gbasara
ụdaasụsụ/system ụda niihi na eleghịanya, ọ bụrụ na ndị nkuzi ha aghọtaghị
ya bụ alaka ihe ọmụmụ asụsụ Igbo.
Ọzọ kwa bụ na iwebata fọnịm olundị nwere ike bute ndịiche na nsupe
mkpụrụokwu mana ndịiche anaghị adịcha na nghọta ọ na-enwe. Ọ bụ ihe
niile ndị a mere onye nchọcha jiri nwee mmasị ime nchọcha banyere
mmetụta olundị Nkanụ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta
na zoonu mmụta Agbanị na Steeti Enugwu.
10
Nsogbu Nchọcha
Ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-abụ ha na-ede ihe maọbụ na-aza ajụjụ na
klaasị, ha ana-ewebata olundị ha na ya. Ọtụtụ ndị nkuzi tụmadị ndị na-
amaakị ule na-agbarụ ihu ma ha hụ ihe dị etu a. Nke a mere na ụfọdụ n’ime
ha anaghị etinye uchu ịmata ebumnuuche ụdị ụmụakwụkwọ a. Ha na-akagbu
ihe ha dere n’otu ntabi anya nke na-ebutere ọtụtụ n’ime ha ọdịda.
N’aka nke ọzọ, onyeisi ule WAEC (1999,2000,2002,2004,2007,2008,
2009) kọwara na ụmụakwụkwọ anaghị emeta nke ọma na mmụta asụsụ niihi
na ha na-agwakọrịta olundị na Igbo Izugbe tinyekwara amaghị akpọpụta
mkpụrụụdaasụsụ Igbo izugbe etu o kwesiri. Ọtụtụ n’ime ha amaghị ede
ederede ọbụla, nke ha ji ama agụ ihe ọbụla e dere n’asụsụ Igbo. Onye nkuzi
jụọ ajụjụ ọnụ na klaasị, ọtụtụ anaghị enwe mmasị ịsa ajụjụ ahụ niihi amaghị
asụ Igbo Izugbe. Nke a wee kpalite onye nchọcha ịmata ka olundị Nkanụ si
emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm maọbụ mkpụrụụdaasụsụ Igbo
Izugbe n’ogo sekọndịrị nta na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugu.
Mbunuuche Nchọcha
Mbunuuche izugbe nchọcha a bụ ileba anya na mmetụta olundị Nkanụ
na Mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta na Zoon Mmụta
Agbanị na Steeti Enugu.
Nchọcha a ga-elebazi anya n’ihe ndị a kpọmkwem.
a. Ịchọpụta ndịiche dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe.
11
b. Ịchọpụta myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe.
c. Ịmata ma o nwere ka olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’odide
Igbo Izugbe.
d. Ịchọpụta ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe.
e. Ileba anya ka jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo
Izugbe.
Uru Nchọcha
Ndị nchọcha a ga-abara uru gụnyere ụmụ akwụkwọ, ndị nkuzi asụsụ
Igbo, ndị gọvụmenti, ndị nhazi kọrịkulum, ụlọakwụkwọ dị elu na ndị odee
akwụkwọ Igbo. Ụmụakwụkwọ ga-erite uru na nchọcha a niihi na ọ ga-
atụpụtara ha ndịiche dị n’etiti fọnịm olundị na nke Igbo Izugbe nke ga-eme
ka ha buru n’uche na e nwere fọnịm olundị dị iche iche na fọnịm nke Igbo
Izugbe. Nchọcha a ga-enyere ha aka mee ka ha na-akpọpụta ụdaasụsụ Igbo
Izugbe etu a tụrụ anya n’aka ha. Nchọcha a ga-emekwa ka ụmụakwụkwọ na-
asụ asụsụ Igbo ma na-edekwa asụsụ Igbo nke ọma n’ụlọakwụkwọ n’ule
asụsụ Igbo dị iche iche. Nke a ga- adị ire site n’ịchịkọbara ha asọmpi
agụmagụ na edemede nke olundị ha agaghị abata na ya.
Ọzọ kwa, ndị nkuzi asụsụ Igbo ga-erite uru na nchọcha a. Ha ga-
amata na olundị na emetụta ọmụmụ asụsụ Izugbe. Nke a ga-eme ka ha jisie
ike were fọnịm asụsụ Igbo Izugbe na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe na klaasị, ka
12
ụmụakwụkwọ kwụsị ịhụta ngalaba ụdaasụsụ a dịka ihe siri ike. Ndị nkuzi
ga-abawanye na mmụta ha maọbụrụ na a chịkọbara ha ọgbakọ Izugbe nke
isiokwu ya ga-abụ, mmetụta fọnịm olundị dị iche iche n’ọmụmụ asụsụ Igbo
Izugbe.
N’ịga n’ihu, ndị ọzọ ga-erite uru bụ ndị gọvụmenti. Nchọcha a ga-eme
ka gọvụmenti ghọta na ụfọdụ ndị nkuzi n’onwe ha na-eri mperi n’ihe
gbasara ụdaasụsụ. Nke a ga-eme ka ha na-eziga ndị nkuzi a zụrụ nke ọma
n’asụsụ Igbo Izugbe n’ụlọakwụkwọ gọvụmenti dị iche iche.
A tụrụ anya na ndị ọzọ ga-erite uru na nchọcha a bụ ndị nhazi
kọrịkulum Igbo. Ha ga-erite uru site n’ịghọta na fọnịm olundị na-emetụta
ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe. Nke a ga-eme ka ha lebaa anya ma hazie nka na
usoro ndị nkuzi ga-e ji na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ọmụmụ gbasara
ụdaasụsụ Igbo Izugbe n’ụdị ụmụakwụkwọ ga na-enwe mmasị n’ihe ọmụmụ
gbasara ụda. Nke a ga-adị ire site n’ịchịkọbara ha ọzụzụ Izugbe maka nhazi
kọrịkulum Igbo n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị nke ga-agbado ụkwụ n’ihe gbasara
olundị, Igbo Izugbe na mkpụrụụdaasụsụ.
Ndị ọzọ ga-erite uru gụnyere ụlọakwụkwọ dị elu dị iche iche. A tụrụ
anya na ụlọakwụkwọ dị elu dị iche iche, ndị nke gọvụmenti na ndị kwụụrụ
onwe ha, ga-erite uru na nchọcha a niihi na ọtụtụ mgbe ka ụfọdụ
ụlọakwụkwọ anaghị enweta ọtụtụ ndị ga-agụ akwụkwọ na ngalaba asụsụ
Igbo, niihi na ọtụtụ ụmụakwụkwọ anaghi emeta nke ọma n’ule WAEC nke
ga-eduba ha na ngalaba ihe ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ dị elu. Site
13
n’ịchịkọba asọmpi dị iche iche gbasara ọsụsụ na odide asụsụ Igbo Izugbe, ọ
ga-eme ka ụmụakwụkwọ na-emeta nke ọma n’ule WAEC nke ga-eme ka ha
nweta ohere agụmakwụkwọ na ngalaba ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ
dị elu.
Ndị ọzọ ga-erite uru na nchọcha a bụ ndị odee akwụkwọ Igbo. Uru a
ga-aka baara ndị odee akwụkwọ ụtọasụsụ Igbo niihi na nchọcha a ga-eme ka
ha mata na ụtọasụsụ na-esiri ụmụakwụkwọ ike. Nke ga-eme ka ha leba anya
na nka ederede ha ma dee ụtọasụsụ etu ọ ga ekwe ụmụakwụkwọ na ndị
nkuzi ịghọta. Nchọcha a ga-enye aka mee ka ndị odee ghara iji olundị na-ede
ederede niihi na nke a anaghị akwalite ọmụmụ asụsu Izugbe ma mee ka ndị
odee akwụkwọ Igbo jiri asụsụ Igbo Izugbe na-ede akwụkwọ maka ezi
nkwalite ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị ala anyị
Naịjir ịa, ọkachasị na Zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu.
Oke Nchọcha
Nchọcha a jedebere n’ogo sekọndịrị nta nke abụọ ndị dị na Zoon
Mmụta Agbanị na Steeti Enugwu.
Ọ gbadoro ụkwụ na mkpụrụụdaasụsụ iji mata mmetụta olundị Nkanụ
nwere n’ịkpọpụta na odide mkpụrụụdaasụsụ Igbo Izugbe. Ọ ga-elebakwuazi
anya n’ịchọpụta ndịiche na myiri dị iche iche dị na mkpọpụta
mkpụrụụdaasụsụ olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe iji mata ka
mkpụrụụdaasụsụ olundị a si emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe ọ kachasị
n’ịkpọpụta na n’odide asụsụ Igbo Izugbe n’ebe ụmụakwụkwọ nọ.
14
Nchọcha a ga-aga n’ihu chọpụta ka jenda na mpaghara ebe
ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe.
Aj ụjụ Nchọcha
Ajụjụ ndị a ga-enye aka duzie nchọcha a:
1. Kedu ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
2. Olee myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
3. Kedu ka olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’ odide Igbo Izugbe?
4. Olee ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta dị na zoon mmụta
Agbanị na Steeti Enugwu?
5. Kedu ka jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe
n’ogo sekọndịrị nta dị na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu?
Ụma Okwu
A ga-anwale ụma okwu ndịa n’ogo akara mpụtara ndịmiche bụ 0.05.
Ho1 Enweghị ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ nọ
n’ime obodo na nke ndị nọ n’obodo mepere emepe n’ịkpọpụta fọnịm
Igbo Izugbe.
Ho2 Enweghị ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị
nwoke na ndị nwaanyị n’ịkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe.
15
ISI NKE AB ỤỌ
NTỤLEGHAR Ị AGỤMAGỤ
Usoro isiokwu ndị a ka onye nchọcha gbasoro wee hazie isi nke abụọ a.
Atụtụ Nkọwa
• Nkọwa Asụsụ
• Nkọwa Igbo Izugbe
• Nkọwa Olundị
• Nkọwa Fọnịm
• Nkọwa Mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị
• Nkọwa Jenda
Atụtụ Mmụgharị
• Atụtụ Mmekọrịta mmadụ na ibe ya , (Albert Bandura)
• Atụtụ Akparamagwa (B.F. Skinner)
Nchọcha a Hụrụ Anya
Nchịkọta Ntụlegharị Agụmagụ
Nkọwa Asụsụ
Asụsụ bụ otu ihe kacha mkpa n’akparamagwa mmadụ, ọ kacha na
mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Asụsụ bụ okwu e kwuru ekwu maọbụ e dere
ede nke nwere nghọta mmadụ na ibe ya ji amata ebumnuche onwe ha. Asụsụ
bụ naanị mmadụ na-asụ ya. Anụmanụ ndị ọzọ anaghị asụ asụsụ kama, ha
nwere ike ime mkpọtụ dị iche iche iji gosi ebumnobi ha. Nkịta nwere ike
igbọ ụja mgbe ọ hụrụ mmụọ maọbụ onye ọ maghị. N’otu aka ahụ kwa, ewu
15
16
nwere ike ibe maáa iji gosi na agụụ na-agụ ya mana nke ahụ niile abụghị
asụsụ. Ọ bụ sọọsọ mmadụ na-asụ asụsụ.
Ndị odee na ndị ọkachamara dị iche iche akọwaala asụsụ n’ụzọ dị iche
iche dị ka ha siri hụ ya, mana nkọwa ha niile kwadoro na asụsụ bụ naanị nke
mmadụ. Williams (2001) hụrụ asụsụ dị ka otu n’ime omenala nke e si n’ime
ya akọwa ihe omenala bụ. Ọ gara n’ihu kwuo na asụsụ bụ mgbọrọgwụ
maọbụ nnukwu ihe dị mkpa mmadụ na ibe ya ji emekọrịta, ekwukọrịta, ama
ihe na-aga maọbụ echiche dị mmadụ n’obi. Nke a na-egosipụtakwa na asụsụ
na- ezipụta ebumnobi mmadụ ma na-enyekwa aka na mmekọrịta dị n’etiti
mmadụ na ibe ya. O zipụtakwara asụsụ dịka ihe dị n’omenala ndị. Brooks
(2006) kọwara na asụsụ bụ ihe a na-amụ n’usoro mkpụrụ edide nke jikọtara
ndị mmadụ n’usoro omenala. Farinde (2005) hụrụ asụsụ dị ka ihe nrịbaama e
jiri mara obodo, agbụrụ maọbụ ụwa mmadụ nọ, nke bụ nnukwu ihe mmadụ
jiri karịa anụ ndị ọzọ e kere eke n’ụwa. Nke a na-egosi na asụsụ bụ nke
mmadụ ma zipụtakwa asụsụ n’ụzọ doro anya dị ka ihe e ji amata ebe onye si
pụta.
Ewelum (2010) kọwakwara asụsụ dị ka ihe e ji amata ebe onye siri pụta
mgbe o kwuru:
Asụsụ Igbo bụ ihe e ji amata onye bụ onye Igbo kpọmkwem. Asụsụ Igbo bụ ihe na-e jikọ mmekọrịta mmadu na ibe ya, ikuziri ụmụaka ihe bụ omenala maọbụ igwu egwu ọnwa. Asụsụ Igbo dị mkpa niihi na e wezuga asụsụ o nweghị onye ga-asị na onye a bụ onye ebe a maọbụ agbụrụ onye siripụta (p.4)
17
Anozie (1999) kọwara na asụsụ bụ ụda nke sitere n’olu mmadụ nke
nwere nghọta mgbe ọgan okwu dị iche iche na-emegharị ahụ n’ụzọ dịgasị
iche iche nke mmadụ na ibe ya na-e ji ezirịta onwe ha ozi. Nke a na-
ezipụta na asụsụ nwere ụda nke nwere nghọta n’usoro a haziri ahazi e ji
asụ ya. Nwodo (2008) kwukwara na asụsụ bụ usoro ụda dị iche iche nke
ndị mmadụ sitere n’otu obodo, otu ebe maọbụ otu agbụrụ ji emekọrịta
n’etiti onwe ha. Nkọwa a dabara na nke Anozie (1999) nyere banyere
asụsụ.
N’ịga n’ihu, Okoli (2005) kọwara na asụsụ bụ ụdaokwu nwere ezi
nghọta nke sitere n’ọnụ mmadụ pụta. Asụsụ ndị Igbo bụ Igbo ma o nwere
olu dị iche iche e ji asụ ya. Olu a dị iche iche mere e ji wepụta otu olu
asụsụ nke onye ọbụla bụ onye Igbo ga-aghọta nke a kpọrọ Igbo Izugbe.
Nkọwa Igbo Izugbe
A bịa n’asụsụ dị iche iche tụmadị n’asụsụ Igbo, e nwere olu dị iche
iche e ji asụ ha. Niihi nke a, a na-enwezi otu olu jịkọrọ olu asụsụ niile dị
n’ime otu asụsụ nke onye ọbụla na-asụ asụsụ ahụ ga na-aghọta. Olu asụsụ
a ka a na-akpọ asụsụ Izugbe. Uwalaka (2011) kọwara asụsụ Izugbe dị ka
olu asụsụ nke nwere nkwado. Nkwado a nwere ike isite n’aka gọvụmenti,
ụlọakwụkwọ, akwụkwọ edere ede, nkọwa okwu na agụmagụ. O kwukwara
na oge ụfọdụ, otu asụsụ nwere ike nwee ihe karịrị otu asụsụ Izugbe dị ka
asụsụ Izugbe Bekee Amerịka, Asụsụ Izugbe Bekee British na Asụsụ
Izugbe Bekee Canadian. Ndị a niile bụcha asụsụ Izugbe Asụsụ Bekee.
18
Ọ bụ eziokwu na odide asụsụ Igbo malitere n’afọ 1766, mana ọtụtụ olu
e ji asụ ya dọghachiri ma ọsụsụ ma odide ya azụ n’ọmụmụ(Nwadike 2002)
Nke a mere na Otu Ịkwalite Asụsụ na Omenala Igbo gbara mbọ hụ na e
wepụtara asụsụ Izugbe n’Igbo bụ nke e ji “Igbo Izugbe” wee mara. Otu a
nọrọ n’afọ 1972 wee hịbe otu kọmiti gbara mbọ wepụta Igbo Izugbe bụ
nke e ji ede Igbo wee rute taa.
N’agbanyeghị mbọ niile Otu Ịkwalite Asụsụ na Omenala Igbo gbara
iji mee ka asụsụ Igbo Izugbe bụrụ naanị Igbo e ji ede ma na-akuzi Igbo,
ọtụtụ mmadụ anaghị etinye uchu na ya. Nke a mere na olundị dị iche iche
ahụ ha ji edegasị ihe ma na-asụ asụsụ Igbo na-eme ka ọmụmụ Igbo Izugbe
sie ike. Olundị Nkanụ so n’otu n’ime olundị a. Nke a mere onye nchọcha ji
kpọọ ya mkpa ileba anya chọpụta ka olundị Nkanụ si emetụta mkpọpụta
fọnịm Igbo Izugbe.
Nkọwa Olundị
Obodo dị iche iche mejupụtara ala Igbo. Obodo ndị ahụ dị iche iche
nwere olu dị iche iche ha ji asụ ya bụ asụsụ Igbo. Ọ bụ olu asụsụ dị iche iche
ndị a ka a na-akpọ olundị kpọmkwem. Olundị bụ asụsụ nke ọ bụ naani otu
ogbe, otu obodo maọbụ otu ndị na-asụ na be ha nke mere ha ji dị iche n’ebe
ndị ọzọ yiri ha nọ. Ọtụtụ ndị odee kọwakwara olundị n’ụzọ dị iche iche.
Uwalaka (2011) kọwara olundị dị ka olu asụsụ dị iche iche e jiri mara otu
mpaghara akụkụ ụfọdụ na-asụ otu asụsụ. Nke a pụtara na a ga-enweriri
oluasụsụ nke ọtụtụ mmadụ nọ n’otu mba na-asụ ma nwekwaa ọtụtụ ndị dị
19
iche iche na mpaghara dị iche iche n’ala ahụ ndị nwekwara olu nke e ji mara
naanị ha kpọmkwem. Niihi mgbasa ha na-agbasa n’ọtụtụ ebe, oluasụsụ ha
na-abịa dị iche iche nke e nwere ike ịhụta ụfọdụ mkpụrụokwu na mkpụụrụda
pụrụ iche na nke ndị ogbe ọzọ.
Oluikpe (1979) kọwara olundị dị ka mgbakọta ọnụ ihe niile gbasara alaka
asụsụ Izugbe a na-asụ n’obodo nke e jiri mara obodo ọbụla. Ude (2012)
n’aka nke ya kọwara olundị dịka asụsụ pụrụ iche nke ndị mmadụ na-asụ na
be ha ma bụrụkwa nke ezughị ebe niile ọnụ. Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị
niile na-asụ otu asụsụ na eketa oke n’otu olundị. Lawless (2005) kwuru na
olundị bụ mpaghara otu asụsụ nke otu ndị nọ n’otu ebe na-asụ kpọmkwem.
Ngoesi (2000) kọwakwara olundị dịka ụbara oluasụsụ a na-ahụta n’otu
asụsụ. Ọ tụpụtakwara ụfọdụ ọghọm dị n’olundị mgbe o kwuru sị:
Olundị ndị a niile mere ka ọ na-esiri ndị si n’otu mpaghara ala Igbo ike ịghọtagbado ihe ndi si n’ otu mpaghara ọzọ na-asụ. Olundị ndị a mekwara ka asụsụ Igbo na-agbagwoju anya na-ahịakwara onye abụghị onye Igbo ahụ n’ịghọta na n’ịsụ ya. (p.3)
E kewara olundị ụzọ abụọ; nke abụghị izugbe na nke izugbe.
Uwalaka (2011) n’otu aka ahụ kwuru na olundị dị ụzọ abụọ: nke ebe na nke
izugbe. Olundị ebe maọbụ nke abụghị izugbe na-arụtụ aka na mpaghara
asụsụ nke njirimara ya bụ nke naanị ndị mmadụ bi n’otu mpaghara na-asụ.
Nkọwa nke a na-arụtụ aka n’ikewasị asụsụ n’ogbe n’ogbe. Ebe mpụtara
olundị nke abụọ bụ olundị Izugbe na-arụtụ aka n’olundị dị ka asụsụ ala dị
20
iche iche. Ịma atụ: asụsụ ala Igbo, asụsụ ala Awụsa maọbụ asụsụ ala
Yoruba.
Nkọwa ndị a niile na-egosi na o nwere ndị maọbụ otu ebe nọọrọ onwe ha
nke nwere olu nke ha ji asụ otu asụsụ ahụ jikọrọ obodo ahụ ọnụ bụ nke a
kpọrọ olundị. Olundị ọbụla nwere fọnịm mejụpụtara ya nke na-enwe ndịiche
n’ebe fọnịm asụsụ izugbe dị.
Nkọwa Fọnịm
Mkpụrụụda dị iche iche dị n’asụsụ ka a na-akpọ fọnịm. Ngalaba na-
amụ ihe gbasara fọnịm na ka e si e ji ya arụ ọrụ n’asụsụ mba ụwa ka a na-
akpọ fọnọlọji. Ndị odee dị iche iche akọwaala fọnịm n’ụdị dị iche iche.
Ngoesi (2000) kwuru na fọnịm sitere n’okwu Bekee bụ “phoneme” nke
pụtara mkpụrụụda dịgasị n’asụsụ. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ fọnịm maọbụ
mkpụrụụda ndị ahụ na-eweta ndịiche na mkpọpụta mkpụrụokwu na ibe ya.
Site n’ọmụmaatụ o nyere, fọnịm maọbụ mkpụrụụda nke mere ka “mbe” na
“mba” dị iche bụ /e/ na /a/, nke mere ka “agwa” na “akpa” dị iche bụ /gw/ na
/kp/. Ihe nke a na-egosi bụ na mkpụrụụda ọbụla nke ebuteghị ndịiche na
mkpụrụokwu na ibe ya abụghị fọnịm. Anozie (1999) n’aka nke ya, kwenyere
na fọnịm bụ ụdaasụsụ ndị ahụ nwere ike ibute ndịiche n’okwu ole na ole bụ
ndị kaara iyi onwe ha ma n’ụdị na na nghọta ma e wepụ naanị otu ụdaasụsụ.
Nkọwa ndị a niile na-arụtụ aka na ndịiche fọnịm na-ebute n’okwu na ibe ya
site n’otu mkpụrụxda. Nnachi (2007) hụrụ fọnịm dịka ihe a na-amụkọdọ ya
21
na asụsụ. Nke a mere o ji kwuo na ndị na-amụ asụsụ na-amụkwuazị maka
fọnịm iji nwee ike gosipụta ndịiche dị n’etiti okwu abụọ maọbụ karịa yiri
onwe ha site na mkpọpụta ha dị iche iche. Nkọwa ya ahapụghị ịrụtụ aka na
ndịiche ahụ fọnịm na-ebute n’okwu na ibe ya.
Asụsụ ọbụla nwere fọnịm mebere ya. Olu asụsụ dị iche iche dị n’ime
asụsụ izugbe n’Igbo nwekwara fọnịm nke mebere ha. Iji maa atụ, olundị
Nkanụ nwere fọnịm ndị a:
Fọnịm Olundị Nkanụ
Ndị bụ ụdaume
1. /a/
2. /e/
3. /ε/
4. /i/
5. /I/
6. /o/
/ כ / .7
8. /u/
9. /υ /
Ndị bụ mgbochiume
1. /b/
2. /t∫ /
3. /d/
4. /f/
5. /g/
6. /gb/
7. / /
22
8. /gw/
9. /h/
10. /dʒ/
11. /k/
12. /kp/ 13. /kw/
14. /ι/
15. /m/
16. /n/ 17. /ŋ/ 18. /ŋw/ 19. / /
20. /p/ /ג/ .21
22. /s/
23. /∫ /
24. /t/
25. /v/
26. /w/ 27. /wh/
28. /j/
29. /z/
Source: Ogbuehi, (2002)
Ọ bụghị fọnịm niile dị n’olundị Nkanu dị ka e zipụtara ebe a dị n’Igbo
Izugbe. Ọ bụ nke a na-ebutakarị ndịiche na mkpọpụta na mpụtara okwu dị
iche iche n’oluasụsụ a na nke Igbo Izugbe. Iji mee ka nke a doo anya, lee
fọnịm nke Igbo Izugbe nke sitere na Wikipedịa (2011).
23
Fọnịm Igbo Izugbe
Ndị bụ ụdaume
1. /a/
2. /e/
3. /i/
4. /Ị/
5. /o/
/ כ / .6
7. /u/
8. /υ /
Ndị bụ mgbochiume.
1. /b/
2. /t∫ /
3. /d/
4. /f/
5. /g/
6. /gb/
7. / /
8. /gw/
9. /h/
10. /dʒ/
11. /k/
12. /kp/
13. /kw/
14. /ι/
15. /m/
16. /n/
17. /ŋ/
24
18. /ŋw/
19. / /
20. /p/
21. / /
22. /s/
23. /∫ /
24. /t/
25. /v/
26. /w/
27. /j/
28. /z/
Site na ndepụta fọnịm ndị a, a ga-ahụ ọtụtụ fọnịm nke dị n’olundị
Nkanụ nke adịghị na nke Igbo Izugbe. A ga-ahụkwa na e nwekwara ọtụtụ
fọnịm nke dị n’olundị Nkanụ ma dịkwa n’Igbo Izugbe mana ọ bụghị otu ọrụ
ka ha na-arụ n’olu asụsụ ndị a. Nke a na-ebute ndịiche n’okwu n’oluasụsụ
ndị a ma bụrụkwa isiokwu nchọcha a. Lee ihe ọmụmaatụ:
Igbo Izugbe Bekee Olundị Nkanụ anya eye eya aṅaa how ekaa sị Say shị enwe monkey ewe nwaanyị woman waayị Ṅụọ drink ghụọ anyịnya horse ịyịya afọ stomach ewhọ isi Head Ishi osisi Stick oshishi nwata Child wata aka Hand eka ụkwụ leg ọkpa abacha sliced cassava jịgbụ
25
Nkọwa Ebe Ụlọ Akwụkwọ Dị
Ebe ụlọakwụkwọ dị nwere ike bụrụ ebe mepere emepe maọbụ ebe nọ
n’ime obodo. Site na nchọcha dị iche iche ọtụtụ mmadụ merela banyere ebe
ụlọakwụkwọ dị, nchọpụta na-abụkarịa na ụmụakwụkwọ nọ n’ụlọakwụkwọ
dị ebe mepere emepe ka emeta nke ọma n’agụmakwụkwọ karịa ndị nọ
n’ụlọakwụkwọ dị n’ime obodo. Ọtụtụ ndị ọkammụta dika Oluikpe na
Nwegbe (1993) na Mohammed (1995) gosiri na site na nchọcha ha mere,
ọtụtụ ụmụakwụkwọ anaghị emeta nke ọma n’ọmụmụ asụsụ (Bekee). Ha
kwuru na nke a abụghị naanị niihi nsogbu ụkọ akarangwa na ndị nkuzi a
zụrụ nke ọma, kama, nsogbu ebe ụlọakwụkwọ dị sokwuazị n’ime ya. Otu ihe
a na-ele anya banyere mmeta nke ọma na mmụta bụ ebe ụlọakwụkwọ dị.
Ndịiche n’ebe ụlọakwụkwọ dị na-ezipụtakwa ndịiche n’ihe a na-eme
n’ụlọakwụkwọ ahụ (Akabogu, 2006:110).
Imoagene (1979), Ntumi (1983) na Faloye (1985) kwuru sị na
ụlọakwụkwọ dị n’ebe mepere emepe ka ndị dị n’ime obodo emeta nke ọma
n’ọmụmụ asụsụ (Bekee). Ọtụtụ ihe ka ha wepụtara iji kwado okwu a nke
gụnyere na ụmụakwụkwọ nọ n’ime obodo enweghị n’uju akarangwa ihe
ọmụmụ ọgụgụ akwụkwọ, omenala ọgụgụ akwụkwọ na ndị nkuzi a zụrụ nke
ọma n’asụsụ Bekee. Nke a na-egosi na ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụta
mmụta n’ebe ọ dị ukwuu. Ntumi (1983) gara n‘ihu kwuo na ndịiche dị na
mpaghara ebe ụlọ akwụkwo na-apụta ihe na nka mmụta asụsụ ha. Site n’
26
echiche Ude (2012), o gosipụtakwara na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-
emetụta ụmụakwụkwọ n’ọsụsụ Igbo Izugbe. O kwuru na:
Ụfodụ ụlọakwụkwọ ka a rụnyere n’ebe mepere emepe, ebe ndị ọzọ dị ebe emepeghị emepe. Ebe ụlọakwụkwọ dị nwere ike imetụta ụmụakwụkwọ n’agụmakwụkwọ niihi na ka obodo siri mepedebe na-enwetara ụlọakwụkwọ mmepe n’ụdị akarangwa e ji akuzi ihe (p.37)
Ọbasị (2011) kọwara na ọ bụrụla ihe a maara ama na ụlọakwụkwọ
ndị nọ n‘obodo mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa ndị nọ n’obodo
emepeghị emepe niihi na, a na-enwe ndị nkuzi a zụrụ nke ọma na ngwa
nkuzi ndị ọzọ n’obodo mepere emepe karịa n’obodo emepeghị emepe. O
kwukwara na ogige ebe mepere emepe na-azụpụta ụmụakwụkwọ ndị ọgụgụ
isi ha ka na-arụ ọrụ karịa ndị nọ n’obodo emepeghị emepe.
Ọ bụkwa otu ihe a ka Umo (2001) na-akwado mgbe o kwuru na
ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa ndị
nọ n’obodo emepeghị emepe n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Nwagu (1990) n’aka nke
ya mekwara nchọpụta n’ihe ọmụmụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya wee hụkwa
ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị sị emetụta ya bụ ihe ọmụmụ. Ọ bụ
eziokwu na nchọcha ya abụghị maka isiokwu nchọcha a, mana ha niile
metụtara ihe ọmụmụ. Dị ka o si chọpụta, ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo
mepere emepe na-eme nke ọma n’ihe ọmụmụ gbasara mmekọrịta mmadụ na
ibe ya karịa ndị ọgbọ ha nọ n’obodo emepeghị emepe.
27
Nkọwa Jenda
Jenda bụ nkenụdị ụtọasụsụ na-eleba anya n’oke na nne. Mgbe a na-
ekwu okwu banyere jenda n’ọmụmụ asụsụ, ebumnuche na-abụkarị iji ya
chọpụta ka ọ bụ ndị nwoke ka ọ bụ ndị nwaanyị ka emeta nke ọma na ya bụ
ihe ọmụmụ. Ka o sila dị, ọtụtụ ndị ọkammụta emeela nchọpụta wee hụ na o
nwere ndịiche dị n’ọmụmụ asụsụ n’etiti nwoke na nwaanyi.
Akabogu (2002) gosiri na ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị na-amụtakarị
asụsụ ọsọọsọ karịa ndị nwoke mgbe o kwuru sị na ndịiche na jenda bụ otu
ụzọ pụtakarịrị ihe e si egosipụta na ndị nwaanyị ka eme nke ọma n’ịmụ
asụsụ dị iche iche karịa ndị nwoke n’ụlọakwụkwọ. O kwukwara na mmalite
na mbido ikwu okwu dị ka o siri metụta ụmaaka, na ndị nwaanyi n’ime ha
na-aka eme nke ọma n’ịkpọpụta okwu ndị nwere otu ụda na ụda abụọ. Umo
(2001) hụtakwara na a bịa n’ihe gbasara aghọtaazaa na nkọwa n’asụsụ
ọbụla, nkwenye ndị mmadụ na-egosi na ụmụnwaanyị na-enwekarị mmụọ
ịmụ asụsụ karịa ụmụ nwoke. Nchọcha ọtụtụ ndị mmadụ mere na ngalaba ihe
ọmụmụ ndị ọzọ abụghị asụsụ Igbo na-egosipụtakwa na e nwere ndịiche na
mmụta ebe ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ. Ka o sila dị, Adigwe (1992)
kwupụtara na o nweghị ebe ọ hara ndị nwoke na ndị nwaanyi na mmụta ihe
ọmụmụ sayensi n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Ọtụtụ ndị ọkammụta ndị ọzọ
kwukwara na ụmụ nwaanyị ka ala azụ n’ihe ọmụmụ sayensi. Ndị a gụnyere
Adigwe (1992 ), Bateson na Parsons (1998) na Madu (2004). Wale (1999)
28
n’aka nke ya chọpụtara na ụmụ nwaanyị na-enwe mmasị n’asụsụ mba ọzọ
ma a bịa n’ihe gbasara asụsụ karịa ndị nwoke.
Atụtụ Mmụgharị
Atụtụ mmekọr ịta mmadụ na ibe ya (Albert Bandura)
Atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ nke na-akọwa akparamagwa
na-esite na mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ibe ya nke sitere na nṅomi. Otu
na ndị tụpụtara atụtụ a bụ Albert Bandura (1925). Na nkwenye Bandura,
mmadụ na-esite n’iṅomi ka ndị ọzọ si eme amụta ihe ọhụrụ. Nnachi (2007)
kọwapụtara ihe gbasara atụtụ a mgbe o kwuru na ọmụmụ mmekọrịta mmadụ
na ibe ya bụ ụdị ọmụmụ nke na-apụtakarị ihe n’ụdị nlele anya maọbụ nṅomi
nke anụmanụ dị iche iche maọbụ mmadụ si amụta ihe site na nlele na-
eṅomi anụ maọbụ mmadụ, iji wee nwee ike tozuo ịbụ onye otu ahụ. O nyere
ihe ịma atụ sị na ụdị akwa onye nkuzi, otu o si akpa agwa na ụdị mmadụ ọ
bụ ka ụmụakwụkwọ na-ṅomi maka na ha nwere ike chọọ ịdị ka onye nkuzi.
Atụtụ a dabara na nchọcha a ma na-ezipụta na onye nkuzi tinyekwara
ndị nọ n’okirikiri nwata mgbe ọ na-eto nwere nnukwu ọrụ n’ebe ọmụmụ
asụsụ dị. Mgbe nwata akwụkwọ na-eṅomi ka onye nkuzi sị akpọkọ
mkpụrụụda dị iche iche n’ụzọ doro anya, ọ ga-amụtakwa ịkpọpụta ụda ndị a
nke ọma nke ọma. Nwata akwụkwọ nwere ike ikwunwo ihe onye nkuzi
kwuru nakwa ikwugharị ihe a kuziri nke ga-eme ka ọ mụta ihe ga-enyere ya
aka n’asụsụ ahụ. Mgbodile (2000) kọwara ka nwata si amụta asụsụ bido
29
n’ọnwa isii ruo n’ afọ asatọ. Ọ sị na nwata na-amụ asụsụ mgbe naanị ya nọ.
Nwata ahụ na-e ji ụdaume na mgbochiume emebe okwu. Ima atụ ‘pa pa’, ‘ta
ta’, ‘ma ma’, mgbe ọ dị afọ abụọ, ọ mụta ikwu otu okwu ugboro ugboro. Ima
atụ mama nri, papa tii, mama mmiri. N’afọ atọ ruo na ise, o bido ịzọ ihe azọ
dika mkpịsị ode, iko, osisi, ige ntị n’ihe mmadụ na-ekwu, ịgụ eserese, inwe
agụụ mmekorịta mmadụ. N’afọ isii ruo na asatọ, nwata amụta ikwupụta
echiche ya, ide ihe, ịjụ ajụjụ. (p.8)
Ọ bụ site n’iṅomi ndị nọ na gburugburu ha ka ha si amụta ihe ndị a.
Site na mmekọrịta dị n’etiti ha na nne na nna ha tinyekwara ndị ọzọ niile nọ
na gburugburu ha, ha na-eṅomi omume ndị ahụ na-eme tụmadị asụsụ ha na-
asụ nke nwere ike imetụta ha na mkpọpụta ụda dị iche iche. Ebe ọ bụ na ha
bidoro na gboo kpọpụtaba ụda ndị a site n’olundị ha, ọ na-esiri ụmụaka ike
ịgbanwe ire na mkpọkọ ụda ndị a n’ọdịniihu. Nke a na-egosi na asụsụ onye
nkuzi nwere ike imetụta nke ụmụakwụkwọ niihi nṅomi nke ụmụakwụkwọ
na-eṅomi onye nkuzi.
Na nchịkọta, asụsụ onye nkuzi nakwa nke ndị ọzọ niile ha na
ụmụakwụkwọ na-emekọrịta dị ka nne na nna ha, ụmụnne, otu ọgbọ na ndị
ọzọ na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta ụda dị iche iche e nwere
n’asụsụ. Nke a mere na onye nkuzi kwesiri itinye uchu ya na etu o si
akpọpụta ụda, ka ọ ghara ịmegharị ụmụakwụkwọ anya site n’iji olundị na-
eme nke a mgbe ọ na-akụziri ha Igbo Izugbe. Atụtụ a dabara nke ọma na
30
nchọcha a site na nkọwa niile ndị a e nyere n’elu nke metụtara isi okwu
nchọcha a.
Atụtụ Akparamagwa/Agwa Ọmụmụ Asụsụ (B.F.Skinner)
Atụtụ akparamagwa bụ atụtụ gbadoro ụkwụ na nṅomi na mgbamume
dị ka ntụ nwatakịrị ji amụta asụsụ. Onye tụpụtara atụtụ a bụ Skinner (1957).
O kwenyere na ọ bụ ebe nwata nọ too ga-enye aka kuziere ya asụsụ site
n’ịkwado ya maọbụ inyere ya aka. Nke a pụtara na gburugburu ebe a mụrụ
nwata nwere nnukwu ọrụ nke ukwuu niihi na ọ bụ ebe ahụ ka nwata si amụta
asụsụ maọbụ omume ndị ọzọ dị iche iche, site na nṅomi na mgbamume.
Atụtụ a na-egosi na ọmụmụ asụsụ bụ nke metụtara iṅomi omume na ịkpa
agwa nke bara mmadu n’ụmị okpụkpụ. N’ụzọ dị etu a, ụmụaka na-eṅomiri
ụda dị iche iche n’usoro akpọmụda ha na-amụ na gburugburu ha ma nweta
ezigbo ihe mgbamume nke nwere ike ịbụ ajamike maka mmụta asụsụ ahụ
nke ọma.
Skinner gara n’ihu kwuo na asụsụ na-egosi agwa mmadụ nke e nwere
ike ịgbaziri n’ụzọ dị mma. O kwuru sị na mgbe a na-agbaziri mmadụ
n’ọmụmụ asụsụ, onye ahụ na-eme nke ọma na-aga n’ihu. Ma mgbe o
nweghị onye na-agbaziri ya, agwa ọmụmụ asụsụ ya ga-anyụ ka ọkụ. Atụtụ a
kwenyere na tupu nwata amụta ka e si asụ asụsụ, na ọ ga-enwe ihe mgbado
ụkwụ dị ka akparamagwa, ikwu ihe a jụrụ ya, iche echiche n’ihe ọ na-amụ
na ịmụnwo ihe ọ na-amụ. Atụtụ a dabara na nchọcha a niihi na ọ metụtara
31
ụdaasụsụ. Ọzọ asụsụ Igbo bụ site n’iṅomiri mkpọpụta mkpụrụ ụda dị iche
iche dị n’asụsụ ahụ ka ụmụakwụkwọ ji amụta ya bụ asụsụ.
Onye nkuzi ọbụla na-akuzi asụsụ Igbo kwesiri iji Igbo Izugbe na-
akuzi ya ka ụmụakwụkwọ nwee ike ṅomiri ya. Mgbe ụmụakwụkwọ na-
akpọpụta mkpụrụụdaasụsụ Igbo etu o kwesiri, onye nkuzi kwesiri inye ha
ihe mgbamume ka ha jisie ike na-aga n’ihu n’ime nke ọma. Ọ bụrụ na o
nwere ebe ha na-eri mperi na mkpọpụta ụda ndị a, onye nkuzi kwesiri
igbaziri ha nke ọma. Nwata akwụkwọ na-amụ asụsụ Igbo ga-amụta ihe
gbasara ụdaasụsụ Igbo nke ọma site na nkwado nke onye nkuzi, ikwunwo
ihe onye nkuzi kwuru, iche echiche nke ọma n’ihe a kuziri, ikwụgharị ihe a
kuziri na nkwado nke ụmụakwụkwọ ibe ya site n’ịkụrụ ya aka. Onye nkuzi
nwere ike zụta ihe onyinye dị iche iche ọ ga-enye onye ọbụla mere nke ọma
n’ịkpọpụta na ideta ihe gbasara mkpụrụụdaasụsụ Igbo Izugbe nke ọma. Ihe
ndị a niile na-egosi na atụtụ a dabara nke ọma na nchọcha a niihi na o
metụtara fọnịm e ji akpọpụta ụdaasụsụ dị iche iche n’asụsụ ọbụla.
Nchọcha A Hụrụ Anya
Nchọcha a hụrụ anya n’ebe a gbadoro ụkwụ na nchọcha dị iche iche
ndị ọzọ merela iji chọpụta ka nchọcha ndị ahụ siri yie, ma dị iche n’isiokwu
nchọcha nke a.
Nnene (2006) mere nchọcha n’isiokwu “Analysis of Error Between
English Phonology Patterns and Ọgwụ Dialect of Igbo Among Senior
Secondry School Students”. Ebe mgbado ụkwụ ya bụ na ndehie dị iche iche
32
dị n’etiti asụsụ Bekee na olundị Ọgwụ mgbe a na-ede asụsụ Bekee dị ka o
siri metụta ụmụakwụkwọ ndị sekọndịrị ukwu. Ọ jiri ụdị nchọcha sovee
nkọwa mee ya. O jiri ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ dị narị asatọ (800) ndị nọ
n’afọ nke abụọ na sekọndịrị ukwu bụ mgwakọta ndị nwoke na ndị nwaanyị
mee ya.
Ọ bụ usoro nsere nhatanha ka o jiri họta ndị o jiri mee nchọcha ma jiri
usoro nọrọlere wee nweta ihe ọrụ o jiri mee nchọcha ya. O jiri miin wee
chịkọta ihe ọ chọpụtara. Nchọpụta ya bụ na nsuhie na-apụta ihe mgbe ndị
Ọgwụ na-asụ Bekee nke ọ bụ olundị ha na-ebute ya. Ọzọ kwa bụ na ha
anaghị e ji ndebeolu amụ asụsụ Bekee.
Ebe nchọcha Nnene (2006) gbadoro ụkwụ na fọnọlọji/f ọnịm, ọ dabara
na nchọcha a na-eme ugbu a. Ha abụọ gbadoro ụkwụ na fọnịm oluasụsụ
mana ha dịtụ iche niihi na nchọcha Nnene gbadoro ụkwụ n’olundị Ọgwụ na
nke Bekee, ebe nchọcha nke a na-eme ugbua na-ele anya n’olundị Nkanụ na
nke Igbo Izugbe.
Ebe (2008) mere nchọcha banyere “Nsogbu ụmụakwụkwọ ndị Igbo
na-enwe n’ọmụmụ fọnọlọji Asụsụ Bekee”. Ebe ọ nọrọ mee nchọcha a bụ
n’okpuru ọchịchị Isi-ụzọ na steeti’Enugwu. O jiri ndị sekọndịrị ukwu nke
atọ. O jiri usoro nchọcha nke Sovee mee nchọcha ya. Ọ chọpụtara na
ụmụakwụkwọ na-enwe nhiahụ n’ịkpọpụta ụda ụfọdụ etu o kwesiri. O
depụtara ụda iri na abụọ nke o gosipụtara n’ihe ruru pesenti iri isii
ụmụakwụkwọ ndị sekọndịrị enweghị ike ịkpọpụta ha etu o kwesiri.
33
Nchọcha Ebe (2008) dabara na nchọcha a na-eme ugbu a, niihi na ha
abụọ gbadoro ụkwụ na mkpọpụta ụda. Ha abụọ gbadokwara ụkwụ n’olu
asụsụ a na-ele anya bụ asụsụ Igbo na asụsụ Bekee. N’agbanyeghị na
nchọcha Ebe (2008) na nke a na-eme ugbu a yiri onwe ha, e nwekwara
ndịiche n’etiti ha abụọ. Nchọcha Ebe rụtụrụ aka n’asụsụ Bekee dị ka
oluasụsụ nke abụọ o jiri mere ihe mgbakwasị ụkwụ, nchọcha a na-eme ugbu
a jiri Igbo Izugbe mejupụta oluasụsụ nke ya. Ebe (2008) mere nchọcha nke
ya n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị nta nke atọ (Jss3) dị n’okpuru ọchịchị Isi-ụzọ
n’Enugwu Steeti mana nchọcha a na-eme ugbu a gbadoro ụkwụ
n’ụmụakwụkwọ sekọndịrị nta nke abụọ (Jss2) nọ n’okpuru ọchịchị Nkanụ
na Steeti Enugwu.
Akabogu (2002) mere nchọcha banyere jenda n’isiokwu a kpọrọ
“Effects of Secondary School Student’s Exposure to English Registers
Contextual Clues of Achievement in Reading Comprehension”. Ụdị usoro
nchọcha ọ gbasoro bụ nke ‘Quasị-experimental’.O jiri ụmụakwụkwọ ndị nọ
na sekọndịrị ukwu nke atọ na nke abụọ n’Enugwu Edukeshọn zoon ndị dị
narị abụọ na iri ise (250) were mere ọnụọgụ o ji mee nchọcha ya. Ọ
chọpụtara na jenda enwekebeghị ihe pụrụ iche dị ukwu n’ebe ọmụmụ asụsụ
dị dị ka o siri metụta ndị nwoke na ndị nwaanyị
Nchọcha Akabogu metụtara nchọcha nke a niihi na ha niile gbadoro
ụkwụ na mkpọpụta fọnịm. Dị ka nchọcha ya lebara anya na jenda, nchọcha
nke a ga-elebakwaazi anya na jenda.
34
Ewelum (2010) mere nchọcha banyere “Mmeta nke ọma n’ụtọasụsụ
n’ule sekọndịrị”. O jiri Dizaịn ọmụmụ bụ ekspost-fakto mee ya. O jiri zoon
mmụta Nsuka nke jikọtara okpuru ọchịchị atọ: Nsụka, Igbo Etiti na Uzọ-
Ụwanị wee mere ebe nchọcha ya. Ndị o jiri mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ
senịo sekọndịrị skuul nke ọnụọgụ ha dị puku anọ nari ise, iri asaa na isii. Ụlọ
akwụkwọ dị na zoon ahụ dị iri ise na itoolu. Nnwale ka o jiri nweta ngwa
nchọcha. O jiri ngwa nchọcha a nweta ule ụmụakwụkwọ nke nwere nke ji
ise na mgbakọta ọnụọgụ ajụjụ dị iri ise. Usoro ntụcha data ya bụ ntụcha
akara na usoro Igbo Izugbe. Nchọpụta ya na-egosi na ụmụakwụkwọ ndị
nwaanyị ka eme nke ọma n’ụtọasụsụ karia ndị nwoke. N’ọnụọgụ o ji mee
nchọcha ya, mgbakọta ọnụọgụ ụmụ nwoke mere nke ọma dị narị na isi (106)
ebe ndị nwaanyị mere nke ọma dị narị iri atọ na anọ (134).
Nchọcha Ewelum (2010) a dabara nke oma na nchọcha a na-eme ugbu
a niihi na ha abụọ gbadoro ụkwụ n’ụtọasụsụ. Nchọcha Ewelum lebara anya
na jenda ma nchọcha nke a ga-elebakwa anya na jenda. Ebe ha nọ dị iche bụ
na Ewelum lebara anya na nsogbu dị iche iche dịịrị ụmụakwụkwọ na mmeta
nke ọma, ma nke a ga-eleba anya naanị na mmetụta olundị na-enwe na
mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe.
Ude (2012) mere nchọcha nke isiokwu ya bụ, “Mmetụta Fọnọlọji
olundị Udi n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe”. Ọ bụ olundị Udi na Igbo Izugbe
bụ ebe mgbado ụkwụ nchọcha ya. Ọ jiri usoro nchọcha a kpọrọ Ekspostu-
Fakto (Expost Facto Design) wee mee ya. Ndị o bu n’obi mee nchọcha ya bụ
35
ụmụakwụkwọ niile nọ n’ogo sedọndịrị ukwu nke abụọ (SSII) bụ ndị dị otu
puku nari isii na iri ise (1650) n’ọnụọgụ. O jikwara usoro nsere pesenti wee
sere ụmụakwụkwọ dị otu nari na iri asatọ (180) n’ọnụọgụ. Ngwa nchọcha ya
dị abụọ. Ha bụ ajụjụ ndepụta na nnwale ọnụ. O jiri tepu rekọda wee dọrọ etu
ụmụakwụkwọ ga-esi kpọpụta ụda/okwu ndị a ga-edepụtara ha.
Nchọcha Ude dabara nke ọma na nchọcha a na-eme ugbu a niihi na ha
abụọ metụtakwara fọnịm asụsụ Igbo. Ha abụọ metụtakwara fọnịm olundị na
nke Igbo Izugbe. Nchọcha Ude lebara anya na jenda. Nke a ga-elebakwuazi
anya na jenda. Ebe ha nọzị dị iche bụ na Ude rụtụrụ aka na fọnịm olundị
Udi, ebe nchọcha nke a ji fọnịm olundị Nkanu mere ihe mgbakwassị ụkwụ.
Olundị Nkanu Igbo Izugbe Olundi Udi
Ewhọ Afọ ahọ awhọ
Wane Nwanne Wune
Iye Ihe Ihe
Eya Anya Anya
Ọkpa Ụkwụ Ụkwụ
Eyashị anyasị aṅashị
Ndee Kedu Eeyi
Bịahọ Bịaghị Bịagh
Ọtụtụ ndị odee ndị ọzọ emeela nchọcha banyere jenda ma mkpebi ha na-
egosi na ụmụ nwaanyị ka eme nke ọma n’asụsụ karịa ụmụ nwoke.
36
Nchọcha ndị a niile metụtara nchọcha a na-eme ugbu a niihi na ha
niile gbadoro ụkwụ n’asụsụ. Ha niile lebakwara anya na jenda etu nchọcha a
na-eme ugbu a ga-esi lebakwuazị anya na jenda. Ihe niile ndị a ndị nchọcha
chọpụtara na-egosi mmekọrịta dị n’etiti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị
n’ọmụmụ asụsụ. Ebumnuuche onye nchọcha ugbu a buzi, ime nchọpụta etu
jenda ga-esi emetụta ụmụakwụkwọ ndị sekọndịrị nta na mkpọpụta fọnịm
Igbo Izugbe na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu.
Nchịkọta Ntụlegharị Agụmagụ
Na ntụlegharị agụmagụ, onye nchọcha lebara anya n’ọtụtụ isiokwu
nchọcha dị iche iche ndị mamadụ merela nke metụtara isiokwu nchọcha a
na-eme ugbu a. Ka o sila dị, onye nchọcha mere nke a site n’iwepụta
ndịnisiokwu dị iche iche ma tụlegharịa ha n’otu n’otu.
Onye nchọcha buru ụzọ lebaa anya n’atụtụ nkọwa. N’atụtụ nkọwa,
onye nchọcha kọwara ihe ndị a: Asụsụ, Igbo Izugbe, Olundị, fọnịm,
mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na jenda. Onye nchọcha lebakwara anya
n’atụtụ mmụgharị bụ atụtụ abụọ metutara isiokwu nchọcha a. Ọ gbadoro
ụkwụ n’atụtụ Mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa atụtụ Akparamagwa
ọmụmụ. Onye nchọcha kọwapụtara ihe atụtụ ndị a bụ, onye tụpụtara ha, afọ
a tụpụtara ha, ka ha si metụta nchọcha a na ka ha ga-esi nye aka na nchọcha
a na-eme ugbu a.
N’ikpeazụ, onye nchọcha lebara anya na nchọcha a hụrụ anya. Ebe a
ka ọ nọrọ zipụta ọtụtụ nchọcha dị iche iche ndị mmadụ merela nke metụtara
37
nchọcha nke a na-eme ugbu a. Ọ kọwapụtakwara ọtụtụ ihe dị iche iche
gbasara isiokwu nchọcha ndị ahụ ma tụlee ndịiche na myiri dị n’etiti ha na
nchọcha nke a na-eme ugbu a.
N’ime nchọcha a hụrụ anya nke a tụlere, o nweghị nke e merela
n’isiokwu nchọcha a bụ Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta Fọnịm Igbo
Izugbe n’ogo sekọndịrị nta na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu” Ọ bụ
nke a mere onye nchọcha ji abagide ime nchọcha a.
38
ISI NKE AT Ọ
USORO NCHỌCHA
N’ebe a onye nchọcha ga-eleba anya na ndịnisiokwu ndị a: ụdị
nchọcha, ebe nchọcha, ndị a ga-eji mee nchọcha, nsere na usoro nsere, ngwa
nchọcha, nnyocha ngwa nchọcha, nnwale ntukwasị obi ngwa nchọcha, nsoro
nnweta data na usoro nhazi data.
Ụdị Nchọcha
Ụdị nchọcha onye nchọcha ga-e ji mee nchọcha a bụ nke Expost-
Facto .Ọ bụ ụdị usoro nchọcha e ji achọpụta mmetụta otu ihe maọbụ nke ọzọ
nwere n’ebe ihe ọzọ nọ. Ọ na-eleba anya n’ịchọpụta ihe dị n’ime ụmụ
akwụkwọ, ọ kachasị mgbe ha na-akpọpụta ihe. Nke a pụtara na ụdị nchọcha
a na-eleba anya n’ihe kpatara ihe jiri mee mgbe otu ọnọdụ metụtara nke ọzọ.
Ali (2006) kwadoro nke a niihi na ọ kọwara “Expost-Facto” dịka ụdị
nchọcha a na-e ji enyocha mmetụta dị n’etiti agbammbọ nke otu maọbụ
ogbe mmadị abụọ. Ya bụ, ịchọpụta ihe mere ndị otu ‘a’ jiri mee nke ọma
karịa ndị otu ‘b’ na nnwale ọbụla. Ọzọ kwa Nworgu (2006) kwuru na ụdị
nchọcha a bụ “Expost-Facto” dabara n’ịchọpụta ka otu ọnọdụ si emetụta
ọnọdụ ọzọ n’ụdị ịbụ oke maọbụ nwaanyị na ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ.
Ọ bụ niihi na isiokwu nchọcha a metụtara mkpọpụta fọnịm maọbụ
mkpụrụụdaasụsụ Igbo n’ebe ụmụakwụkwọ nọ kpatara onye nchọcha ga-e ji
họrọ ụdị nchọcha a maka ime nchọcha a. Ọzọ bụ na isiokwu nchọcha a
metụtara mmetụta olundị Nkanụ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
38
39
Ebe Nchọcha
Ebe a ga-anọ mee nchọcha a bụ na Nkanụ nke dị na zoon Mmụta
Agbanị. Ọ bụ otu na zoon isii e nwere na Steeti Enugwu. Zoon Mmụta
Agbanị nwere Nkanụ West, Nkanụ East na Enugwu South. Ihe e ji mara ndị
Nkanụ bụ Igbu anụ, imepụta mmanụ nri, ịkọ ugbo na ịzụ ahịa. Ihe kpatara
onye nchọcha jiri họrọ ebe a dịka ebe nchọcha bụ na onye nchọcha site
n’isonye n’ịmakị ule Igbo dị iche iche na mkpebi nke ndị isi ule WAEC dị
iche iche chọpụtara na ụmụakwụkwọ nọ na sekọndịrị nta dị na Nkanụ na-
ewebatakarị Olundị Nkanụ mgbe ha na-asụ ma na-ede Igbo Izugbe nke mere
na ha anaghị emetacha nke ọma n’ule Igbo dị iche iche n’ụlọakwụkwọ.
Ndị A ga-e ji Mee nchọcha
Ndị a ga-e ji mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ niile nọ n’ogo sekọndịrị
nta nke abụọ (JssII) na Zoon Mmụta Agbanị n’agbata agụmakwụkwọ afọ
2012/2013. Ọnụọgụ ụmụakwụkwọ a dị puku anọ, narị ise na iri isii (4,560).
Ụlọ akwụkwọ ndị mejupụtara ọnụọgụ ahụ dị iri anọ na isii (46). Ọ bụ n’isi
ụlọọrụ zoon Agbanị ka onye nchọcha si nweta ọnụọgụ ụmụakwụkwọ
n’ụlọakwụkwọ ahụ. Onye nchọcha nwetara ọnụọgụ ahụ n’ebe ahụ niihi na ọ
bụ ha ka nchịkwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile gọvụmenti nwe n’Agbanị dị
n’aka. Ya bụ (Post Primary Schools Management Board, Agbanị Education
Zone)
40
Nsere na Usoro Nsere
Onye nchọcha seere ụmụakwụkwọ dị narị anọ iri ise na isii (456) site
n’ọnụọgụ nchọcha a. Onye nchọcha ji usoro nsere nhatanha wee sere ndị
ụmụakwụkwọ ga-anọchite anya ndị ọzọ na nchọcha a. Onye nchọcha ji
usoro nsere nhatanha [proportionate stratified random sampling] wee sere
ụmụakwụkwọ dị narị abụọ, iri abụọ na asatọ (228) ndị nọ n’obodo mepere
emepe ma mekwaa etu ahụ n’obodo emepeghị emepe. N’otu aka ahụ, e
jikwazi otu usoro ahụ wee sere ụmụakwụkwọ ndị nwoke dị narị abụọ, iri
abụọ na asatọ (128); E serekwaziri ndị nwaanyị dị narị abụọ, iri abụọ na
asatọ (128). Ihe ndị a niile bụ n’iihi na onye nchọcha nwere mmasị n’ileba
anya na jenda tinyere ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ.
Ngwa Nchọcha
Ngwa nchọcha onye nchọcha ji mee nchọcha a bụ Nnwale Mmetụta
Olundị Nkanụ na Mkpọpụta na Odide Fọnịm Igbo Izugbe (NMONMOFII)
nke onye nchọcha ji aka ya mepụta. Ngwa nchọcha a nwere nke ji abụọ. Nke
ji nke mbụ nwere okwu iri atọ (30) ụmụakwụkwọ ga-akpọpụta; ebe nke ji
nke abụọ nwekwaziri okwu iri atọ (30) a tụrụanya na ha ga-edepụta. Ọ bụ
mkpụrụokwu iri atọ (30) ndị ahụ ka ha ji zaa ajụjụ nchọcha nke mbụ, nke
abụọ na nke atọ. Ajụjụ nchọcha nke anọ na nke ise bụ site na nkọwa onwe
ka ha si wee zaa ha.
Ebe ọ bụ na isiokwu nchọcha a metụtara Fọnịm, ọ bụ ya mere e ji nye
ụmụakwụkwọ mkpụrụokwu dị iri atọ (30) nke a tụrụ anya na ha ga-akpọpụta
41
ma dekwa, ebe onye nchọcha ga-e ji tepu rekọda we dọrọ mkpọpụta okwu
ndị ahụ.
Okwu ndị a kpọtara nke ọma bu akara atọ ebe ndị a kpọtaghị bu akara
abụọ. Nke ọzọ akara atọ ka e nyekwara okwu ndị e detara nke ọma ma nye
ndị e detaghị nke ọma akara abụọ n’otu aka ahụkwa.
Ọ Kpọtara Ya Nke Ọma (ỌKPYNỌ) akara atọ (3 Points)
Ọ Kpọtaghị Ya Maọlị (ỌKPYMỌ) akara abụọ (2 points)
O detara Ya Nke Ọma (ODYNỌ) akara atọ (3 points)
O detaghị Ya Maọlị (ODYMỌ) akara abụọ (2 points)
Nnyocha Ngwa Nchọcha
Iji hụ na ngwa nchọcha ndị ahụ e ji mee nchọcha a tozuru etozu maka
inweta ngwa ọrụ e ji mee nchọcha a, onye nchọcha nyefere ya n’aka ndị
ọkammụta na ọkankuzi nọ na ngalaba ọmụmụ asụsụ na fakolti k’edukeshọn
na Mahadum Naijirịa Nsụka. Mgbazi na aro ha nyere nyeere onye nchọcha
aka iji hazie ngwa nchọcha ahụ otu ọ dị n’ọrụ a. (Lee anya na mgbakwunye
nke mbụ).
Nnwale Ntụkwasịobi Ngwa Nchọcha
Iji nwalee ngwa e ji mee nchọcha a, onye nchọcha gara
n’ụlọakwụkwọ a na-akpọ Community Secondary school Nru Nsukka wee
nwalee ya n’isi ụmụakwụkwọ di iri abụọ (20) n’ọnụọgụ. Udị nnwale
ntụkwasịobi ngwa nchọcha onye nchọcha mere ebe a bụ nke a na-akpọ
42
estimeti ịntanalụ kọnsistensi (estimate internal consistency). Ọ bụ usoro
“cronbach’s alpha” ka e ji hazie ihe e nwetara na nnwale ntụkwasịobi ngwa
nchọcha ahụ. Ụsa maọbụ rizọtụ e nwetara na nnwale ahụ bụ: .715, .913 na
.624, nke e ji Cronbach’s Alpha wee tụchaa.(Lee anya na mgbakwụnye nke
atọ).
Usoro Nnweta Data
E kere ụmụakwụkwọ ngwa nchọcha site n’enyemaka ndị nkuzi na
akụzi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ ndị e ji mee nchọcha a. Ọ nyere ndị nkuzi
ahụ ọzụzụ ụbọchị atọ maka iji tepu rekọda wee dọrọ okwu ndị ahụ
ụmụakwụkwọ kpọpụtara. Ndị nkuzi ahụ nyekwara aka nakọta ngwa ndị ahụ.
Onye nchọcha kere ụmụakwụkwọ ajụjụ ederede ndepụta maka inweta
ọsịsa ha gbasara ajụjụ nchọcha nke atọ. Nke a were onye nchọcha izuụka
atọ.
Usoro Nhazi Data/Ihe Nchọcha
Ọ bụ ngwa mgbakọ na nwepụ Miin na Standad Divieshọn ka onye
nchọcha ji hazie data e nwetara na nchọcha a. O ji ya hazie nnwale
mkpọpụta okwu ndị ahụ nakwa ajụjụ ederede ndepụta nke e hibere maka
nchọcha a.
Akara miin ọbụla ruru 2.5 wee gbagowe bụ nke a nabatara na nchọcha
a, dịka okwu ndị a kpọtara nke ọma, ebe nke erughị 2.5 bụ nke anabataghị.
Okwu a kpọtara nke ọma = 3
Okwu a kpọtaghị nke ọma = 2
43
Nke a bụ maka okwu ndị e dere ede.
Maka ajụjụ ederede ndepụta, e nyere akara ndị a:
Okwu e detara nke ọma = 3
Okwu e deteghị nke ọma =2
N’otu aka ahụ, e ji “T-test” wee nwalee ụma okwu ndị ahụ pụtara ihe na
nchọcha a.
44
ISI NKE ANỌ
RỊZỌLT
N’ebe a, onye nchọcha gosipụtara rịzọlt nchọcha na tebul site
n’ịgbasoro ajụjụ nchọcha ise e hibere maka nchọcha a.
Aj ụjụ Nchọcha nke Mbụ
Kedu ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe?
Tebul nke Mbụ: Miin na Standad Divieshọn na-egosi ndịiche dị na
mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe.
Ọnụọgụ Ndepụta Okwu Igbo/ Ndịna
Ndepụta na Bekee
SD Mkpebi
1 Nwoke Male 2.29 .45672 Ọ dabaghị 2 Nwaanyị Female 2.10 .31249 Ọ dabaghị 3 Onye Who 2.07 .26968 Ọ dabaghị 4 Afọ Stomach 2.08 .27308 Ọ dabaghị 5 Ihe Thing 2.10 .30693 Ọ dabaghị 6 Anya Eye 2.13 .34281 Ọ dabaghị 7 Isi Head 2.09 .29530 Ọ dabaghị 8 Osisi Stick 2.08 .27641 Ọ dabaghị 9 Onyinye Gift 2.08 .28609 Ọ dabaghị 10 Ụlọ House 2.08 .27308 Ọ dabaghị 11 Anyanwụ Sun 2.08 .28292 Ọ dabaghị 12 Were Take 2.35 .47753 Ọ dabaghị 13 Ụkpaka Oil-bin 2.17 .37855 Ọ dabaghị 14 Enwe Monkey 2.10 .30973 Ọ dabaghị 15 Aṅaa How 2.02 .14646 Ọ dabaghị 16 Ṅụọ Drink 2.03 .19473 Ọ dabaghị 17 Anyịnya Horse 2.03 .18401 Ọ dabaghị 18 Nwa Child 2.05 .21886 Ọ dabaghị 19 Aka Hand 2.07 .25912 Ọ dabaghị 20 Aṅara Garden egg 2.22 .41829 Ọ dabaghị 21 Ọnwa Moon 2.08 .28292 Ọ dabaghị 22 Eligwe Heaven 2.06 .24009 Ọ dabaghị 23 Anyasị Dark 2.08 .27308 Ọ dabaghị 24 Nye Give 2.10 .30120 Ọ dabaghị 25 Mmadụ Human being 2.05 .23603 Ọ dabaghị 26 Nṅomi To emulate 2.21 .40935 Ọ dabaghị 27 Agha War 2.26 .43933 Ọ dabaghị 28 Ọṅụ Happiness 2.11 .31790 Ọ dabaghị 28 Akpa Bag 2.21 .41390 Ọ dabaghị 30 Nwere Have 2.46 .49954 Ọ dabaghị Mgbakọtaọnụ Miin 2.13 .07597
44
45
Tebul nke mbụ dị n’elu ebe a na-egosi na ndịiche dị na mkpọpụta
fọnịm Olundị Nkanụ na-emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm Igbo
Izugbe. Nke a pụtara ihe n’aka miin na standad divieshọn pụtara ihe na ndịna
malite na nke mbụ ruo na nke iri atọ 2.29 – 2.46 niihi na akara miin ndị ahụ
erughi 2.5 bụ miin ọnọdụ mkpebi miin anabatara na nchọcha. Nke a gosiri na
o nweghi okwu ọbụla ụmụakwụkwọ kpọtara nke ọma n’ime okwu iri atọ e
nyere ha ka ha kpọpụta. Ọ gosiri na e nwere ndịiche na mkpọpụta fọnịm
Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. Ọzọ kwa, niihi na akara miin ndị ahụ
niile pụtara ihe na tebul nke mbụ erughi 2.5, o gosiri na olundị Nkanụ na-
emetụta ụmụakwụkwọ n’ịkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe. Tinyere nke a
mgbakọtaọnụ miin bụ 2.13 nke gosirikwaziri na mkpọpụta fọnịm olundị
Nkanụ nwere ndịiche na nke Igbo Izugbe.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Abụọ
Olee myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe?
46
Tebul nke Abụọ: Miin na Standad Divieshọn na-egosi myiri dị n’etiti
mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe.
Ọgụ Ndepụta Okwu Igbo/Ndịna
Ndepụta na Bekee
SD Mkpebi
1 Nwoke Male 2.29 .456 Ọ dabaghị 2 Nwaanyị Female 2.10 .312 Ọ dabaghị 3 Onye Who 2.07 .269 Ọ dabaghị 4 Afọ Stomach 2.08 .273 Ọ dabaghị 5 Ihe Thing 2.10 .306 Ọ dabaghị 6 Anya Eye 2.13 .342 Ọ dabaghị 7 Isi Head 2.09 .295 Ọ dabaghị 8 Osisi Stick 2.08 .276 Ọ dabaghị 9 Onyinye Gift 2.08 .286 Ọ dabaghị 10 Ụlọ House 2.08 .273 Ọ dabaghị 11 Anyanwụ Sun 2.08 .282 Ọ dabaghị 12 Were Take 2.35 .477 Ọ dabaghị 13 Ụkpaka Oil-bin 2.17 .378 Ọ dabaghị 14 Enwe Monkey 2.10 .309 Ọ dabaghị 15 Aṅaa How 2.02 .146 Ọ dabaghị 16 Ñụọ Drink 2.03 .194 Ọ dabaghị 17 Anyịnya Horse 2.03 .184 Ọ dabaghị 18 Nwa Child 2.05 .218 Ọ dabaghị 19 Aka Hand 2.07 .259 Ọ dabaghị 20 Aṅara Garden egg 2.22 .418 Ọ dabaghị 21 Ọnwa Moon 2.08 .282 Ọ dabaghị 22 Eligwe Heaven 2.06 .240 Ọ dabaghị 23 Anyasị Dark 2.08 .273 Ọ dabaghị 24 Nye Give 2.10 .301 Ọ dabaghị 25 Mmadụ Human being 2.05 .236 Ọ dabaghị 26 Nṅomi To emulate 2.21 .409 Ọ dabaghị 27 Agha War 2.26 .439 Ọ dabaghị 28 Ọṅụ Happiness 2.11 .317 Ọ dabaghị 28 Akpa Bag 2.21 .413 Ọ dabaghị 30 Nwere Have 2.46 .499 Ọ dabaghị Mgbakọtaọnụ Miin 2.13 .0759 Tebul nke abụọ na-egosi na e nweghi myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm
olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe niihi na akara miin ndịna malite na nke
mbụ ruo na nke iri atọ 2.29 – 2.46 erughi 2.5 bụ akara miin ọnọdụ mkpebi
miin ndị a nabatara na nchọcha a. Nke a gosiri na mkpọpụta okwu ndị ahụ e
nyere ụmụakwụkwọ ezipụtaghị myiri n’etiti olundị Nkanụ na nke Igbo
47
Izugbe. Nke a na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe niihi na e
nweghi myiri dị n’okwu ụfọdụ dị n’olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe.
Ọzọ kwa mgbakọtaọnụ akara miin e nwetara na tebul nke abụọ bụ
2.13 nke zipụtara na e nweghi myiri na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na
nke Igbo Izugbe niihi na akara miin ahụ erughi 2.5.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Atọ
Kedu ka Olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe?
Tebul Nke Atọ: Miin na Standad Divieshọn na-egosi etu olundị Nkanụ si
emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe.
Ọnụọgụ Okwu Igbo Mkpụrụokwu Bekee SD Mkpebi 1 Nwere Have 2.52 .499 Ọ dabara 2 Akpa Bag 2.74 .438 Ọ dabara 3 Ọṅụ Happiness 2.04 .204 Ọ dabaghị 4 Agha War 2.36 .481 Ọ dabaghị 5 Nṅomi To emulate 2.05 .231 Ọ dabaghị 6 Mmadụ Human being 2.12 .333 Ọ dabaghị 7 Nye Give 2.16 .370 Ọ dabaghị 8 Anyasị Dark 2.05 .227 Ọ dabaghị 9 Eluigwe Heaven 2.12 .330 Ọ dabaghị 10 Ọnwa Moon 2.15 .358 Ọ dabaghị 11 Aṅara Garden-egg 2.09 .289 Ọ dabaghị 12 Aka Hand 2.84 .358 Ọ dabara 13 Nwa Child 2.52 .499 Ọ dabara 14 Anyịnya Horse 2.05 .231 Ọ dabaghị 15 Ṅụọ Drink 2.03 .178 Ọ dabaghị 16 Gbaghara Forgive 2.04 .209 Ọ dabaghị 17 Enwe Monkey 2.02 .146 Ọ dabaghị 18 Ụkpaka Oil-bin 2.03 .194 Ọ dabaghị 19 Were Take 2.03 .184 Ọ dabaghị 20 Anyanwụ Sun 2.05 .218 Ọ dabaghị 21 Ụlọ House 2.07 .259 Ọ dabaghị 22 Onyinye Gift 2.22 .418 Ọ dabaghị 23 Osisi Stick 2.08 .282 Ọ dabaghị 24 Isi Head 2.06 .240 Ọ dabaghị 25 Anya Eye 2.02 .149 Ọ dabaghị 26 Ihe Thing 2.03 .194 Ọ dabaghị 27 Afọ Stomach 2.03 .184 Ọ dabaghị 28 Onye Who 2.05 .218 Ọ dabaghị 28 Nwaanyị Female 2.07 .259 Ọ dabaghị 30 Nwoke Male 2.22 .418 Ọ dabaghị Mgbakọtaọnụ Miin 2.16 .098
48
Tebul nke atọ dị n’elu ebe a na-egosi na Olundị Nkanụ na-emetụta
ụmụakwụkwọ nke ukwu n’odide Igbo Izugbe niihi na ọ bụ naani ndị nke
mbụ, nke abụọ, nke iri na abụọ na iri na atọ nwere akara miin 2.52, 2.74,
2.84 na 2.52 nke ruru 2.5 bụ miin ọnodụ mkpebi akara miin anabatara na
nchọcha a. Nke a gosiri na ọ bụ naanị okwu anọ ka ụmụakwụkwọ nwere ike
idepụta n’Igbo Izugbe. N’aka nke ọzọ ndịna malite na nke atọ ruo na nke iri
na otu ma bido na nke iri na anọ were ruo na nke iri atọ nwere akara miin
pere mpe karịa 2.5. Nke a gosiri na ụmụakwụkwọ enweghi ike idepụta okwu
ndị ahụ n’Igbo Izugbe nke gosiri na olundị Nkanụ na-emetụta ha n’odide
Igbo Izugbe. Ọzọ kwa, mgbakọtaọnmiin bụ 2.16 nke dị nta karịa 2.5 bụ
ọnọdụ miin mkpebi ndị a nabatara na nchọcha.
Aj ụjụ Nchọcha nke Anọ
Olee ka Mpaghara ebe Ụlọakwụkwọ dị si emetụta Ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta dị na zoon mmụta Agbanị na
Steeti Enugwu?
Tebul Nke Anọ: Miin na Standad Divieshọn na-egosi etu mpaghara ebe
ụlọakwụkwọ di si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
Ọgụ Ebe Ụlọakwụkwọ N SD
1 Ebe mepere emepe 173 2.191 .0850
2 Ebe emepeghi emepe 284 2.124 .0484
Mgbakọtaọnụ Miin 2.157
49
Tebul nke anọ na-egosi na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụta
ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe. O gosiri na ụmụakwụkwọ nọ ebe
mepere emepe ka mee nke ọma n’ọmụmụ Igbo Izugbe karịa ndị nọ n’ebe
emepeghị emepe niihi na miin 2.124 ebe emepeghị emepe dị nta karịa nke
ndị nọ ebe mepere emepe bụ 2.191 standad divieshọn ha bụ 0.484 na .0850
n’otu n’otu. Etu o sịla dị miin ndị ahụ bụ 2.124 na 2.191 erughi 2.5 bụ miin
ọnọdụ mkpebi miin a nabatara na nchọcha a. Nke a pụtara na mpaghara ebe
ụlọakwụkwọ dị na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Ise
Kedu ka jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe n’odo
sekọndịrị nta dị na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu?
Tebul Nke Ise: Miin na Standad Divieshọn na-egosi etu jenda si emetụta
ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
Ọgụ Jenda N SD
1 Oke 172 2.138 .0580
2 Nwaanyị 285 2.156 .0791
Mgbakọtaọnụ Miin 2.147
Miin na standad divieshọn pụtara ihe na tebul nke ise na-egosi na
jenda na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe. O gosiri na ndị
nwaanyị ka mee nke ọma na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ niihi na akara
miin ha bụ 2.156 gafeere nke ndị oke bụ 2.138. Site na tebul nke ise, ọ bụ
50
ezie na miin ndị oke bụ 2.138; ebe nke ndị nwaanyị bụ 2.156, mana ha abụọ
erughi ‘2.5’ bụ akara miin ọnọdụ mkpebi miin ndị a ga-anabata na nchọcha
nke gosiri na jenda na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe n’ogo
sekọndịrị nta dị na zoon mmụta Agbanị na steeti Enugwu. Ọzọ kwa, o
gosikwara na Olundi Nkanụ na-emetuta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo
Izugbe.
Nnwale Ụmaokwu Nke Mbụ (HO1) site n’iji T-test
HO1: E nweghi ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ nọ
n’ime obodo na nke ndị nọ n’obodo mepere emepe n’ịkpọpụta fọnịm Igbo
Izugbe.
Tebul nke Isii na-egosi ndịmiche n’akara miin agbammbọ
ụmụakwụkwọ dị ka o si metụta ebe ụlọakwụkwọ dị.
Ebe ụlọakwụkwọ t df Sig (2-tailed)
Miin Ndimiche
Mkpebi
Ebe mepere emepe 10.738 455 .000 .06705 NS
Ebe emepeghị emepe 9.479 241.081 .000 .06705 NS
Mgbakọtaọnụ 20.217 696.081
Tebul nke isii na-egosi na akara miin ndịmiche ndị ụmụakwụkwọ nọ
ebe mepwere emepe na ebe emepeghi emepe bụ 0.000 nke pere mpe karịa
0.05 bụ ogo ndịmiche e ji nwalee ụmaokwu nchọcha a. Nke a pụtara na a
nabataghị ụmaokwu nchọcha a nke gosiri na e nwere ezigbo ndịmiche
51
n’ọsịsa akara miin ụmụakwụkwọ nọ n’ebe mepere empe na nke ndị nọ ebe
emepeghị emepe.
Nnwale Ụmaokwu nke Abụọ:
HO2: Enweghi ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị
nwoke na ndị nwaanyị n’ịkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe.
Tebul Nke Asaa: Akara miin agbammbọ nnwale ụmaokwu etu jenda si
emetụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe.
Jenda t df Sig (2-tailed) Miin Ndimiche
Mkpebi
Oke -2.628 455 .009 Ndimiche
Nwaanyị -2.831 437.823 .005 -.01825
Mgbakọtaọnụ -5.459 892.823
Tebul nke asaa dị n’elu ebe a na-egosi akara miin ndimiche
agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị nwoke na nke ndị nwaanyị nke bụ -.01825 na -
.01825 n’otu n’otu. Ọzọ kwa akara ndịmiche ndị nwoke bụ .009 ebe nke ndị
nwaanyị bụ .005. O gosiri na akara ndị ahụ dị nta karịa 0.05 bụ ogo nnwale
ụmaokwu nchọcha a. Nke a gosiri na e nwere ezigbo ndịmiche n’akara miin
agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị.
52
Nchịkọta Ihe A Chọpụtara
Site na rizọlt nchọcha e depụtara n’elu ebe a, a chọpụtara na:
Tebul nke mbụ gosiri na e nwere ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị
Nkanụ na nke Igbo Izugbe nke na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo
Izugbe; Tebul nke abụọ gosikwaziri na e nweghi myiri na mkpọpụta fọnịm
olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe; Ọzọ kwa, tebul nke atọ gosipụtara na
olundị Nkanụ na-emetụta ụmụakwụkwọ ndị sekọndịrị nta n’odide Igbo
Izugbe ebe Tebul nke anọ na nke ise gosiri na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị
na jenda na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
53
ISI NKE ISE
NKATA, MMECHI, IHE ND Ị NWERE IKE ỊDAPỤTA NA MM ỤTA
N’ỌDỊNIHU, AT ỤMAT Ụ/NTỤNYEUCHE, NSOGBU E ZUTERE NA
NCHỌCHA, EBE NDỊ ỌZỌ KWESIRI IMEKWU NCH ỌCHA,
NCHỊKỌTA
N’isi nke ise, onye nchọcha lebara anya n’ihe ndị a: Nkata maka rizọlt,
mmechi, ihe ndị nwere ike ịdapụta na mmụta n’ọdịnihu,
Atụmatụ/Ntụnyeuche, Nsogbu e zutere na nchọcha, Ebe ndị ọzọ kwesiri
imekwu nchọcha na Nchịkọta.
Nkata Maka Rịzọlt
Aj ụjụ Nchọcha nke Mbụ: Kedu ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị
Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
Rizọlt e nwetara maka ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na
nke Igbo Izugbe gosiri na e nwere ezigbo ndịiche na mkpọpụta okwu ụfọdụ.
Nke a pụtara ihe na miin niile dị na tebul nke mbụ nke malitere na miin
ndịna nke mbụ 2.29 wee ruo na miin ndịna nke iri atọ bụ 2.46. Ihe nke a
pụtara bụ na o nweghi okwu ọbụla ụmụakwụkwọ kpọtara nke ọma n’ime
okwu iri atọ e nyere ha. Nke a bụ niihi na o nweghi miin ọbụla ruru 2.5 bụ
miin ọnọdụ mkpebi. Niihi nke a, o gosiri na e nwere ndịiche na mkpọpụta
fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. Anọzie (1999) kwadoro na fọnịm
bụ ụdaasụsụ nke na-ebute nghọta dị iche iche na mkpụrụokwu abụọ maọbụ
karịa bụ ndị yiri onwe ha ma e wezuga otu mkpụrụụda ndi ahụ. Ọzọ kwa,
53
54
Ngoesi (2000) kọwara na olundị di iche iche mere ka ọ na-esiri ndị si n’otu
mpaghara ala Igbo ike ịghọtagbado ihe ndị si na mpaghara ọzọ na-asụ.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Abụọ: Olee Myiri d ị n’etiti Mkp ọpụta Fọnịm
Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
Site na rizọlt e nwetara maka myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị
Nkanụ na nke Igbo Izugbe, o gosiri na e nweghi myiri dị n’etiti mkpọpụta
okwu n’olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. Nke a bụ niihi na akara miin
zipụtara etu ụmụakwụkwọ si kpọpụta okwu e nyere ha malitere na 2.29 wee
ruo na 2.46 nke erughi 2.5 bụ miin ọnọdụ mkpebi miin ndị a nabatara na
nchọcha a. Nke a pụtara na onweghi okwu ụmụakwụkwọ kpọtara nke ọma
etu e si akpọ ha n’Igbo Izugbe.
Ọzọ kwa, niihi na ụmụakwụkwọ enweghi ike kpọọ okwu ndị ahụ etu o
kwesiri n’Igbo Izugbe, o gosiri na e nweghi myiri n’etiti mkpọpụta okwu
n’olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe. Nke a na-emetụta ha n’ọmụmụ Igbo
Izugbe. Nke a dabara n’ihe onyeisi ule WAEC (2002) kwuru na
ụmụakwụkwọ emeghi nke ọma n’ajụjụ nke atọ e nyere ha n’ule. O kwuru na
a tụrụ anya ka ụmụakwụkwọ gosipụta ebe mkpọpụta fọnịm maọbụ
mkpụrụụdaasụsụ ndị a: /m/ /p/ /b/ /f/ /n/ ma ndị zara ajụjụ a ebughi ibu niihi
na isiokwu a eteela o bidoro bụụrụ ụmụakwụkwọ nnukwu nsogbu. Nke a
gosiri na enweghi myiri na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe.
55
Aj ụjụ Nchọcha Nke Atọ: Kedu ka Olundị Nkanụ si emetụta
Ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe?
Nchọpụta nchọcha/rizọlt e nwetara na tebul nke atọ gosiri na olundị
Nkanụ na-emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe. Nke a pụtara ihe na
ndịna nke mbụ, nke abụọ, nke iri na abụọ na nke iri na atọ niihi na ha nwere
miin 2.52, 2.74, 2.84 na 2.52 n’otu n’otu. Miin ndị ahụ gafeere 2.5 bụ ọnọdụ
mkpebi miin ndị a nabatara na nchọcha a. Nke a gosiri na ọ bụ naanị okwu
anọ ka ha detara nke ọma n’ime okwu iri atọ e nyere ha dee n’Igbo Izugbe.
Miin ndịna ndị ọzọ malitere na 2.04 ruo na 2.22 ndị erughi 2.5 bụ miin
ọnọdụ mkpebi miin ndị a nabatara na nchọcha a nke gosiri na olundị Nkanụ
na-emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe. Iji kwado nke a, Ngoesi
(2000) kọwara na mgbanwe na mkpụrụụda na-ebute ndịiche n’olundị na
Igbo Izugbe n’ụdị fọnọlọjị nke na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo
Izugbe ọ kachasị n’odide Igbo. O gosiri na ọmụmụ asụsụ abụghị naanị na
mkpọpụta kama o metụtara odide ya.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Anọ: Olee ka Mpaghara ebe Ụlọakwụkwọ dị si
emetụta Ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe n’ogo Sekọndịr ị Nta dị na
Zoom Mmụta Agbanị na Steeti Enugwu?
Rizọlt nchọcha gbasara etu mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta
ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe gosiri na ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ebe
mepere emepe ka mee nke ọma na mkpọpụta okwu n’Igbo Izugbe karịa ndị
nọ n’ebe emepeghị emepe. Nke a bụ niihi na miin agbammbọ ụmụakwụkwọ
56
ndị nọ ebe mepere emepe bụ 2.191, ebe nke ndị nọ ebe emepeghị bụ 2.124.
Miin agbammbọ 2.191 gafeere nke 2.124. O gosiri na ndị nọ n’ebe mepere
emepe ka eme nke ọma n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe karịa ndị ogbo ha nọ
n’ime obodo. Ọzọ kwa, n’agbanyeghi na miin ndị nọ n’ebe mepere emepe
gafeere nke ndị nọ ebe emepeghi emepe, miin abụọ ndị ahụ erughị 2.5 bụ
miin ọnọdụ mkpebi miin a nabatara na nchọcha a. Nke a pụtara na mpaghara
ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe.
Nke a dabara na nchọpụta Ntumi (1983) niihi na o kwuru na ndịiche dị
na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-apụta ihe na mmụta asụsụ ha. Nke a
gosiri na mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ
Igbo Izugbe. N’ịga n’ihu, Ụmọ (2001) kwadoro nke a niihi na o kwuru na
ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa ndị
nọ n’obodo emepeghị emepe n’ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọzọ kwa, Ọbasị (2011)
kọwara na ọ bụrụla ihe a maara nke ọma na ụlọakwụkwọ ndị nọ n’obodo
mepere emepe na-aka eme nke ọma karịa ndị nọ n’obodo emepeghị emepe
niihi na a na-enwe ndị nkụzi a zụrụ nke ọma na ngwa nkụzi ndị ọzọ n’obodo
mepere emepe karịa n’obodo emepeghị emepe.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Ise: Kedu ka Jenda si emetụta Ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ Igbo Izugbe n’ogo Sekọndịr ị Nta dị na Zoon Mmụta Agbanị
na Steeti Enugwu?
Nchọpụta nchọcha e nwetara n’ajụjụ nchọcha nke ise maka jenda
gosiri na jenda na-emetụta ụmụakwụkwọ n’ogo sekọndịrị nta n’ọmụmụ Igbo
57
Izugbe. O gosikwara na ndị nwaanyị ka mee nke ọma na mkpọpụta okwu ndị
ahụ e nyere ha ka ha kpọpụta. Ọzọ kwa, rizọlt nchọcha a gbasara jenda
gosikwara na Olundị Nkanụ ka emetụta ndị nwoke n’ọmụmụ Igbo Izugbe
karịa nnwaanyị. Nke a pụtara ihe na miin agbammbọ ha niihi na ebe miin ndị
nwaanyị bụ 2.156, nke ndị nwoke bụ 2.138. N’agbanyeghị nke a, miin abụọ
ndị ahụ erughi 2.5 bụ miin ọnọdụ mkpebi miin a nabatara na nchọcha. Ọzọ
kwa, mgbakọtaọnụ miin ha bụ 2.147 nke erughi 2.5. Niihi nke a, o kwesiri
ikwu na olundị Nkanụ na-emetụta ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị
na mkpọpụta/ọmụmụ Igbo Izugbe.
Wale (1999) kwadoro nke a mgbe o kwuru na ụmụ nwaanyị na-enwe
mmasị n’asụsụ karịa ndị nwoke. Umo (2001) chọpụtakwara na a bịa n’ihe
gbasara aghọtaazaa na nkọwa n’asụsụ ọbụla na ụmụnwaanyị na-enwekarị
mmụọ ịmụ asụsụ karịa ụmụ nwoke. Iji kwado nke a, Akabogu (2002) gosiri
na ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị na-amụtakarị asụsụ ọsọọsọ karịa ndị nwoke
mgbe o kwuru na ndịiche dị na jenda bụ otu ụzọ pụtakarịrị ihe e si egosipụta
na ndị nwaanyị ka eme nke ọma n’ịmụ asụsụ dị iche iche karịa ndị nwoke
n’ụlọakwụkwọ. Akabogu kọwakwara na malite n’ikwu okwu, ndị nwaanyị
na-aka eme nke ọma n’ịkpọpụta okwu ndị nwere otu ụda na ụda abụọ. Ya
bụ, jenda ka emetụta ụmụakwụkwọ ndi nwoke n’ọmụmụ Igbo Izugbe na
Sekondịrị nta dị na zoon mmụta Agbanị nke steeti Enugwu.
58
Ihe Ndị Nwere Ike Ịdapụta na Mmụta N’ọdịnihu
Ọtụtụ ihe nwere ike ịdapụta na mmụta n’ọdịnihu site na nchọpụta
nchọcha a bụ:
a) Ọ bụrụ na ndị gọvmenti agbaghị mbọ hụ na ọ bụ naanị ndị nkụzi a
zụrụ nke ọma n’asụsụ Igbo na-akụzi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ, bụ ndị
ga-enye aka kụziere ụmụakwụkwọ myiri na ndịiche dị n’etiti
mkpọpụta fọnịm olundị dị iche iche na nke Igbo Izugbe, ọ ga-eme ka
ụmụakwụkwọ na-agwakọrịta olundị ha na nke Igbo Izugbe ọnụ mgbe
ha na-akpọpụta ma na-edekwa asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ. Ọnọdụ dị
etu a ga-ebutere ụmụakwụkwọ ndọghachi azụ na-agbammbọ ha
n’ụlọakwụkwọ ya na n’ule asụsụ Igbo dị iche iche.
b) Ebe ọ bụ na nchọpụta sitere na nchọcha a gosiri na Olundị Nkanụ na-
emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe, nke a gana-adọghachi
ụmụakwụkwọ azụ n’edemede asụsụ Igbo dị iche iche n’ụlọakwụkwọ.
c) Nchọpụta sitere na nchọcha a gosiri na ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo
mepere emepe ka mee nke ọma karịa ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo
emepeghị emepe n’ịkpọpụta na idepụta fọnịm Igbo Izugbe, nke a
nwere ike ime ka ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo emepeghi emepe na-
agbapụ n’ụlọakwụkwọ ha na-agbaga n’ụlọakwụkwọ ndị dị n’obodo
mepere emepe. Nke a agaghị eweta nkwalite elu n’ebe ụlọakwụkwọ
ndị nọ n’ime obodo dị.
59
d) Nchọpụta nchọcha a gosịkwara na jenda na-emetụta ụmụakwụkwọ ndị
sekọndịrị nta na zoon mmụta Agbanị na steeti Enugwu. Nchọpụta a
zipụtara na ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị mere nke ọma karịa
ụmụakwụkwọ ndị nwoke n’ịkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe. Nke a na-
egosi na ihe nwere ike ịdapụta n’ọdịnihu bụ na a ga-aka nwee ọtụtụ
ndị nwaanyị ndị na-eme nke ọma n’ọmụmụ asụsụ Igbo karịa ndị
nwoke.
Nsogbu E Zutere Na Nchọcha
Onye nchọcha zutere nsogbu ndị a mgbe ọ na-eme nchọcha.
a. Ọ hịara onye nchọcha ahụ ịchọta akwụkwọ dị iche iche o jiri mee
nchọcha n’isiokwu o mere nchọcha na ya.
b. O were onye nchọcha ọtụtụ ụbọchị ịga n’ụlọakwụkwọ ndị o jiri mee
nchọcha ga zụọ ndị nkụzi ga-enyere ya aka kee ma nakọtakwa ngwa
ọrụ o jiri mee nchọcha.
c. Onye nchọcha zụtakwara nsogbu ụkọ ego niihi na ọtụtụ ọnụọgụ
ụlọakwụkwọ e jiri mee nchọcha bụkarị n’ime ime obodo ka ha dị. Nke
a mere na onye nchọcha na-agbafu nnukwu ego tupu o ruo
n’ụlọakwụkwọ ndị ahụ.
d. Nsogbu ọzọ bụ na ọ hịara onye nchọcha ahụ ịga n’otu ụlọakwụkwọ
ugboro ugboro iji hụ na ọ nakọtachara ngwa ọrụ nchọcha ya.
60
Ntụnyeuche/Atụmatụ
Site na nchọpụta nchọcha a ka onye nchọcha si atụpụta ntụnyeuche
ndị a:
a. O kwesiri ka ndị nkụzi asụsụ Igbo tinye uchu hụ na ụmụakwụkwọ
mụtara nke ọma myiri na ndịiche dị n’etiti mkpọpụta fọnịm olundị na
nke Igbo Izugbe.
b. Ndị nkụzi ga-agba mbọ were naanị fọnịm Igbo Izugbe na-akụziri
ụmụakwụkwọ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ, ọ kachasị ụlọakwụkwọ ndị
nọ na-ebe emepeghị emepe.
c. Govmenti ga-agba mbọ hụ na ọ bụ naanị ndị nkụzi a zụrụ nke ọma
n’ọmụmụ asụsụ Igbo ga na-akụzi ya bụ asụsụ n’ụlọakwụkwọ dị iche
iche.
d. O kwesiri ka gọvụmentị chịkọbara ndị nhazi kọrịkulum ọzụzụ Izugbe
maka ịhazi kọrịkulum ọmụmụ asụsụ Igbo nke isiokwu ya ga-agbado
ụkwụ n’ọlundị, Igbo Izugbe na mkpụrụụdaasụsụ.
e. Ụmụakwụkwọ ndị nwoke kwesiri ka e nwee ihe onyinye ajamike a ga
na-enye ha iji wee kwalite mmụọ ha n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe ka
ha ghara ịdị na-ala azụ na mmụta asụsụ Igbo Izugbe.
f. Ndị ode akwụkwọ Igbo kwesiri iji naanị fọnịm Igbo Izugbe na-ede
akwụkwọ niile e ji eme ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ niile.
61
g. O kwesiri ka gọvụmenti na-enye ndị nkụzi nọ n’obodo emepeghị
emepe ihe onyinye agbamume ka ha ghara ịdị na-agbapụ gaa naanị
n’ụlọakwụkwọ ndị dị n’obodo mepere emepe.
Ebe Ndị Kwesiri Imekwu Nchọcha
Ebe ndị ọzọ onye nchọcha na-ele anya na o kwesiri ka ndị ọzọ ga-eme
nchọcha lebaa anya gụnyere:
a. Mmetụta Fọnịm Olundị Ọgwụ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe n’ogo
sekọndịrị nta na zoon mmụta Ọgwụ na Steeti Enugwu.
b. Ntụle mmetụta fọnọlọ Olundị dị iche iche n’ọmụmụ Igbo n’ogo sịnịọ
sekọndịrị na zoon mmụta Izii na Steeti Aboyi.
c. Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta Fọnịm Igbo Izugbe n’ogo sịnịọ
sekọndịrị na zoon mmụta Agbanị na Steeti Enugwu.
Nchịkọta
Nchọcha a lebara anya na Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta
Fọnịm Igbo Izugbe n’ogo Sekọndịrị nta na Zoon Mmụta Agbanị na Steeti
Enugwu. Onye nchọcha haziri isiokwu nchọcha a n’ụzọ ise zuru oke.
Isi nke mbụ metụtara mkpọlite. N’ebe a, onye nchọcha lebara anya
n’ihe ndị a: Ntọala nchọcha, Nsogbu nchọcha, Mbunuche nchọcha, Uru
nchọcha, Oke nchọcha, Ajụjụ nchọcha na Ụmaokwu. N’isi nke abụọ bụ
ntụleghari agụmagụ, onye nchọcha haziri nke a n’ụzọ anọ ndị gụnyere: Atụtụ
nkọwa, Atụtụ mmụgharị, Nchọcha a hụrụ anya na Nchịkọta ntụlegharị
62
agụmagụ. Ọzọ, n’isi nke atọ, onye nchọcha lebakwara anya n’ihe ndị a: Ụdị
nchọcha, Ebe nchọcha, Ndị e ji mee nchọcha, Nsere na usoro nsere, Ngwa
nchọcha, Nnyocha ngwa nchọcha, Nnwale ntụkwasiobi ngwa nchọcha,
Usoro nnweta ihe nchọcha na Usoro nhazi ihe nchọcha maọbụ data. N’isi
nke anọ, onye nchọcha haziri ihe a chọpụtara na tebul site n’ịgbasoro ajụjụ
nchọcha ndị ahụ duziri nchọcha a. N’ikpeazụ, onye nchọcha nọrọ n’isi nke
ise wee lebaa anya na nkata maka rizọlt, mmechi, ihe ndị nwere ike ịdapụta
na mmụta n’ọdịnihu, Atụmatụ, Ntụnyeuche, Nsogbu e zutere na nchọcha,
Ebe ndị ọzọ kwesiri imekwu nchọcha na nchịkọta.
63
NRỤTỤAKA Adigwe, J.C. (1992). Gender differences in chemical problem solving
among Nigerian students. Research, Science and Technological Education 10 (2) 187-201.
Akabogu, J.U. (2002). Effects of secondary school students’ exposure to English language registers contextual clues on achievement in reading comprehension. A Ph.D thesis (Unpublished) Arts Education Dept. UNN.
Akabogu, J.U. (2006). The relevance of ICTs in the teaching and leaning of English as a second language in Nigerian secondary school. In D.Eze & N.Onyegegbu. Information and Communication Technology in the Service of Education, 1 (1) 225-247
Ali, A. (2006). Conducting research in education and the social sciences. Enugu: Tashiwa Network.
Anagbogu, P.N. (2001). Introduction to linguistics. Awka: J.E.C. Press.
Anozie, C.C. (1999). Lingwistiki sayensị asụsụ. Enugu: Tashiwa Networks Publishers.
Azikiwe, U. (1998). Language learing and teching, Nsukka: Fulladu Publication Company.
Bandura, A. (1925). Social learning theory. Englewood Cliff N.J: Prentice Hall.
Bateson, D. & Parsons, C.S. (1998) Sex-related differences in science achievemnt. A possible testing artifact. International Journal of Science Education (4), 371-285.
Brooks, N. (2006) Language and learning: Theory and practice. New York: Harcourt Brace and World.
Dike, U. & Ugorji, J.U. (1989) Ụmị nkọwa utọasụsụ Igbo. Onitsha: Kawuritz and Manilas Publishers.
64
Ebe, A.E. (2008) Phonological problems encountered by Igbo learners of English language as L2 in post primary schools in Isi-Uzo L.G.A of Enugu State. Journal of Languages and Literature. (l.2), 2. F.C.E Eha-Amufu 23-32.
Emenanjo, E.N. (1978). Elements of mordern Igbo grammar. Ibadan: Oxford University Press.
Ewelum, C. (2010). Mmeta nke Ọma N’Ụtọasụsụ n’ule secọndịrị. Ntụle Ụmụ akwụkwọ Asumabụọ na Zoonu Mmụta Nsụka dị na Steeti Enugwu. Unpublished M.Ed. Thesis, University of Nigeria Nsukka.
Faloye, E. (1985). Factors affecting candidate’s performance in West African School Certificate Examination. Researach Report. 4-6
Farinde, R.O. (2005). Nigerian Languages in Education and National Development. Journal of Teacher Education. Ondo, 81 (pp.19-25).
Federal Republic of Nigeria (2004). National policy on education. Lagos: NERDC Press.
http//www.wikipedịa.com (2011). fọnịmnkeigboizugbe.org.ny/pdf
Ikekọnwụ, C.I. (1986). A lexico phonotactic study of Northern Igbo Dialect. PhD. Thesis, University of Nigeria.
Imoagene, O. (1979). Predicting success in developing society. 5th Inaugural Lecture, 1978/79, Faculty of Social Sciences, University of Ibadan.
Lawless, L.K. (2005). English Dialects retrieved from WWW.elearnenglishlanguage.com
Madu, B.C. (2004). Effects of a constructive-based instructional model on students’ conceptual change and retention in physics. Unpublished Ph.D. Desertation, faculty of Education, University of Nigeria, Nsukka.
Mgbodile, T. O. (2000). Understanding children. A better way to useful upbringing. Enugu: Magnet Business Enterprises.
65
Mohammed, A. (1995). Communicative competence acquisition in infelicitous learning environment: The problem with SSS English in Nigeia. In A Bamgbose et al (Eds). New English 52-68. Nigeria: Nusoro Publishers.
Ngoesi, M.C (2000). Nchịkọta ihe Ọmụmụ Nke Asụsụ Igbo. Anambara: Optimal Press.
Nnachi, R.O. (2007). Advanced psychology of learning and scientific enquiries. Owerri: Toban Publishers.
Nnene, B.G. (2006) Analysis of error between English phonological parterns and Ọgwụ Dialect of Igbo Among Senior secondary School Students in Awgu Education Zone of Enugu State. M.Ed. Project, Department of Arts Educaion, University of Nigeria Nsukka.
Ntumi, A. (1983). The socio-cultral environment of the African child: Implication for curriculum development for early childhood education: Journal of the Counselling Association of Nigeria, The Consellor,81-88.
Nwagu, E.K. (1990). Development and standardization of social studies achievement test (SSATS) for junior secondary schools in Anambra State. PhD Thesis. Department of Social Studies, University of Nigeria Nsukka.
Nwadike, I. U. (2002). Igbo Language in Education: An historical study. Anambra State, Nigeria: Pacific publishers.
Nwodo, C.S. (2008). Applied English Linguistics: An introductory approachi. Nigeria: Liben Press.
Nworgu, B.G. (2006). Educational research: Basic issues and methodology. Nsukka: University Trust Publshers.
Obasi, M.N. (2011)Urban-rural differential in teaching and learning of geography in Ahiazu Mbaise and Owerri municipal counsel in Imo State. Environmental Research Journal. Owerri: Scientific research publishing company.
Ogbo, O. (1984). Saving the Igbo Language. Ụwa Ndị Igbo Journal (1) 103-104.
66
Ogbuehi, C. U. (2002). Interence of mother tongue (Igbo) on English language and suggested solutions: English as a second language in Nigeria. Nsukka: Magnet Business Enterprises
Okoli, A.L. (2005). Ntọala Asụsụ na Agụmagụ Ederede Igbo Enugu: Fidgina Global Books.
Oluikpe, B.O. (1979). Igbo transformational syntax. The Ngwa Dialect Example. Onitsha: African Educational Publishers.
Oluikpe, B.O. & Nwegbe, W.D.(1993). In-service trainning scheme for English teahers in junior secondary schools. Paper Presented at the English Development Programme Workshop, held in Lagos from 24th-26th Novermber. National Language Centre Lagos.
Skinner, B.F. (1957). Verbal Behaviour. New York: Appletion.
SPILC (Society for Promoting Igbo Language and Culture) Recommendations of the Standardization Committee. Vol. 1 1977
The West African Examination Council (WAEC). 1999, 2000, 2003, 2004, 2007, 2008, 2009. Chief Examiners Reports Nigeria. Lagos: WAEC.
Ude, U.F. (2012). Mmetụta Fọnọlọji Olundị Udi n’Omụmụ Asụsụ Igbo Izugbe n’Ogo Sinịọ Sekọndịrị na Zoon Mmụta Nke Udi na Steeti Enugwu. An Unpubished M.Ed. Thesis, University of Nigeria Nsukka.
Ume, I.A.O, Ugoji, J.U. & Dike, G.A. (1989). Ụmị Nkọwa Ụtọasụsụ Igbo. Onitsha: Kawuriz and Manilas Publishers.
Ụmọ, C.U. (2001). Effects of Games on the Achievement and Interest of J.SS. in Igbo Grammar. A Ph.D Thesis. University of Nigeria Nsukka.
Uwalaka, A.J. (2011). “Dialects an Dialects and Dialectical Problems”. A seminar Paper Preseted in Faculty of Education, University of Nigeria Nsukka.
Wale, J.S. (1999). Principle and Practices of Education. Hong: Sheek Weh Tong Printing Press.
Williams, D. (2001). English language teaching: An integrated approach. Ibadan: Spectrum Books.
67
Apendiiks Nke Mbụ
Faculty of Education, Department of Arts Education, School of Postgraduate Studies, University of Nigeria Nsukka. 30th May, 2013
Ezigbo Nna m ukwu/Nne m ukwu,
NGWA NCHỌCHA
Abụ m nwaakwụkwọ na-agụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ a kpọrọ aha
n’elu ebe a. Ana m agụ akwụkwọ maka (M.Ed). Ana m eme nchọcha
n’isiokwu a bụ “Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta Fọnịm Igbo Izugbe”
n’ogo Sekọndịrị nta na Zoon Mmụta Agbanị na Steeti Enugwu
Ana m arịọ ka ị nyocha abụọ ndị a onye nchọcha haziri maka ime
nchọcha a. Ngwa nchọcha ndị ahụ gụnyere nnwale ekwurunọọnụ na ajụjụ
njụmaza. Ntụziaka gị dị mkpa iji hụ na ngwa nchọcha ndị a tozuru maka
inweta ngwa a ga-eji mee nchọcha a.
Daalụ maka enyemaka gị.
Abụ m,
Ugwu Agatha Chinelo (Oriakụ)
68
Faculty of Education, Department of Arts Education, School of Postgraduate Studies, University of Nigeria Nsukka. 30th May, 2013
Ezigbo onye Nzamajụjụ,
Abụ m nwaakwụkwọ na-agụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ a kpọrọ aha ya
n’elu ebe a. Ana m agụ akwụkwọ maka (M.Ed). Ana m eme nchọcha
n’isiokwu a bụ “Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta Fọnịm Igbo Izugbe”
n’ogo Sekọndịrị nta na Zoon Mmụta Agbanị na Steeti Enugwu
Biko, e nwere ngwa nchọcha abụo bụ nnwale mkpọpụta na ajụjụ
njụmaza. E kere ha ụzọ atọ. Mpaghara nke mbụ metụtara ebe ị ga-akọwa
onwe gị; nke abụọ bụ ebe ị ga-akpọpụta okwu ụfọdụ na fọnịm Igbo Izugbe,
ebe mpaghara nke atọ ga-abụ ebe ị ga-aza ajụjụ ederede dị iri.
Ọ dị mkpa ime ka ị mata na o nweghị ihe ọzọ a ga-e ji ụsa/ọsịsa ị ga-
enye wee mee karịa ihe gbasara mmụta.
Daalụ maka enyemaka gị.
Abụ m,
Ugwu Agatha C (Oriakụ)
69
Biko gbaa mbọ kowaa onwe gị nke ọma na Nke ji ‘A’. Nke ji ‘B’ bụ
mkpọpụta okwu ndị ahụ n’Igbo Izugbe. Na nke ji nke atọ ‘CH’, a tụrụ anya
na ị ga-etinye akara ( √ ) na nke ọbụla ị họọrọ dị ka ọsịsa gị.
Nke ji nke mbụ ‘A’. Nk ọwa onwe gị
Aha ụlọakwụkwọ gị ------------------------------------------------------------------
Ebe ụlọakwụkwọ dị (ebe mepere emepe) ( ) (ebe emepeghị emepe) ( )
Ogo Klasị -------------------------------------------------------------------------------
Obodo ----------------------------------------------------------------------------------
Okpuru Ọchịchị ------------------------------------------------------------------------
Jenda Oke ( ) Nwaanyị ( ) ------------------------------------------------------
Maka mkpọpụta okwu ndị ahụ dị n’ajụjụ nchọcha nke mbụ na nke abụọ, lee
anya na nkọwa a:
Ọ kpọtara ya nke ọma – (ỌKPYNỌ)
Ọ kpataghị ya ma ọlị - (ỌKPYMỌ)
Maka ajụjụ nchọcha nke atọ, lekwaazia anya na nkọwa ndị a:
O Detara Ya Nke Ọma (ODYNỌ)
O Detaghị ya ma ọlị (ODYMỌ)
Isiokwu Nchọcha
Mmetụta Olundị Nkanụ na Mkpọpụta Fọnịm Igbo Izugbe N’ogo
Sekọndịrị Nta na Zoon Mmụta Agbanị n’Enugwu Steeti.
70
Mbunuuche Nchọcha
Mbunuuche Izugbe nchọcha a bụ ileba anya na Mmetụta Olundị Nkanụ
na Mkpọpụta Fọnịm Igbo Izugbe n’ogo Sekọndịrị Nta na zoonu Mmụta
Agbanị n’Enugwu Steeti. Nchọcha a ga-elebakwazị anya n’ihe ndị a:
1. Ịchọpụta ndịiche dị n’etiti mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo
Izugbe.
2. Ịchọpụta myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe.
3. Ịmata ma o nwere ka Olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’odide
Igbo Izugbe.
4. Ịchọpụta ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe.
5. Ileba anya ka jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe.
Aj ụjụ Nchọcha
Ajụjụ nchọcha ndị a ga-enye aka duzie nchọcha a
1. Kedu ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
2. Olee myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
3. Kedu ka Olundị Nkanụ si emetụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe?
4. Olee ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị sị emetụta ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe n’ogo sekọndịrị nta dị na zoonu mmụta
Agbanị n’Enugwu Steeti?
5. Kedu ka jenda sị emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe
n’ogo sekọndịrị nta dị na zoonu mmụta Agbanị na Steeti Enugwu?
71
Ụma Okwu
A ga-anwale ụma okwu ndịa n’ogo akara mpụtara ndịmiche bụ 0.05.
Ho1 Enweghị ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ
ụmụakwụkwọ nọ n’ime obodo na nke ndị nọ n’obodo mepere
emepe n’ịkpọpụta fọnịm Igbo Izugbe.
Ho2 Enweghị ezigbo ndịmiche n’akara miin agbammbọ
ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị n’ịkpọpụta fọnịm
Igbo Izugbe.
Aj ụjụ Nchọcha Nke Mbụ
Kedu ndịiche dị na mkpọpụta fọnịm olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
Ọgụ Ndepụta okwu Igbo Ndepụta na Bekee 1. Nwoke Male 2. Nwaanyị Female 3. Onye Who 4. Afọ Stomach 5. Ihe Thing 6. Anya Eye 7. Isi Head 8. Osisi Stick 9. Onyinye Gift 10. Ụlọ House 11. Anyanwụ Sun 12. Were Take 13. Ụkpaka Oil –bin 14. Enwe Monkey 15. Aňaa How 16. Ňụọ Drink 17. Anyịnya Horse 18. Nwa Child 19. Aka Hand 20. Aňara Garden egg 21. Ọnwa Moon 22. Eligwe Heaven 23. Anyasị Dark
72
24. Nye Give 25. Mmadụ Human being 26. Nṅomi To emulate 27. Agha War 28. Ọňụ Happiness 29. Akpa Bag 30. Nwere Have
Aj ụjụ Nchọcha Nke Abụọ
Olee myiri dị n’etiti mkpọpụta fọnịm Olundị Nkanụ na nke Igbo Izugbe?
Ọgụ Ndepụta okwu Igbo Ndepụta na Bekee 1. Nwoke Male 2. Nwaanyị Female 3. Onye Who 4. Afọ Stomach 5. Ihe Thing 6. Anya Eye 7. Isi Head 8. Osisi Stick 9. Onyinye Gift 10. ụlọ House 11. Anyanwụ Sun 12. Were Take 13. Ụkpaka Oil –bin 14. Enwe Monkey 15. Aňaa How 16. Ňụọ Drink 17. Anyịnya Horse 18. Nwa Child 19. Aka Hand 20. Aňara Garden egg 21. Ọnwa Moon 22. Eligwe Heaven 23. Anyasị Dark 24. Nye Give 25. Mmadụ Human being 26. Nṅomi To emulate 27. Agha War 28. Ọňụ Happiness 29. Akpa Bag 30. Nwere Have
73
Aj ụjụ Nchọcha Nke Atọ:
Kedu ka Olundị Nkanụ si emtụta ụmụakwụkwọ n’odide Igbo Izugbe?
Depụta mkpụrụokwu ndị a e dere na bekee n’Igbo Izugbe
Ọgụ Mkpụarụokwu Bekee Ndepụta n’Igbo Izugbe ỌDYNỌ ỌDYMỌ 1. Have 2. Bag 3. Happiness 4. War 5. To emulate 6. Human being 7. Give 8. Dark 9. Heaven 10. Moon 11. Garden- egg 12. Hand 13. Child 14. Horse 15. Drink 16. Forgive 17. Monkey 18. Oil-bin 19. Take 20. Sun 21. House 22. Gift 23. Stick 24. Head 25. Eye 26. Thing 27. Stomach 28. Who 29. Female 30. Male
Aj ụjụ Nchọcha Nke Anọ:
Olee ka mpaghara ebe ụlọakwụkwọ dị si emetụta ụmụakwụkwọ
n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe?
Aj ụjụ Nchọcha Nke Ise
Kedu ka jenda si emetụta ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ Igbo Izugbe?
74
Ụlọ akwụkwọ dị na mpaghara Ebe mepere Emepe:
1. GGS Awkunanaw 105 2. Union Sec. Sch Awkunanaw 70 3. Idaw River GSS Enugu 1 109 4. Idaw River GSS Enugu II 86 5. Army Day SS. Awkunanaw I 120 6. Army Day SS. Awkunanaw II 126 7. Uwani SS Enugu I 98 8. Uwani SS Enugu I 85 9. H.R.C Enugu 69 10. C.I. C Enugu 73 11. M/Land SS Enugu 112 12. C SS Obeagu Awkunanaw 112 13. C SS Ugwuaji 76 14. Compr. SS Akwuke 76 15. C S S Ndiagu Amechi 108 16. Model H.S Amechi Awkunanw 114 17. Chukwu Mem SS 44 18. G. G. S Uwanị 119 TOTAL 1702
75
Ụlọ akwụkwọ dị na mpaghara Ebe Emepeghị Emepe:
19. C SS Amagunze 122 20. C SS Nomeh 91 21. C S S Amafor Ugbawka 90 22. B SS Nara 94 23. Unaeze G S S Nara 102 24. C SS Isigwe Ugbawka 123 25. C S S Ihuokpara 104 26. C SS Nkerefi 95 27. C S S Uzam Idodo 99 28. C S S Ubahu 117 29. C S S Mburubu 93 30. Igwebuike C S S Imeoha 61 31. C GS S Enuogu Nkerefi 79 32. C S S Akpawfu 116 33. C S S Owo 98 34. Compr. SS Eziama Idodo 114 35. C S S Mbulu Owo 142 36. G S S Obe 108 37. O H S Ozalla 98 38. C S S Agbani 95 39. Akpugo SS Akpugo 111 40. C S S Obuofia Awkunanaw 81 41. C S S Umueze Awkunanaw 99 42. C S S Akapasha 104 43. G S S Akegbe Ugwu 86 44. C S S Amuri 80 45. Model SS Agbani 151 46. C S S Amodu Awkunanaw 105 TOTAL 2858 GRAND TOTAL 4560
Source: PPSMB Agbani Zonal Office. Nkanu West Local Government Area
Enugu State
76
SCHOOL OF POST-GRADUATE STUDIES
UNIVERSITY OF NIGERIA, NSUKKA
FACULTY OF EDUCATION,
DEPARTMENT OF ARTS EDUCATION
Effected corrections on my M.Ed thesis from external examiner
Name of student: Ugwu, Agatha Chinelo
Reg. No: PG/M.Ed/10/52671
Project Supervisor: Ọkammụta, Uju Umo Ọnụọgụ Peeji Ndejọ Ndezi
1. iv ndi ndị
2. v bia bịa
3. v kasi kasị
4. v ME.D M.Ed.
5. v agaghi agaghị
6. v bụgara bugara
7. v igbazi igbazị
8. v ihazi ihazị
9. v Onuzulike Ọnụzulike
10. vi ekele kwa Ekelekwa
11. vi na-agbamume na agbamume
12. vi ikwu na ibe ikwunaibe
13. ix Usor Nhazi/Ihe Nchọcha Usoro Nhazi Data
14. ix Mgbakwụnye Apendiiks
15. x Onye isi Onyeisi
16. x na akụzị na-akụzị
17. 1 ma ọ bụ maọbụ
77
18. 1 n'ihi niihi
19. 1 ọ bụla ọbụla
20. 1 asxsx asụsụ
21. 2 eji e ji
22. 3 Olundị olundị
23. 3 na-abụghị abụghị
24. 4 ‘L’, ‘r’, ‘n’, ‘f’, ‘h’ /l/, /r/, /n/, /f/, /h/
25. 4 otu etu
26. 5 aka ebe akaebe
27. 6 ahx ahụ
28. 6 o O
29. 7 d[ dị
30. 7 na nakwa
31. 7 ka ọ bụ maọbụ
32. 9 na kwa nakwa
33. 10 klasị klaasị
34. 10 edemede ederede
35. 11 enwere e nwere
36. 13 [ghọta ịghọta
37. 13 Okachasị ọkachasị
38. 14 zoonu zoon
39. 16 iti mkpu ibe maáa
40. 17 ọkọwa nkọwa
41. 18 otu ịkwalite asụsụ omenala Otu Ịkwalite Asụsụ Omenala
42. 19 Ndukwe (1991) referenced Not referenced
43. 19 na ma bụrụkwa nke
78
44. 19 Olund[ Olundị
45. 20 njiri mara njirimara
46. 20 Yoroba Yoruba
47. 20 ndịa ndị a
48. 21 na-ebuteghị ebuteghị
49. 24 isi okwu isiokwu
50. 24 aňaa aṅaa
51. 24 Ñụọ Ṅụọ
52. 24 anyinya anyịnya
53. 25 Kama kama
54. 26 hxkwa hụkwa
55. 27 katigori nkenụdị
56. 27 nwaanyi nwaanyị
57. 28 iňomi iṅomi
58. 28 nňomi nṅomi
59. 28 eňomi eṅomi
60. 29 site Site
61. 29 ha ụmụaka
62. 31 ma Ọzọ
63. 32 nwaanyiị nwaanyị
64. 32 Ọzọkwa Ọzọ kwa
65. 32 n'Enugwu Steeti na steeti Enugwu
66. 32 abụq abụọ
67. 32 nhiahụ nhiahụ
68. 32 nari narị
69. 34 Nwale Nnwale
79
70. 36 ndị ahụ nke
71. 38 Expost-Facto “Expost-Facto”
72. 39 di dị
73. 39 Qnxqgx xmxakwxkwq Ọnụọgụ ụmụakwụkwọ
74. 40 ga-esere seere
75. 40 ga-eji ji
76. 40 a ga-ejikwazi e jikwazi
77. 40 A ga-eserekwazị E serekwaziri
78. 40 a ga-eji ha ji
79. 40 a ga-esi ha si
80. 40 o kwesiri na a ga-enye ọ bụ ya mere e ji nye
81. 41 ga-ebu Bu
82. 41 a ga-enyekwa e nyekwara
83. 41 a ga-eji e ji
84. 41 inwta inweta
85. 42 Ọ bụ olile anya onye nchọcha na onye nchọcha ga-eke ụmụakwụkwọ
E kere ụmụakwụkwọ
86. 42 Ọ ga-enye O nyere
87. 42 ga-akpọpụta kpọpụtara
88. 42 ga-enyekwa nyekwara
89. 42 ga-ekekwa kere
90. 42 A tụrụ anya na nke a ga-ewe
Nke a were
91. 42 a ga-enweta e nwetara
92. 42 A ga-eji O ji
93. 42 ga-anabata nabatara
80
94. 42 agaghị anabata anabataghị
95. 43 a ga-akpọpụta e dere ede
96. 44 rizọlt rịzọlt
97. 44 Ọgụ Ọnụọgụ
98. 51 ndimiche ndịmiche
99. 56 ọgbọ Ogbo
100. 58 ga na gana
……………………………… ………………………………. Aha Onyenlekọ Aha Nwaakwụkwọ
……………………………… ……………………………….
Mbinyeaka Mbinyeaka
……………………………… ………………………………. Ụbọchị/Deeti Ụbọchị/Deeti